Isaiah 39:1
“Nʼoge ahụ, Merodak-Baladan, nwa Baladan, bụ eze Babilọn zigaara Hezekaya akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na Hezekaya rịara ọrịa ma nwe ahụ ike.”
Isaiah 39:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 1 of 8 in Isaiah chapter 39 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Isaiah 39 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼoge ahụ, Merodak-, nwa , bụ eze ọn zigaara akwụkwọ ozi ekele na onyinye, nʼihi na ọ nụrụ na rịara ọrịa ma nwe ahụ ike. Hezekaya nabatara ndị ozi ahụ nke ọma gosi ha ihe ndị dị nʼụlọakụ ya, ọlaọcha, na ọlaedo, ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ, ezigbo mmanụ oliv, ụlọ niile ebe ngwa agha ya niile dị, na ihe niile bụ akụ o nwere. Ọ dịghị ihe dị nʼụlọeze ya maọbụ nʼalaeze ya niile nke ọ na-egosighị ha. Mgbe ahụ, Aịzaya onye amụma jekwuru eze jụọ ya sị, “Gịnị ka ndị ikom ndị ahụ kwuru? Ebeekwa ka ha si bịakwute gị?” zara sị, “Ọ bụ nʼala dị anya ka ha si bịakwute m, ha si ọn.” Onye amụma jụrụ, “Gịnị ka ha hụrụ nʼụlọ gị?” zara sị, “Ihe niile nke dị nʼụlọ m ka ha hụrụ. Ọ dịghị ihe niile dị nʼụlọakụ m nke m na-egosighị ha.” Mgbe ahụ, Aịzaya sịrị , “Gee ntị nụrụ okwu anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Lee, oge na-abịa mgbe a ga-eburu ihe niile dị nʼụlọeze gị, na ihe niile nke nna nna gị ha debere nʼụlọakụ ruo taa, buru ha bulaa ọn. Ọ dịkwaghị ihe ga-afọdụ, otu a ka anyị kwuru. A ga-ebupụ ụfọdụ nʼime ụmụ gị, ndị bụ ahụ na ọbara gị, ndị a ga-amụtara gị, buru ha pụọ nʼebe dị anya, ha ga-abụ ndị onozi nʼụlọeze nke eze ọn.” Hezekaya zaghachiri, “Okwu anyị nke i kwuru dị mma.” Nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Udo na nchekwa ga-adị nʼoge ndụ m.”
Every verse in Isaiah 39
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.