Isaiah 21:2
“Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.”
Isaiah 21:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 17 in Isaiah chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Isaiah 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu. Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha , buonu agha! Unu ndị agha , gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị. Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya. Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji. Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ! Ihe a ka anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ. Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.” Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile. Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ” O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ kwuru. Nke a bụ amụma megide : Otu onye si na na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?” Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.” Amụma megide ịa: Unu ndị ije niile nke , ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke ịa, kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ; unu ndị bi nʼala , buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri. Nʼihi na ọ bụ site nʼagha nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ, na agha e ji akụ agbatu mmadụ ka ha si na-agbapụ ọsọ. Nke a bụ ihe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma ga-agwụsị. Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na , ga-adị mmadụ ole na ole.” anyị, bụ ekwuola ya.
Every verse in Isaiah 21
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.