Isaiah 59:14

“Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata.”

Isaiah 59:14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 14 of 21 in Isaiah chapter 59 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Isaiah 59 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼezie, aka anyị adịghị mkpụmkpụ nke na o nweghị ike ịzọpụta, ntị ya adịghịkwa arọ nke na o nweghị ike ịnụ ihe. Kama mmehie unu ekewapụla unu site nʼebe unu nọ; mmehie niile unu ezokwala ihu ya site nʼebe unu nọ, nke mere na ọ chọkwaghị ige ntị ọzọ. Nʼihi na aka unu jupụtara na ntụpọ ọbara, mkpịsịaka unu bụkwa nke mmehie merụrụ. Egbugbere ọnụ unu ekwuola okwu ụgha, ire unu na-atamukwa ihe ọjọọ. Ọ dịghị onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ọ dịkwaghị onye na-eji ikwesi ntụkwasị obi kpee ikpe. Ha na-adabere nʼịrụ ụka nʼenweghị isi, ha na-ekwu okwu ụgha, ha na-atụrụ ime okwu na ụka mụọkwa ajọ ihe. Ha na-avụ akwa ajụala, na-akpakwa akwụ udide. Onye ọbụla riri akwa ha ga-anwụ, mgbe ọbụla otu kụwara, ọ bụ agwọ ajụala na-esi nʼime ya apụta. Akwụ udide ha abaghị uru iji mee uwe, ha enweghị ike iji ihe ha mepụtara kpuchie onwe ha. Ọrụ ha niile bụ ajọ ọrụ, omume ihe ike jupụtara ha nʼaka. Ụkwụ ha na-eme ngwangwa ịgbaba nʼime mmehie, ha na-emekwa ngwa ịkwafu ọbara ndị o nweghị ihe ọjọọ ha mere. Ha na-achụso echiche ajọ ihe, ọrụ mbibi na ntipịa bụ ejiri mara nke ụzọ ha niile. Ha amaghị ihe ụzọ udo bụ, ikpe ziri ezi adịghị nʼụzọ ha na-eso. Ha e mela ụzọ ha ka ha gbagọọ agbagọ. Ndị niile na-eso ya anaghị enweta udo. Ya mere ikpe ziri ezi dị anya nʼebe anyị nọ, ezi omume adịghị erute anyị nso. Anyị na-ele anya ìhè, ma lee, ọchịchịrị ka anyị na-ahụ. Anyị na-ele anya mmụke ìhè ma anyị na-ejegharị nʼime oke ọchịchịrị. Anyị na-asọgharị ìsì na mgbidi dịka ndị na-enweghị anya, na-asọgharị isi dịka ndị na-enweghị anya; anyị na-ada na-akpọbi ukwu nʼetiti ehihie dịka a ga-asị na ọ bụ oge chi ojiji, nʼetiti ndị nwere ezi ndụ, anyị nọ ka ndị nwụrụ anwụ. Anyị na-agbọ ụja dịka bịa; anyị na-akwasị akwa ike dịka nduru nʼeru ụjụ. Anyị na-ele anya ikpe ziri ezi, ma ọ dịghị eru anyị aka; anyị na-ele anya nzọpụta, ma ọ dị anya nʼebe anyị nọ. Nʼihi na mmehie anyị amụbaala nʼihu anyị; ọ na-agbakwa ama megide anyị. E, anyị makwaara ụdị ndị mmehie anyị bụ, nʼihi na mmehie anyị dịkwa nʼihu anyị mgbe niile. Anyị maara nnupu isi anyị na ngọnarị anyị gọnarịrị anyị; anyị esitela nʼiso anyị anyị wezuga onwe anyị, nọgide na-akpali mmegbu na nnupu isi. Okwu ọnụ anyị bụ okwu ụgha, nke anyị si nʼobi anyị tụpụta. Ụlọ ikpe anyị niile adịghị achọ onye ezi omume; anyị amaghị ihe a na-akpọ ikpe ziri ezi. Eziokwu asọọla ngọngọ nʼama niile, ihe ziri ezi apụghị ịbata. E, eziokwu alaala; onye ọbụla kwa nke na-achọ ibi ndụ ọma na-etinye onwe ya na nsogbu. Onyenwe anyị lere anya hụ ihe ọjọọ ndị a niile, nke na-enyeghị ya obi ụtọ; ọ hụkwara na ikpe ziri ezi adịghị. Ọ hụrụ na anyị enweghị onye inyeaka ọbụla; o wutere ya na ọ dịghị onye na-arịọrọ anyị arịrịọ. Ọ bụ ya mere o ji bata site nʼike aka ya na nʼezi omume ya, bịa ịzọpụta anyị. Ọ na-eyikwasị ezi omume dịka ngwa agha ikpuchi obi ya. Okpu nke nzọpụta ka ọ na-eyikwasịkwa nʼisi ya. Ọ bụkwa uwe ịbọ ọbọ na nke ekworo na ịnụ ọkụ na obi ka o ji kpuchie onwe ya. Ọ ga-akwụghachi ndị iro ya dịka ajọ omume ha niile si dị. Iwe ọkụ ya ka ọ ga-eji megide ndị iro ya niile bi na mba dị anya. Site nʼọdịda anyanwụ, ndị mmadụ ga-asọpụrụ aha anyị, sitekwa nʼọwụwa anyanwụ, ha ga-atụ egwu ebube ya. Nʼihi na ọ ga-abịa dịka idee mmiri nke nkume, Onyenwe anyị na-agba na-aga. “Onye mgbapụta ga-abịa na ọn; ọ ga-abịakwute ụmụ ọb ndị na-esite na mmehie ha chegharịa.” a ka anyị kwubiri. “Ma mụ onwe m, nke a bụ ọgbụgba ndụ m nke dị nʼetiti mụ na ha,” ka anyị na-ekwu. “Mmụọ m, nke dị nʼahụ gị, na okwu m niile nke m tinyere nʼọnụ gị, agaghị apụ nʼegbugbere ọnụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ ụmụ gị, maọbụ nʼegbugbere ọnụ agbụrụ gị. Ha ga-adịgide site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi,” ka anyị kwuru.

Every verse in Isaiah 59

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00