Isaiah 12:2
“Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.””
Isaiah 12:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 6 in Isaiah chapter 12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Isaiah 12 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi. Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. Bụkuonụ anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube. Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ. Ka ndị niile bi na ọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ. Nʼihi na nsọ nke . dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ ahụ na-ebi nʼetiti unu.”
Every verse in Isaiah 12
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.