Isaiah 22:1

“Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ?”

Isaiah 22:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 1 of 25 in Isaiah chapter 22 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Isaiah 22 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Amụma megide ndagwurugwu nke ọhụ. Ọ bụkwa gịnị na-eme unu ugbu a nke mere na unu niile rịgooro nʼelu ụlọ? Gị obodo jupụtara nʼoke ọgbaaghara, gị obodo oke ụzụ na-aṅụrị obi ụtọ? Ndị unu niile nwụrụ anwụghị nʼime ọgbọ agha, ma ọ bụkwanụ site na mma agha. Ndịisi unu niile agbapụchaala. E jidechara ha niile na-enweghị àkụ ọbụla a gbapụrụ. Unu niile e jidere ka a dọkpụụrụ nʼotu dịka ndị mkpọrọ bụ ndị ahụ gbapụrụ ọsọ mgbe ndị iro ka nọrịị ebe dị anya. Nʼihi nke a, asịrị m, “Lepụnụ m anya ka m nọọrọ onwe m; ka m bee akwa dị ilu. Unu anwakwala ịkasị m obi, nʼihi mbibi e bibiri ndị m.” Onyenwe anyị, bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwee otu ụbọchị ụbọchị ọgbaaghara na nzọda na ihe nke ịgba mmadụ gharịị, nʼime ndagwurugwu nke ọhụ, ọ bụ ụbọchị itida mgbidi na nke itiku ugwu niile mkpu akwa. bu akpa àkụ, ya na ndị nọkwasịrị nʼelu ụgbọala na ịnyịnya ha; Kia ewepụtakwala ọta. Ụgbọala jupụtara na ndagwurugwu unu niile mara mma; ndị na-agba ịnyịnya anọchisiela ọnụ ụzọ niile e si abanye nʼobodo unu. Onyenwe anyị wezugara ihe nchedo niile nke , nʼụbọchị ahụ unu legidere anya na ngwa agha dị nʼỤlọeze dị nʼ ọhịa. Unu hụrụ na mgbidi obodo nwere ọtụtụ mgbawa nʼebe dị iche iche na ya. Unu chekọtara mmiri nʼọdọ mmiri nke ala ala. Unu gụrụ ụlọ dị na ọnụ, tiwaa ụfọdụ ụlọ iji mee ka mgbidi sie ike. Unu gwuru ọdọ mmiri nʼetiti mgbidi abụọ maka ichekwa mmiri si nʼọdọ mmiri ochie, ma unu elekwasịghị ahụ kere ya anya, unu ejikwaghị ahụ tụrụ atụmatụ ya site na mgbe gara aga kpọrọ ihe. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọrọ unu ụbọchị ahụ ka unu kwaa akwa, ruo ụjụ, kpụchaa agịrị isi unu ma yirikwa akwa mkpe. Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.” Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpugheerala m mee ka m nụrụ, “Nʼezie, agaghị ekpuchiri unu mmehie a ruo ụbọchị unu ga-anwụ.” Ọ bụ ihe anyị, bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru. Otu a ka anyị, bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru: “Gaa, gwa odozi akụ a bụ , nke bụ onye na-elekọta ụlọ ukwu eze: Gịnị ka ị na-eme nʼebe a, onye nyekwara gị ikike na i gwuwaara onwe gị ili nʼebe a, na-egwuwakwa ili gị nʼebe dị elu na-akapụtara onwe gị ebe izuike nʼime nkume ahụ? “Kpachara anya, Onyenwe anyị na-aga ịkpata gị aka, tufuo gị nʼebe dị anya, gị dike na nwoke. Ọ ga-afịkọta gị okirikiri dịka bọlụ, tufuo gị nʼobodo sara mbara. Nʼebe ahụ ka ị ga-anọ nwụọ, nʼebe ahụ kwa ka ụgbọala gị nke i ji anya isi ga-aghọ ihe ihere nye ezinaụlọ onyenwe gị. Onyenwe anyị ga-achụpụkwa gị site nʼọkwa gị, na sitekwa nʼọnọdụ gị dị elu, dọda gị nʼala. “Nʼụbọchị ahụ, aga m akpọ ohu m, Eliakịm, nwa . Aga m eyikwasị ya uwe ọrụ gị, kekwasịkwa ya ihe ike nʼukwu, werekwa ike ọchịchị ahụ i nwere na mbụ nyefee ya. Ọ ga-abụkwara ndị na ndị nna. Aga m enyefekwa ya nʼaka ihe ntụghe ụzọ nke ụlọ . A ga-emeghe ihe niile ọ sị na a ga-emeghe, mechiekwa ihe niile ọ sị na a ga-emechi, Aga m eme ka o guzosie ike dịka ǹtu a kpọgidere nʼaja ụlọ. Ocheeze ya ga-ewetara ụlọ nna ya nsọpụrụ. A ga-ekokwasị ya ebube nke ezinaụlọ ya, ụmụ ya na ụmụ ụmụ ya, ihe niile nke dị nta, site na ite na efere, sitekwa nʼọba ruo na karama niile. “Nʼụbọchị ahụ,” ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, “Nʼoge ahụ, ǹtu ahụ a kpọgidesịrị ike nʼaja ụlọ ga-apụ nʼọnọdụ ya, a ga-akpajipụ ya ọ dapụ nʼala. Ibu niile nke kokwasịrị nʼelu ya ka a ga-egbuda nʼala.” Nʼihi na anyị ekwuola ya.

Every verse in Isaiah 22

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00