Genesis 23:17
“Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,”
Genesis 23:17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 17 of 20 in Genesis chapter 23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Genesis 23 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Sera dị ndụ ruo narị afọ na iri afọ abụọ na asaa. Ọ nwụrụ na (nke bụ ọn), nʼala . Ebraham ruru ụjụ nʼihi , kwaa akwa nke ukwuu nʼihi ọnwụ ya. Ebraham sitere nʼebe ozu nwunye ya dị pụọ, jekwuru ụmụ gwa ha sị, “Abụ m ọbịa na onye obodo ọzọ nʼetiti unu. Resinụ m ala m ji eme ebe olili nʼebe a, ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ.” Ụmụ zara sị, “Nna anyị ukwu, gee anyị ntị. Nwa eze dị ukwu ka ị bụ nʼetiti anyị, lie onye gị nwụrụ anwụ nʼili ahụ nke kachasị mma nʼime ili anyị nwere. O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ajụ inye gị ala olili ya maka ili onye gị nwụrụ anwụ.” Mgbe ahụ, Ebraham biliri kpọọ isiala nʼihu ndị nwe ala, bụ ndị , sị ha, “Ọ bụrụ ọchịchọ unu ka m lie onye m nwụrụ anwụ, geenụ m ntị ma rịọrọ m ọn nwa , ka o resi m ọgba , nke bụ nke ya, nke dị na ngwụsị ọhịa ya. Gwa ya ka o resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru ka ọ bụrụ ebe olili m nwere nʼetiti unu.” Efrọn onye nʼonwe ya so nọdụ nʼebe ahụ nʼetiti ndị ya. Ọ zara nʼihu ndị niile bịara nʼọnụ ụzọ ama obodo sị ya, “Mba! Nna m ukwu, gee m ntị. Ana m enye gị ala ahụ na ọgba dị nʼime ya nʼihu ndị a niile bụ ndị m. Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.” Ọzọ kpọrọ isiala nye ndị nwe ala, ọ sịrị ọn, nʼihu ha niile, “Biko gee m ntị, aga m akwụ gị ọnụahịa iji zụọ ala ahụ. Nara m ya ka m nwee ike lie onye m nwụrụ anwụ nʼime ya.” Efrọn zara , “Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.” Ebraham kwenyere nʼego ole ọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara ọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị niile, narị ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa. Site nʼoge ahụ, ala ahụ ọn nwere na , nke dị nso na , ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu, ghọrọ nke dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ , nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ. Emesịa, Ebraham liri nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na na nso (nke dị na ọn) nʼala ndị . Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị resiri ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na- ozu.
Every verse in Genesis 23
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.