Isaiah 33:23

“A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.”

Isaiah 33:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 23 of 24 in Isaiah chapter 33 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Isaiah 33 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi, onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka. Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu, onye na-enwebeghị ndị rafuru gị. Mgbe ị kwụsịrị ibibi ihe ka a ga-ebibi gị, mgbe ị kwụsịkwara nrafu ka a ga-arafu gị. Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ, nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya. Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile, bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa. Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị. Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga. Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi, otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche. Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu. Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta ọn. Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile, ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma; egwu anyị bụ igodo nke akụ a. Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile; ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa. Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla. E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire. A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe ha mee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike. Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ. Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu. Oke ọhịa ọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere. Sharọn aghọkwaala ọzara; osisi dị na na nʼelu ugwu na-agbụchakwa akwụkwọ ha. Ma anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.” “ a, ka a ga-eme ka m dị elu; ugbu a, ka a ga-ebuli m elu. Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ, unu na-amụpụta ahịhịa, nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu. Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ; ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.” Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya! Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike! Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na ọn na-ama jijiji nʼegwu, ha na-akwa akwa na-asị, “Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa, ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?” Ndị na-ejegharị nʼezi omume na-ekwu ihe ziri ezi, ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi, ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche, ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara, na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ. Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu, ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu. A ga-enye ha nri, mmiri a gaghị akọkwa ha. Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya; unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya. Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga. “Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a? Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ? Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?” Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ, bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị, nke unu na-adịghị aghọtakwa. Lekwasịnụ ọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile; anya unu ga-ahụkwa , ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ; apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya, maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya. Ebe ahụ ka anyị ga-abụrụ anyị dị ike. Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara. Ọ dịghị ụgbọ amara maọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ. Nʼihi na anyị bụ onye ikpe anyị. Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu. Onyenwe anyị bụ eze anyị, ọ bụ ya na-azọpụta anyị. A tọsaala ụdọ niile: Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike, a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe. Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼagha ọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha. Ọ dịkwaghị onye bi na ọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,” nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.

Every verse in Isaiah 33

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00