Ezra 8:6

“Ndị ikwu Adin, Ebed nwa Jonatan na iri mmadụ ise (50) so ya.”

Ezra 8:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 6 of 36 in Ezra chapter 8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Ezra 8 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị a bụ usoro ọmụmụ ndịisi ezinaụlọ ahụ niile sooro m site na ọn laghachi mgbe bụ eze: ndị ikwu , Geshọm; ndị ikwu , ; ndị ikwu , Hatush ndị ikwu ; ndị ikwu , Zekaraya na narị mmadụ na iri ise (150) ndị so ya denye aha ha nʼakwụkwọ. Ndị ikwu -, Eliehoenai nwa dị narị mmadụ abụọ (200), ndị ikwu , Shekanaya nwa na narị mmadụ atọ (300) so ya. Ndị ikwu , Ebed nwa na iri mmadụ ise (50) so ya. Ndị sitere nʼikwu , Jeshaya nwa , na iri ndị ikom asaa (70), ndị sitere nʼikwu , Zebadaya nwa , na iri ndị ikom asatọ (80). Ndị sitere nʼikwu , Ọbadaya nwa na narị ndị ikom abụọ na iri na asatọ (218), ndị sitere nʼikwu , Shelomit nwa na narị ndị ikom na iri isii (160). Ndị sitere nʼikwu ; Zekaraya nwa na ndị ikom iri abụọ na asatọ (28), ndị sitere nʼikwu , Johanan nwa na narị ndị ikom na iri (110). Ndị sitere nʼikwu , ndị ikpeazụ, ndị aha ha bụ , na na na iri ndị ikom isii (60) bụ ndị so ha, ndị sitere nʼikwu , Utai na na iri ndị ikom asaa (70) bụ ndị so ha. Akpọkọtara m ha nʼakụkụ osimiri na-erubanye nʼ, anyị nọrọ nʼebe ahụ ụbọchị atọ. Mgbe m leruru anya nʼetiti ndị mmadụ zukọrọnụ, ha na ndị nchụaja bịara, a chọpụtara m na o nweghị ọ bụladị otu onye ị nọ nʼebe ahụ. Mgbe ahụ, ezigara m ozi kpọọ , Ariel, Shemaya, Elnatan, Jarib, Elnatan, Netan, Zekaraya na , ndị bụ ndịisi. Ezikwara m ozi kpọọ na , bụ ndị maara ihe. Enyere m ha iwu ka ha gakwuru , onyendu nọ na . Agwara m ha ihe ha ga-agwa na ndị ị ibe ya, bụ ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ dị na , ka ha zite ndị ga-eje ozi ka ha bịakwute anyị maka ụlọnsọ . Chineke gosikwara anyị obiọma zitere anyị nwoke a na-akpọ na ụmụ ya, na ụmụnne ya, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri na asatọ (18). Sherebaya bụ nwa , nwa ị nwa , bụrụkwa nwoke nwere ezi uche. Chineke sitere nʼikwu zite , na , tinyere ụmụnne ya na ụmụ ha ndị ikom, ndị ọnụọgụgụ ha dị iri ndị ikom abụọ (20). Ha zitekwara narị abụọ na iri abụọ (220) site na ndị na-eje ozi nʼụlọnsọ. Otu nke na ndịisi ya họpụtara hiwee, maka inyere ndị ị aka. E deturu aha ha niile nʼotu nʼotu. Nʼebe ahụ, ka m nọ kpọsaa obubu ọnụ nʼakụkụ osimiri , nʼihi iweda onwe anyị ala nʼihu anyị, na ịrịọ ya ka o duo anyị, ụmụ anyị na akụ anyị niile, nʼụzọ ziri ezi nʼije anyị, ma nọnyekwara anyị. Nʼihi na ihere ekweghị m rịọ eze ka o dunyere anyị ndị agha, na ndị na-agba ịnyịnya ga-edu anyị, ichebe anyị nʼụzọ, site nʼaka ndị iro. Nʼihi na anyị agwalarị eze na , onye anyị na-efe, na-echebe ndị niile na-efe ya; gwakwa ya na oke iwe ya na-adakwasị ndị niile gbakụtara ya azụ. Ya mere, anyị buru ọnụ, kpee ekpere, rịọ ka o chebe anyị. O chebekwara anyị. Ahọpụtara m ndị nchụaja iri na abụọ ndị a: Sherebaya, Hashabaya na mmadụ iri ndị ọzọ bụ ụmụnna ha ka ha hụ maka ọlaọcha, na ọlaedo, na efere ọlaedo ahụ, na ihe ndị ọzọ ahụ eze na ndị na-adụ ya ọdụ, na ndịisi ọchịchị ya, na ụmụ niile nyere maka ụlọnsọ ukwu anyị. Eji m ihe ọtụtụ tụọ onyinye ọlaọcha na ọlaedo na ihe ndị ọzọ eze, na ndị ndụmọdụ ya, na ndịisi ozi ya, na ndị nyere maka ụlọnsọ ukwu . E jiri m ihe ọtụtụ tụnye ha ọlaọcha dị narị talenti isii na iri ise (ya bụ 650), na ngwongwo ọlaọcha dị otu narị talenti (ya bụ 100), na ọlaedo dị otu narị talenti (ya bụ 100). Iri efere ọlaedo abụọ (20) nke ọnụahịa ya bụ puku darik (1,000), tinyere efere bronz abụọ e hichaziri nke ọma, nke dị oke ọnụahịa dị ka efere ọlaedo. Emesịa, agwara m ha okwu sị ha, “Lee, unu onwe unu na ihe ndị a niile bụ ihe dị nsọ nye anyị. Ọlaọcha na ọlaedo ndị a bụkwa onyinye afọ ofufu e nyere anyị nna nna unu ha. Chenụ ha nche, debekwa ha nke ọma, tupu ruo mgbe unu ga-atụ ha nʼihu ndịisi nchụaja, na ndịisi ị, na ndịisi ụlọ nke nʼime , nʼime ụlọakụ nke ụlọ anyị.” Ya mere, ndị nchụaja na ndị ị kwenyere ibu ọlaọcha na ọlaedo, na ngwongwo ihe nsọ ndị ahụ, buga ha nʼụlọnsọ ukwu dị na . Anyị hapụrụ osimiri nʼụbọchị nke iri na abụọ nke ọnwa mbụ, chee ihu anyị ịga . Chineke nọnyekwaara anyị, dọpụta anyị site nʼaka ndị iro ọbụla, na nʼaka ndị ohi. Nʼikpeazụ, anyị rutere nʼudo, zukwaa ike ụbọchị atọ. Nʼụbọchị nke anọ, site nʼoge anyị ruru, e jiri ihe ọtụtụ tụọkwa ọlaọcha na ọlaedo ahụ, ha na ngwongwo ihe nsọ ndị ọzọ ahụ. E mere nke a nʼụlọnsọ ukwu . Ndị tụrụ ha bụ nwa Ụraya onye nchụaja, na nwa . Jozabad nwa , na nwa , ndị ị, sokwa tụọ ha. Ihe niile zuru ezu dịka ịdị arọ ha si dị. E dekwara ọnụọgụgụ ihe a tụpụtara nʼakwụkwọ nʼoge ahụ. Emesịa, onye ọbụla nʼime anyị si esi lọta chụụrụ aja nsure ọkụ. E ji oke ehi iri na abụọ chụọ aja maka ebo niile, ya na iri ebule itoolu na isii, na iri ụmụ ebule asaa na asaa. Ma e ji mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie. E jichakwa ha niile chụọ aja nsure ọkụ nye anyị. E nyere ndịisi ọrụ eze niile, na ndịisi ọchịchị niile dị nʼofe ọdịda anyanwụ osimiri akwụkwọ iwu ahụ eze nyere. Ndịisi a nyekwara aka nʼọrụ iwughachi ụlọnsọ ahụ.

Every verse in Ezra 8

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00