Ezekiel 48:32
“Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama Josef, ọnụ ụzọ ama Benjamin, na ọnụ ụzọ ama Dan.”
Ezekiel 48:32 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 32 of 35 in Ezekiel chapter 48 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Ezekiel 48 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
“Nke a bụ aha ebo niile, na ala ha ga-eketa: “ otu oke. Site na nsọtụ ugwu, nʼakụkụ ụzọ ruo mbata . Haza na oke ala ugwu ọs, nke dị nʼakụkụ ga-abụ akụkụ oke ala ha site nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Asha ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala , site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Naftalị ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala , site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Manase nwere otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala ị, site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Ifrem ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala , site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Ruben ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala , site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Juda ga-enwe otu oke. Ọ ga-abụ nʼakụkụ oke ala , site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. “Ala nke ya na oke ala ndị ga-agbatị site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ, ka ị ga-enye dịka onyinye pụrụ iche. Obosara ya ga-abụ ihe dị kilomita iri na atọ. Ogologo ya site nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ ga-aha ka ala otu ebo ketara. Ụlọnsọ ukwu ahụ ga-adịkwa nʼetiti ya. “Ogologo ebe a ewepụtara iche nye anyị ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita ise na ọkara. Nke a ga-abụ ala dị nsọ e debere iche nye ndị nchụaja. Nʼakụkụ ugwu, ịdị ogologo ala ahụ ga-abụ kilomita iri na atọ. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ, ogologo ya bụ kilomita ise na ọkara. Ogologo nke akụkụ ndịda na nke ugwu bụ otu. Otu a kwa, ogologo nke akụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ bụ otu. Ebe nsọ anyị ga-adị nʼetiti ya. Ọ ga-adịrị ndị nchụaja, bụ ụmụ ọk ndị e doro nsọ, ndị sitere nʼikwesị ntụkwasị obi jeere m ozi, ndị na-esiteghị nʼiso ụzọ m kpafuo dịka ndị na agbụrụ ị mere mgbe ha mehiere. Ọ bụ onyinye pụrụ iche a na-enye ha site nʼala ahụ dị nsọ, bụ ala ahụ kachasị nsọ, nke ya na ala ndị ị nwekọrọ oke ala. “Nʼakụkụ ala ndị nchụaja, a ga-ekenye ndị ị ala nke ha. Ha ga-eketa ala nke ogologo ya bụ kilomita iri na atọ, nke obosara ya bụ kilomita ise na ọkara. O nweghị akụkụ ala nsọ a a ga-ere ere, maọbụ nye ya ndị ọzọ, nʼihi na ihe dị nsọ ka ọ bụ nye anyị. “Ala nke fọdụrụ, nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dị kilomita ise na ọkara ga-abụ ala ọha. A ga-ewu ebe obibi nʼelu ya, wukwaa ebe ịzụ anụ ụlọ. Obodo ga-adị nʼetiti ya, nke ogologo akụkụ ugwu ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ndịda ruru kilomita abụọ na ụma anọ, akụkụ ọwụwa anyanwụ ruru kilomita abụọ na ụma anọ, na akụkụ ọdịda anyanwụ rukwara kilomita abụọ na ụma. Ogologo nke ala ebe ịta nri nke ga-agba obodo ahụ gburugburu ga-aha nʼotu. Ọ ga-adị narị mita na iri mita atọ na ise nʼugwu, na ndịda narị mita na iri mita atọ na ise, nʼọwụwa anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise, nʼakụkụ nʼọdịda anyanwụ narị mita na iri mita atọ na ise. Ma nke ga-afọdụ na ya, nʼakụkụ oke ala ahụ dị nsọ nke gara ogologo ya niile, ga-abụ nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ kilomita ise na ọkara nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ga-abụkwa kilomita ise na ọkara. Ihe omume ya ga-abụ nri nye ndị ọrụ nke obodo ahụ. Ndị ọrụ si nʼobodo, bụ ndị na-akọ ya ga-abụkwa ndị sị nʼebo niile nke . Ala ahụ niile, ma ala ahụ e doro nsọ, ma ala ndị obodo, ga-adị kilomita iri na atọ nʼakụkụ ya ọbụla. “Ala niile fọdụrụ nʼakụkụ abụọ nke ala ahụ dị nsọ, na ala ndị obodo ga-abụ nke nwa eze. Ọ ga-agbatị ruo ọwụwa anyanwụ site nʼọtụtụ kilomita iri na atọ nke oke ahụ dọ nsọ ruo nʼoke ala ọwụwa anyanwụ, sitekwa na kilomita iri na atọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ruo oke ala ọdịda anyanwụ. Akụkụ abụọ ndị a nke gbatịrị ruo nʼoke ala ndị obodo ga-abụ nke onye ọchịchị, ebe nsọ ahụ na ụlọ ukwu ahụ ga-adị nʼetiti ha. Ya mere, oke ala nke ndị ị na ala ndị obodo ga-adị nʼetiti ala nke nwa eze nwee. Oke ala nke nwa eze ahụ ga-adị nʼetiti oke ala na oke ala . “Ala e nyere ebo fọdụrụ dị otu a: “ ga-enwe otu oke, nke sitere nʼọwụwa anyanwụ ruo nʼọdịda anyanwụ. Simiọn ga-enwe otu oke; ha na ndị ga-enwekọ otu oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Isaka ga-enwe otu oke; ha na ndị ọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Zebụlọn ga-enwe otu oke; ha na ndị ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. ga-enwe otu oke; ha na ndị ụlọn ga-enwekọ oke ala nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na nʼakụkụ ọdịda anyanwụ. Ma oke ala nke chere ihu nʼakụkụ ndịda ga-esi na ruo nʼiyi , sorokwa ọdọ mmiri ruo nʼosimiri ịa. “Nke a bụ ala unu ga-ekenye ebo niile dịka oke ha. Ha ga-abụkwara ha ihe nketa.” a ka kachasị ihe niile elu, bụ anyị kwubiri ya. “Ndị a ga-abụ ọnụ ụzọ ama e si apụ nʼobodo ahụ. “Nʼakụkụ nke ugwu, nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama obodo ahụ ga-abụ aha ebo niile nke . Ọnụ ụzọ ama atọ nʼakụkụ ugwu ga-abụ ọnụ ụzọ ama , ọnụ ụzọ ama , na ọnụ ụzọ ama ị. Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, nke mgbidi ya dị kilomita abụọ nʼogologo, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya. Ha ga-aza ọnụ ụzọ ama , ọnụ ụzọ ama , na ọnụ ụzọ ama . Nʼakụkụ ndịda, nke ogologo ya bụkwa kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama ọn, ọnụ ụzọ ama , na ọnụ ụzọ ama ụlọn. Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ịdị ogologo mgbidi ya bụ kilomita abụọ, ọnụ ụzọ ama atọ ga-adị ya: ọnụ ụzọ ama , ọnụ ụzọ ama , na ọnụ ụzọ ama ị. “Gburugburu obodo ahụ bụ kilomita iri. “Aha a ga-akpọ obodo ahụ site nʼoge ahụ gawa, ga-abụ, ‘Onyenwe anyị nọ nʼebe ahụ.’ ”
Every verse in Ezekiel 48
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.