Isaiah 28:9

““Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara?”

Isaiah 28:9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 9 of 29 in Isaiah chapter 28 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Isaiah 28 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako , obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi. Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma. Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi. Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume, dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi, dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo, ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala. Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke, ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ. Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya, nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe, ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo, nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka, tinye nʼọnụ ya, loo ha. Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya, ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụ okpueze mara mma, ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma. Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezi nye ndị ikpe. Ọ ga-abụkwa ike nye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama. Ndị a kwa na-adagharị site na mmanya sitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya. Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya, mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme; ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya ha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche, ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe. Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi. O nwekwaghị ebe dị ọcha. “Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe? Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya? Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara, bụ ndị a ka napụrụ ara? Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya, ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ, nʼusoro tụkwasị nʼusoro, nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.” Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghị zi unu ihe. Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị, “Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike; nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.” Ma ha jụrụ ige ya ntị. Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu anyị nʼahịrị nʼahịrị, nʼusoro nʼusoro; nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ, ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ, ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara. Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị dị nʼaka. Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” Ma otu a ka kachasị ihe niile elu, bụ anyị sịrị, “Lee, ana m atọgbọ na ọn otu nkume, nke anwapụtarala. Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike. Onye nke kweere na ya egwu agaghị ejide ya. Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe, ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi; akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu, mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu. Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu. Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” ahụ, obi unu ga-aghọta okwu ; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji. Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya; akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma. Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu , ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na ọn, ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa, na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya. Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo, ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa. Nʼihi na anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi. Geenụ ntị, nụrụnụ olu m, ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu. Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ? Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla? Mgbe o gwuzesịrị ya, ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin? Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya, ọka balị nʼebe o kwesiri, na spelti nʼebe o kwesiri? Ọ maara ihe o kwesiri ime, nʼihi na na-ezi ụzọ ziri ezi. Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe, maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin, kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin, werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe. A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha. Ihe ndị a niile na-esite nʼaka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa, onye nzube ya dị ịtụnanya, onye amamihe ya dị ebube.

Every verse in Isaiah 28

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00