Galatians 3:10
“Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.””
Galatians 3:10 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 10 of 29 in Galatians chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Galatians 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị ịa! Onye napụrụ unu akọnuche unu? Nʼihu unu ka a nọ kọwaa nʼụzọ doro anya mkpọgide nʼobe a kpọgidere ọs ịst. Ọ bụ naanị otu ihe ka m chọrọ ịmata nʼaka unu. Unu natara Mmụọ Nsọ site nʼịrụ ọrụ iwu chọrọ, ka ọ bụ site na nkuzi nke okwukwe? Ọ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Unu malitere site nʼike Mmụọ Nsọ, ma ugbu a unu na-akwụsịzi nʼike nke anụ ahụ? Unu tara ọtụtụ ahụhụ dị otu a nʼefu, ọ bụrụ nʼezie na ọ bụ nʼefu? Mmụọ nsọ ahụ nyere unu na ọrụ ebube ọ rụrụ nʼetiti unu, o mere ha nʼihi iwu unu debere, ka ọ bụ nʼihi na unu nụrụ ma kwerekwa oziọma? Nʼotu ụzọ ahụ, Ebraham kweere na , a gụrụ nke a nye ya dị ka ezi omume. Matanụ nke a, na ọ bụ ndị nwere okwukwe bụ ụmụ . Dị ka ọ dị nʼụkwọ nsọ, nʼoge ahụ dị nʼihu, nke bụ ugbu a, Chineke ga-agụ ndị mba ọzọ dị ka ndị ezi omume, site nʼokwukwe ha nwere nʼime ya. Nʼihi nke a, o buru ụzọ zie oziọma ahụ nʼoge gara aga sị, “A ga-agọzikwa agbụrụ niile nọ nʼụwa site na gị.” Ya mere, ndị dabeere nʼokwukwe bụkwa ndị na-eso , nwoke okwukwe ahụ eketa ngọzị. Ma ndị niile na-ele anya na a ga-azọpụta ha nʼihi na ha debere iwu niile, ka ọbụbụ ọnụ na-adakwasị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla na-edebeghị ọ bụladị otu nʼime iwu niile e dere nʼakwụkwọ iwu.” Ugbu a, ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọbụla a na-agụ nʼonye ezi omume nʼihu , nʼihi na o debere iwu. Nʼihi na, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.” Ma iwu ahụ adabereghị nʼokwukwe, kama, iwu kwuru sị, “Mmadụ ahụ na-eme ihe iwu kwuru bụ onye ga-enwe ndụ site na ha.” Ma ịst agbapụtala anyị site nʼọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. Ọ ghọrọ ọbụbụ ọnụ nʼihi anyị. Nʼihi na e deela ya nʼakwụkwọ nsọ, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a kwụbara nʼelu osisi.” Ọ dị otu a ka ngọzị ahụ e nyere bụrụkwa nke ndị mba ọzọ site na ịst ọs. Ka anyị niile site nʼokwukwe nata nkwa ahụ, bụ Mmụọ Nsọ. Ụmụnna m, ka m were ihe nlere anya site na ndụ a na-adị kwa ụbọchị kọwaa okwu a: Dị ka mmadụ na-enweghị ike iwepụ maọbụ ịtụkwasị ihe nʼọgbụgba ndụ e mere ka o guzosie ike, otu a ka ọ dịkwa nʼọnọdụ a. Ọ bụ ka e kwere nkwa ya na mkpụrụ ya. Akwụkwọ nsọ asịghị, “nʼọtụtụ mkpụrụ,” kama, ọ sịrị, “ma nye mkpụrụ gị,” ya bụ otu onye, onye bụ ịst. Ihe m na-akọwa bụ nke a: Iwu ahụ e mere ka ọ malite ịdị narị afọ anọ na iri atọ (430) site na mgbe e kwere nkwa ahụ, emeghị ka ọgbụgba ndụ ahụ mere ka ọ dịrị hapụ iguzokwa, o mekwaghị ka nkwa ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. Ọ bụrụ na inweta ihe nketa nke ya na nkwa ahụ so dabeere nʼiwu, mgbe ahụ, ihe nketa ahụ adabereghị na nkwa e kwere. Ma sitere nʼamara nye ihe nketa ahụ site na nkwa o kwere ya. Gịnị mere e ji nye iwu? E nyere iwu ndị a nʼihi njehie, mee ka iwu ndị a dịgide tutu ruo mgbe mkpụrụ ahụ bịara, bụ onye e kwere na nkwa. E sitere nʼaka onye ogbugbo mee ka ndị mmụọ ozi mee ka iwu ahụ dị ire. Onye ogbugbo gosiri ihe karịrị otu onye, ma bụ otu. Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke ? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu. Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime ọs ịst. Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe ịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ. Unu niile bụ ụmụ site nʼokwukwe nʼime ịst ọs. Nʼihi na ka unu niile ha, bụ ndị e mere baptizim nʼime ịst, abụrụla ndị yikwasịrị onwe ha ịst. E nwekwaghị onye , maọbụ onye , maọbụ ohu maọbụ onye nwe onwe ya; nwoke maọbụ nwanyị, nʼihi na unu niile bụ otu nʼime ịst ọs. Ọ bụrụ na unu bụ ndị nke ịst, mgbe ahụ unu bụkwa mkpụrụ , ndị nketa dị ka nkwa ahụ si dị.
Every verse in Galatians 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.