Genesis 38:7

“Ma nʼihi na Ịa, ọkpara Juda, dị njọ nʼanya Onyenwe anyị. Onyenwe anyị gburu ya.”

Genesis 38:7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 7 of 30 in Genesis chapter 38 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Genesis 38 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼoge ahụ, Juda hapụrụ ụmụnne ya gaa binyere otu nwoke onye a na-akpọ . Nʼebe ahụ, Juda hụrụ otu nwaagbọghọ, nwa otu nwoke onye , aha ya bụ . Ọ lụrụ ya ma bakwuru ya. Ọ tụụrụ ime mụọ nwa nwoke, onye gụrụ aha Ịa Nwunye ya dịkwara ime ọzọ mụta nwa nwoke nke ya bụ nwunye ya gụrụ . Ọ mụkwara nwa nwoke ọzọ, onye ọ kpọrọ . Ọ bụ na ka ọ mụrụ ya. Juda lụtaara Ịa, ọkpara ya, nwunye onye aha ya bụ . Ma nʼihi na Ịa, ọkpara , dị njọ nʼanya anyị. Onyenwe anyị gburu ya. Mgbe ahụ, Juda sịrị , “Bakwuru nwunye nwanne gị ka ịkuchie ya, ka i si otu a wulite mkpụrụ maka nwanne gị.” Onan ma na mkpụrụ a agaghị abụ nke ya. Nʼihi ya, mgbe ọbụla ọ bakwuru nwunye nwanne ya, ọ na-anyụsa mkpụrụ nwa ya nʼala, ime ka ọ ghara inye nwanne ya nwoke nwa. Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya anyị. Nʼihi ya anyị gbukwara ya. Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ , “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” lara gaa biri nʼụlọ nna ya. Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye nwa nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere , ya na enyi ya , onye , ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị. A gwara sị ya, “Nna di gị na-aga ịkpacha atụrụ ya ajị.” O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama , nke dị nʼụzọ e si aga . O mere otu a nʼihi na ọ matara na etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya. Mgbe hụrụ ya, o chere na ọ bụ otu nwanyị akwụna, ebe ọ bụ na o kpuchiri ihu ya. Ma ebe ọ mataghị na ọ bụ nwunye nwa ya, o jekwuru ya ebe ọ nọdụrụ ala nʼakụkụ ụzọ sị ya, “Bịa, kwere ka mụ na gị dinaa.” jụrụ, “Gịnị ka ị ga-enye m ma ọ bụrụ na m kwere ka mụ na gị dinaa?” Ọ zara, “Aga m ezitere gị otu nwa ewu site nʼigwe ewu na atụrụ m.” Ọ jụrụ, “Ị ga-enye m ihe akaebe ruo mgbe ị ga-ezite ya?” Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. Mgbe zigara enyi ya onye ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa , “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ. Mgbe oge ọmụmụ nwa ya ruru, ejima ka ahụrụ nʼakpanwa ya. Mgbe ọ na-amụ ha, otu nʼime ha sepụtara aka ya. Nwanyị na-aghọ nwa weere eriri na-acha uhie uhie kee ya na nkwoji aka kwuo sị, “Ọ bụ nke a bụ ụzọ pụta.” Ma nwa ahụ mesịrị sekpuo aka ya, nwanne ya nke ọzọ eburu ya ụzọ pụta. Nwanyị ahụ sịrị, “Ọ bụ otu a ka ị si tikapụta?” A kpọrọ ya . Emesịa, nwanne ya, nke bu eriri uhie uhie ahụ na nkwoji aka pụtakwara. A kpọrọ ya .

Every verse in Genesis 38

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00