Exodus 25:31
““Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya.”
Exodus 25:31 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 31 of 40 in Exodus chapter 25 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
5 threads run through this chapter
Exodus 25 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Onyenwe anyị gwara sị, “Gwa ụmụ ka ha wetara m onyinye. Ị ga-anabatara m onyinye ahụ site nʼaka nwoke ọbụla onye o metụrụ nʼobi inye onyinye a. “Ndị a bụ ị ga-anata nʼaka ha: “ọlaọcha, ọlaedo na bronz. Ogho na-acha anụnụ anụnụ, nke odo odo, nke uhie uhie, nke ezi akwa ọcha, na nke ajị ewu; akpụkpọ anụ ebule e sijiri uhie uhie, akpụkpọ ehi mmiri, na osisi akashia; mmanụ oliv nke a ga-etinye nʼiheọkụ, ụda isi ụtọ a na-etinye na mmanụ nsọ, na ụda na-eme ka aja nsure ọkụ na-esi isi ụtọ; nkume ọma ọniks, na nkume ndị ọzọ a na-ahịọnye nʼefọọd, na nke a na-ahịọnyekwa nʼihe mgbochi obi. “Mee ka ha wuoro m ebe nsọ. Mụ onwe m ga-ebikwa nʼetiti ha. Wuo ụlọ nzute a na ihe ịchọ ya mma niile, ka ọ bụrụ otu ihe dịka oyiyi m ga-egosi gị. “Ha ga-eji osisi akashia wuo igbe ọgbụgba ndụ nke ịdị ogologo ya ga-abụ otu mita na sentimita iri. Obosara ya bụ sentimita iri isii na asatọ. Ịla elu ya ga-abụkwa sentimita iri isii na asatọ. Machie ọlaedo a nụchara anụcha nʼime na azụ ya niile, jiri ọlaedo kpụọ ihe gburugburu akụkụ ya niile. Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka ya, kwụnye ha nʼụkwụ anọ ya, ya bụ mgbaaka abụọ nʼotu akụkụ, mgbaaka abụọ nʼakụkụ nke ọzọ ya Jirikwa osisi akashia mee mkpara ogologo. Emesịa, were ọlaedo machie mkpara ndị a. Ị ga-etinye mkpara ndị ahụ nʼime mgbaaka ahụ dị nʼakụkụ igbe ahụ, ka ọ bụrụ ihe iji na-ebu ya. Nʼihi nke a, mkpara ọlaedo ndị ahụ ga-adịgide nʼime mgbaaka ọlaedo igbe a oge niile. Ya mere, mgbe a rụsịrị igbe ọgbụgba ndụ ahụ, tinye ahụ m nyere gị nʼime ya. “Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ogologo ya ga-adị nzọ ụkwụ anọ. Obosara ya ga-abụ nzọ ụkwụ abụọ na ọkara. Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ. ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ. Nʼebe ahụ, nʼetiti abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị . “Jiri osisi akashia mee tebul nke ogologo ya ga-adị iri sentimita itoolu. Obosara ya ga-abụ iri sentimita anọ na ise. Ịla elu ya ga-abụ iri sentimita isii na asaa. Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha machie ya nke ọma, jirikwa ọlaedo kpụọ ọnụ ọnụ ya gburugburu. Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu. Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya. Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ. Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha. Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye. Dọkwasị achịcha nke iche nʼ nʼelu tebul ahụ, nʼihu m, oge niile. “Jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna. Kpụọ ụkwụ ala ala ya, na alaka ya, mee ka iko ya niile yiri okoko osisi, na isi ya niile, na ifuru ya niile bụrụ otu ya na ahụ ya. Alaka isii ga-esite nʼakụkụ abụọ nke ihe ịdọkwasị oriọna ahụ wapụta, alaka atọ nʼotu akụkụ ya, alaka atọ nʼakụkụ nke ọzọ. Iko atọ e mere dịka okoko osisi alụmọnd ya na ifuru, ya na okoko ya niile ga-adị nʼotu alaka, iko atọ nʼalaka nke ọzọ, otu a ka ọ ga-adị nʼalaka isii niile ahụ na-awapụta site nʼihe ịdọkwasị oriọna ahụ. Nʼelu ihe ịdọba oriọna ahụ, ọ ga-adị iko anọ dịka ifuru osisi alụmọnd, ya na ebe o si awapụta na okoko ya. Otu isi ga-adịkwa nʼokpuru alaka abụọ si nʼetiti ihe ịdọba oriọna ahụ pụta. Isi nke abụọ ga-adị nʼokpuru alaka abụọ nke ọzọ. Isi nke atọ ga-adị nʼokpuru alaka nke atọ, ya bụ ha niile alaka isii. Isi nwapụta ya na alaka ya niile ga-adịkọtakwa ọnụ, ha na ihe ịdọkwasị oriọna ahụ, nke e ji ọlaedo a nụchara anụcha rụọ. “Ị ga-eme oriọna asaa, dọba ha nʼelu ihe ịdọkwasị iheọkụ ahụ, ka ha na-enye ìhè naanị nʼebe ihu ya. Mkpa ya na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile, ga-abụ ọlaedo a nụchara anụcha. Ọlaedo a nụchara anụcha nke dị iri kilogram atọ na anọ ka a ga-eji kpụọ ihe ịdọkwasị oriọna ahụ na ngwongwo ndị a niile. Lezie anya hụ na i mere ihe ndị a niile nʼusoro ihe atụ nke e gosiri gị nʼelu ugwu.
Every verse in Exodus 25
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.