Hosea 13:8
“Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha.”
Hosea 13:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 8 of 16 in Hosea chapter 13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Hosea 13 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Na mbụ, mgbe ọbụla kwuru okwu, a na-enwe ọma jijiji, nʼihi na ọ bụ onye e buliri elu nʼ. Ma ikpe maara ya nʼihi ofufe o fere , ọ nwụkwara. Ugbu a, ha na-aga nʼihu nʼime mmehie, ha na-eji ọlaọcha na-akpụrụ onwe ha arụsị dị iche iche, nke ha ji uche kpachara anya kpụzie nke ọma, ha niile bụ akaọrụ ndị ǹka. Ha onwe ha na-ekwu, “Ha na-achụ aja ụmụ mmadụ. Ha na-esusukwa nwa ehi a kpụrụ akpụ ọnụ” Nʼihi ya, ha ga-adị ka igirigi nke ụtụtụ, maọbụ igirigi nke na-agbachapụ ngwangwa, dịka igbugbo nke a fụchapụrụ nʼebe ịzọcha ọka, dịka anwụrụ ọkụ nke si na oghereikuku na-ekupụ. “Ma mụ onwe m bụ anyị na gị, siterịị nʼala . Unu agaghị anabatara onwe unu ọzọ karịa m. Ọ dịghị nzọpụta ọzọ dị karịa m. Elekọtara m unu nʼime ọzara, nʼala ahụ kpọrọ nkụ, nke mmiri na-adịghị. Mgbe m nyere ha nri, ha rijukwara afọ. Mgbe afọ juru ha, ha bidoro ịkpa nganga, chefuo m. Nʼihi ya, aghaghị m ịbịakwasị ha dịka ọdụm; maọbụ dịka agụ nke na-ezo onwe ya nʼakụkụ ụzọ. Aga m adakwasị ha dịka anụ ọhịa bịa nke a gbabara aka ụmụ ya, dọwasịa anụ ahụ kpuchiri obi ha aga m eripịa ha dịka ọdụm, anụ ọhịa ga-adọkasịkwa ha. “Aga m ala gị nʼiyi, gị , onye pụrụ inyere gị aka? Ebee ka ndị eze gị nọ, ka ha bịa zọpụta gị? Ebee ka ndịisi ọchịchị nke obodo gị niile nọ, bụ ndị ahụ i ji nʼihi ha na-asị, ‘Nye m eze na ndị ọchịchị’? Esitere m nʼiwe m nye gị eze, sitekwa nʼọnụma m, napụ gị ya. Njehie nke ka e kechikọtara debe; a na-edetukwa mmehie ya niile nʼakwụkwọ. Ihe mgbu nke dịka ihe mgbu nwanyị ime na-eme na-abịakwasị ya; maọbụ nwantakịrị na-enweghị uche. Mgbe oge ya zuru, ọ jụrụ ịpụta site nʼọnụ akpanwa ka a mụpụta ya. “Aga m anapụta ha site nʼike nke mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, ọ bụ ezie na ya onwe ya bụ onye na-amị mkpụrụ nʼetiti ụmụnne ya niile. Ma oke ifufe si nʼọwụwa anyanwụ, nke anyị zitere, ga-esi nʼọzara fekwasị ya. Isi iyi niile ga-ata, olulu mmiri ya ga-atakọrọkwa. A ga-apụnara ya ihe dị nʼụlọakụ ya niile, na akụ niile o nwere. Sameria aghaghị ịta ahụhụ ikpe ọmụma ya, nʼihi na o nupuru isi megide ha. A ga-eji mma agha gbuo ndị ya niile, tụpịa ụmụntakịrị ya niile nʼala, jirikwa mma agha bọwaa ndị inyom niile dị ime.”
Every verse in Hosea 13
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.