Ezekiel 2:4

“Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu.’”

Ezekiel 2:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 4 of 10 in Ezekiel chapter 2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Ezekiel 2 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, bilie ọtọ, guzo nʼụkwụ gị abụọ, nʼihi na ana m aga ịgwa gị okwu.” Mmụọ ahụ banyere nʼime m mgbe ahụ ọ na-ekwu okwu, mee ka m guzo ọtọ nʼụkwụ m abụọ. Anụrụ m ka ọ gwara m okwu. Ọ sịrị m, “Nwa nke mmadụ, ana m eziga gị ka i jekwuru ndị , ndị bụ mba na-enupu isi, ndị nupuru isi megide m. Ha na nna nna ha enupula isi megide m, ruo ọ bụladị nʼụbọchị taa. Ndị ahụ m na-eziga gị ka i jekwuru bụ ndị isiike na ndị nnupu isi. Sị ha, ‘Ihe ndị a ka kachasị ihe niile elu, bụ anyị na-ekwu.’ Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha. Ma gị nwa nke mmadụ, atụla ha egwu. Ka ụjọ okwu si ha nʼọnụ ghara ịtụkwa gị. Atụla egwu, ọ bụladị ma a sị na ogwu na uke gbara gị gburugburu, ọ bụladị ma a sị na i bi nʼetiti ụmụ akpị. Ka ụjọ ghara ịtụ gị nʼihi okwu ọnụ ha, ekwekwala ka ha menye gị egwu, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. Ị ghaghị izi ha ozi m ziri gị zie ha, ma ha gere ntị ma ha egeghị ntị, nʼihi na ha bụ ndị na-enupu isi. Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.” Otu mgbe ahụ, elere m anya hụ aka e setịpụrụ, nke ji akwụkwọ a fụkọrọ afụkọ, nke e dekwara ihe nʼime ya, ihu na azụ ya. Aka ahụ ji ya gbasapụrụ ya mee ka m hụ ihe e dere nʼime ya. Ọ bụ okwu ịkwa akwa na iru ụjụ na ahụhụ.

Every verse in Ezekiel 2

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00