Isaiah 16:9
“Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.”
Isaiah 16:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 9 of 14 in Isaiah chapter 16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Isaiah 16 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye nye onye na-achị ala ahụ site na , gafee nʼụzọ ọzara ruo ugwu nke ọn. Ndị inyom nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ. na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “ okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe. Ka ndị achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu, ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.” mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ, mbibi ga-akwụsịkwa, onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ. A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya; otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi, otu onye sitere nʼụlọ ikwu , bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi, na-emekwa ngwa ime ezi omume. Anyị anụla akụkọ banyere , nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ. Ya mere, ndị niile na-eti mkpu akwa, ha na-ebetara akwa. Kwasie akwa ike, nwee mwute, nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke . Lee ka ubi niile nke ọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo , ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri. Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị . Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị ọn, na gị , nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma, ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige; ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya; nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị. Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi dịka ụbọ akwara, ime mmụọ m kwa nʼihi . Mgbe ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu, ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya, mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya, o nweghị uru nke a ga-abara ha. Ihe ndị a niile bụ okwu anyị kwuru banyere na mbụ, ma ugbu a anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”
Every verse in Isaiah 16
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.