Genesis 21:18
“Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.””
Genesis 21:18 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 18 of 34 in Genesis chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Genesis 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Onyenwe anyị jiri amara leta dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere ihe o kwere na nkwa. Sera tụụrụ ime, mụọra nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka kwere ya na nkwa. Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka si nye ya nʼiwu. Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke. Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” O kwukwara sị, “Onye gaara agwa sị ya na ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.” Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara. Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri. Ma mgbe hụrụ na nwa nwoke ahụ onye mụtaara nọ na-akwa emo, ọ gwara okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.” Okwu a wutere nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke na-emetụ ya nʼobi. Ma gwara sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha. Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.” Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha . O bukwasịrị ha nʼubu , zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba. Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa. Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa. Ma nụrụ ịkwa akwa nwantakịrị nwoke ahụ. Mmụọ ozi sikwa na mbara eluigwe kpọọ oku sị ya, “Hega, gịnị na-eme gị? Atụla egwu, nʼihi na anụla olu akwa nwantakịrị ahụ nʼebe ahụ o dina. Gaa kulite nwantakịrị ahụ kasịe ya obi, nʼihi na aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.” Mgbe ahụ, Chineke meghere anya ya, mee ka ọ hụ olulu mmiri dị nʼebe ahụ. Ọ gara kujuo karama akpụkpọ ahụ mmiri, ma nye nwantakịrị ahụ mmiri ka ọ ṅụọ. Chineke nọnyeere nwantakịrị ahụ mgbe ọ na-eto. O biri nʼọzara ahụ ghọọ onye na-agba àkụ nke ọma. Mgbe o bi nʼọzara , nne ya chọtaara ya nwunye site nʼ. Nʼoge a, Abimelek na ọl onyeisi ndị agha ya, bịakwutere sị ya, “Chineke nọnyeere gị nʼihe niile ị na-eme. Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.” Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.” Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere ozi. Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.” Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye . Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta. Mgbe sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche, Abimelek jụrụ sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?” Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.” Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi. Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na ọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị . Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha anyị, Chineke ebighị ebi. Ebraham bigidere nʼala ndị ogologo oge.
Every verse in Genesis 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.