Genesis 40:2

“Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.”

Genesis 40:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 2 of 23 in Genesis chapter 40 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Genesis 40 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze . Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri. O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara . Onyeisi ndị nche mere onye na-elekọta ha. Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị. Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze , rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya. Mgbe chi bọrọ, Josef bịakwutere ha hụ na ihu ha gbarụrụ agbarụ. Nʼihi ya, ọ jụrụ ndị ozi ndị a ha na ya nọ nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ nna ya ukwu sị ha, “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?” Ha zara sị ya, “Anyị rọrọ nrọ ọjọọ, ma onye nkọwa ya adịghị.” sịrị ha, “Ọ bụghị nwee ike ịkọwa nrọ? Kọọrọnụ m ha.” Onyeisi ndị na-ebu iko kọọrọ nrọ ya. Ọ sịrị ya, “Arọrọ m nrọ hụ osisi vaịnị nʼihu m. Osisi vaịnị a nwere alaka atọ. Mgbe m nọ na-ele anya, osisi vaịnị ahụ mara ifuru, mịpụta mkpụrụ nʼụyọkọ nʼụyọkọ, ha chakwaa. Ebe ọ bụ nʼiko dị m nʼaka, a ghọọrọ m mkpụrụ vaịnị ndị a, pịpụta mmiri ha pịnye nʼime iko mmanya , bunye ya ka ọ ṅụọ.” Josef sịrị ya, “Nke a bụ ihe nrọ gị pụtara. Alaka atọ ahụ bụ abalị atọ. Nʼime abalị atọ ga-akpọpụta gị, mee ka i nwere onwe gị. Fero ga-enyeghachikwa gị ọrụ gị. Ị ga-etinyekwa iko ya nʼaka dịka i si eme na mbụ mgbe ị bụ onye na-ebu iko ya. Mgbe ihe gaara gị nke ọma, chetakwa m, ma gosi m obiọma, gwara m ka o si nʼụlọ mkpọrọ a wepụta m. Ọ bụ ntọrọ ka atọọrọ m site nʼala ndị . Nʼotu aka ahụ, nʼebe a ọ dịkwaghị ihe ọjọọ ọ bụla m mere nke kwesiri ka atụnye m nʼụlọ mkpọrọ a.” Mgbe onyeisi ndị na-esiri nri hụrụ na nkọwa nrọ ahụ dị mma, ọ sịrị , “Mụ onwe m, na nrọ m nke m, ebu m nkata achịcha atọ nʼisi. Nkata nke dị nʼelu jupụtara na achịcha dị iche iche e gheere eze, bụ . Ma ụmụ nnụnụ bịara na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata m bụ nʼisi.” Josef zara sị ya, “Lee ihe nrọ gị pụtara. Nkata atọ ahụ bụ abalị atọ. Nʼime abalị atọ ka ga-esi nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta gị, nye iwu ka e bepụ gị isi, kwụba gị nʼelu osisi. Ụmụ nnụnụ ga-erichapụ anụ ahụ gị.” Nʼabalị nke atọ, site nʼụbọchị ndị a rọrọ nrọ ha, Fero mere mmemme ncheta ọmụmụ ya. Ọ kpọrọ ndị niile na-ejere ya ozi oriri. O ziri ozi ka a gaa nʼụlọ mkpọrọ kpọpụta onyeisi ndị na-ebunye ya iko ihe ọṅụṅụ na onyeisi ndị na-esiri ya nri. O nyeghachiri onyeisi ndị na-ebu iko ya ọrụ ya, weghachi ya nʼọnọdụ ya. Nwoke a bunyekwara iko ya dịka o si eme na mbụ. Ma ọ kwụgburu onyeisi ndị na-esiri ya nri, dịka si kọwaa nrọ ha. Ma onyeisi ndị ahụ na-ebu iko eze echetaghị . O chefuru ya.

Every verse in Genesis 40

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00