Exodus 33:3

“Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.””

Exodus 33:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 23 in Exodus chapter 33 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Exodus 33 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Duru ndị a i si nʼala kpọpụta baa nʼala ahụ m kwere , na Aịzik na ọb na nkwa, nʼihi na agwara m ha sị, ‘Aga m enye ụmụ ụmụ unu ala a, ka ọ bụrụ ihe nketa ha.’ Aga m ezipu Mmụọ ozi m ka ọ gaa nʼihu unu chụpụrụ unu ndị , na ndị Amọrait, na ndị , na ndị , na ndị , na ndị . Gbago nʼala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, ma agaghị m eso unu nʼije unu, nʼihi na unu bụ ndị isiike. Ọ bụrụ na m esoro unu, unu ga-anwa m ọnwụnwa, nke ga-eme ka m laa unu nʼiyi nʼụzọ.” Mgbe ndị mmadụ ahụ nụrụ okwu olu ike ndị a, ha malitere iru ụjụ, ọ dịghịkwa onye ọbụla yinyere ihe ịchọ mma ya nʼahụ ha. Nʼihi na anyị agwala sị, “Gwa ụmụ , ‘Unu bụ ndị isiike. A sị na m nọ nʼetiti unu, otu ntabi anya ezuorola m ịla unu nʼiyi. Ugbu a, yipụnụ ihe ịchọ mma niile unu yi nʼahụ, aga m ekpebi ihe m ga-eme unu.’ ” Ya mere, ndị yipụrụ ihe ịchọ mma ha niile. Nʼugwu ka ha nọ mgbe ihe ndị a mere. Nʼoge a, Mosis na-ewere ụlọ ikwu manye nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu, ọ na-akpọ ya ụlọ nzute. Ọ na-amanye ya nʼebe dị anya site nʼebe ụmụ mara ụlọ ikwu ha. Onye ọ bụla nke chọrọ ịjụta anyị ase, na-apụ, gaa nʼụlọ nzute ahụ nke dị nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu. Mgbe ọbụla na-aga nʼụlọ ikwu nzute ahụ, ndị niile na-apụta guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ha, na-ele ya anya tutu abanye nʼụlọ ikwu ahụ. Mgbe ọ banyere nʼụlọ ikwu ahụ; ogidi igwe ojii ahụ na-abịa guzochie nʼọnụ ụzọ mgbe anyị na na-akparị ụka. Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala. Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ , nwa , na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. Mgbe na anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ. Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.” Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.” Mgbe ahụ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị gaghị eso anyị nʼije a, ekwela ka anyị si nʼebe a zọpụ ụkwụ. Ọ bụrụ na i soghị anyị, olee otu a ga-esi mata na mụ onwe m, na ndị gị achọtala ihuọma gị? Olee otu ọ ga-esi pụta ìhè na mụ na ndị gị bụ mba dị iche site na mba ndị ọzọ dị nʼụwa?” Ma anyị zara sị, “E, aga m eme ihe ị rịọrọ m, nʼihi na ị chọtala ihuọma m. Nʼezie, amara m onye ị bụ, marakwa aha gị.” Mgbe ahụ, Mosis rịọrọ sị, “Gosi m ebube gị.” Ma anyị zara sị, “Aga m eme ka ị hụ ịdị mma m, aga m akọwakwara gị ihe aha m bụ anyị pụtara. Onye m chọrọ imere ebere ka m ga-emere ebere, ọ bụkwa onye m chọrọ imere ọmịiko ka m ga-enwere ọmịiko. Ma ị pụghị ịhụ ihu m nʼihi na mmadụ ọbụla enweghị ike ịhụ ihu m ma dịrịkwa ndụ.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị, “Lee, e nwere ebe dị nso nʼakụkụ m, nʼelu nkume, ebe i nwere ike iguzo. Mgbe ebube m ga-agafe, aga m ezo gị nʼokpuru nkume, werekwa aka m kpuchie gị, tutu ruo mgbe m gafechara. Emesịa, aga m eweli aka m, ka i nwee ike ịhụ azụ m anya, ma ị pụghị ịhụ ihu m.”

Every verse in Exodus 33

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00