Isaiah 62:8
“Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya.”
Isaiah 62:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 8 of 12 in Isaiah chapter 62 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Isaiah 62 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼihi ọn agaghị m emechi ọnụ, nʼihi agaghị m anọ jii, ruo mgbe ezi omume ya ga-enwuwa dịka ihe ụtụtụ; mgbe nzọpụta ya kwa ga-enwukwa dịka ọwaọkụ na-enwu enwu. Mba niile ga-ahụ ezi omume gị. Ndị eze niile ga-ahụkwa ebube gị. A ga-akpọkwa gị aha ọhụrụ ahụ nke ọnụ anyị ga-agụ gị. Ị ga-aghọ okpueze nke ịma mma nʼaka anyị, ihe iyi nʼisi nke ndị ụlọeze nʼaka gị. A gakwaghị akpọ gị onye ahapụrụ ahapụ, maọbụ kpọọ ala gị ala tọgbọrọ nʼefu. Ma a ga-akpọ gị , kpọkwa ala gị , nʼihi na ihe gị ga-atọ anyị ụtọ, a ga-alụkwa ala gị dịka nwunye. Dịka nwokorobịa si alụrụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, otu a ka na-ewu gị ga-alụ gị, dịka onye lụrụ nwunye ọhụrụ sị aṅụrị ọṅụ nʼebe nwunye ọhụrụ ya nọ, otu a ka gị ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi gị. Enyela m ndị nche ọnọdụ ọrụ nʼelu mgbidi gị niile, . Ha agaghị edebe ọnụ ha duu mgbe ọbụla, ma ehihie ma abalị. Unu ndị na-akpọku anyị, unu enyela onwe unu izuike. Unu enyekwala ya izuike tutu ruo mgbe ọ ga-eme ka guzosie ike, meekwa ya otuto nke ụwa niile. Onyenwe anyị ewerela aka nri ya werekwa ogwe aka ya ṅụọ iyi sị, “Ọ dịghịkwa mgbe m ga-enye mkpụrụ ubi gị ka ọ bụrụ nri nye ndị iro gị ọzọ, ọ dịghịkwa mgbe ndị ọbịa ga-aṅụkwa mmanya ọhụrụ ahụ bụ nke ị dọgburu onwe gị nʼọrụ nʼihi ya. Ma ndị were ya ka ihe ubi ga-eri ya, tookwa anyị, ndị kpokọtara oroma grepu ga-aṅụ ya nʼime ogige ebe nsọ m.” Gabiganụ! Gabiganụ sitenụ nʼọnụ ụzọ ama niile. Dozienụ ụzọ maka ndị m. Wuzienụ ụzọ niile, wuzienụ okporoụzọ niile. Bupụsịanụ nkume niile, weliekwanụ ọkọlọtọ maka mba niile. Onyenwe anyị ekwusaala okwu nye nsọtụ niile nke ụwa sị, “Gwanụ ọn, ‘Lee Nzọpụta gị na-abịa! Lee, ụgwọ ọrụ ya dị ya nʼaka, nkwụghachi nke ọ ga-akwụghachi sokwa ya na-abịa.’ ” A ga-akpọ ha Ndị Nsọ, ndị anyị gbapụtara; a ga-akpọkwa unu ndị a na-achọsi ike, Obodo a na-agbakụtaghị azụ.
Every verse in Isaiah 62
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.