Hosea 7:3

““Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.”

Hosea 7:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 16 in Hosea chapter 7 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Hosea 7 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

mgbe m chọrọ ịgwọ , mmehie na-apụta ihe, a na-ekpughekwa arụ a na-eme na . Ha na-aghọ aghụghọ, ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ, ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ. Ọ dịghị onye bi nʼime ha maara na m na-echeta mmehie ha niile. Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu. Ana m ahụkwa ha niile. “Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha; ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha. Ha niile bụ ndị na-akwa iko; ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ, nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ, site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri. Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị, ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke, ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka. Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha, ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya. Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ, nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ. Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ. Ha na-eripịa ndị eze ha. Ndị eze ha niile na-ada, ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m. “Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ. Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị. Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha, ma ha adịghị aghọta ya. Isi awọ apụtala ha nʼisi, ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị. Ịnya isi na-agba akaebe megide ya ma nʼagbanyeghị ihe ndị a ọ naghị alọghachikwute anyị bụ ya, maọbụ chọọ ya. “Ifrem dịka nduru nke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie, ugbu a, ọ na-akpọku , ma na-agbakwurukwa Asịrịa. Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha, dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe. Aga m enye ha ahụhụ nʼihi njehie ha niile. Ahụhụ na-adịrị ha, nʼihi na ha ajụla m. Ha na-ala nʼiyi nʼihi na ha enupula isi ha megide m. Achọrọ m ka m gbapụta ha, ma ha na-agha ụgha megide m. Ha ejighịkwa obi ha akpọku m, kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa. Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya, ha na-egbukasị onwe ha ahụ, na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ. Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike, ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m. Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka kachasị ihe niile elu. Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla. Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha, nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta. Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchị nʼala .

Every verse in Hosea 7

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00