Isaiah 9:1

“Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.”

Isaiah 9:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 1 of 21 in Isaiah chapter 9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Isaiah 9 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala ụlọn na ala ị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọ. Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu; ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị. I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu, mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu, ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị, dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi, dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụ mgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha. Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke , i gbajisiela ibu arọ niile e bokwasịrị ha, ihe mgbochi nke dị nʼubu ha, nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha. Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi, na uwe agha nke ọbara mechuru, ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ, ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma. Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa, e nyekwala anyị otu nwa nwoke. Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị. Ndị a ga-abụ aha ya, Onye Ndụmọdụ dị , Chineke bụ dike, Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze . Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udo nke na-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nʼocheeze ka ọ ga-anọkwasị, chịakwa nʼalaeze ya. Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike; ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịa site nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi. Ịnụ ọkụ nke anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-emezukwa nke a. Onyenwe anyị eziela ozi megide ọb ọ ga-adakwasịkwa . Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị, “Nkume brik ndị ahụ adakpọsịala ma anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha; ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị, ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.” Ma anyị a kpaliela ndị iro ka ha bilie megide ha, ọ kwaliekwala ndị iro ha. Ndị sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ . Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. Ma ọ bụ ezie na anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a, ndị echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya. Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi na ndị ọdụdụ, ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile. Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha, ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha. Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha; ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo. Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ, ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ, nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ , bụrụkwa ndị ajọ omume, ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ. Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ: ọ na-erepịa ogwu na uke, ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ, mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe. Nʼihi iwe ahụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe, ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere; ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya; ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya. Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe, onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri. Ha ga-eri ma afọ agaghị eju ha; nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha. Ndị ga-alụso ndị ọgụ, ndị ga-alụsokwa ndị ọgụ. Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso ọgụ. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ. Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Every verse in Isaiah 9

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00