Jeremiah 19:3
“Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị eze Juda, na ndị Jerusalem. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke Izrel kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru.”
Jeremiah 19:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 3 of 15 in Jeremiah chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Jeremiah 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ihe ndị a ka anyị kwuru, “Jee, zụta otu ite aja site nʼaka ọkpụ ite. Duru ụfọdụ nʼime ndị okenye na ndị nchụaja, jee na nke , nke dị nso nʼọnụ ụzọ ama dị nʼọwụwa anyanwụ. Nọdụ nʼebe ahụ kwupụtara ha okwu ndị m gwara gị. Sị ha, ‘Nụrụnụ okwu anyị, unu ndị eze , na ndị . Ihe ndị a ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ kwuru. Geenụ ntị! Aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ala a, ụdị ihe ọjọọ ga-eme ka ntị ọbụla nụrụ ya zụọ wuruwuru. Nʼihi na ha ahapụla m, mee ka ebe a ghọọ nke chi ndị mba ọzọ. Ha achụọla aja nsure ọkụ nʼime ya nye chi ndị ahụ ha na nna nna ha, maọbụ ndị eze , na-amaghị. Ha ejirila ọbara ndị aka ha dị ọcha mejupụta ebe a. Ha ewuola ebe ịchụ aja dị elu nye chi . Nʼelu ya kwa ka ha na-esure ụmụ ha dịka aja nye , bụ nke m na-enyeghị nʼiwu, ekwughịkwa m ya, o nwekwaghị mgbe o ji bata m nʼobi. Ya mere, kpacharanụ anya, nʼihi na ụbọchị ahụ na-abịa, ka anyị kwubiri, mgbe ndị mmadụ agaghị akpọkwa ebe a ma ọ bụkwanụ nke , kama a ga-akpọ ya . “ ‘Nʼebe a ka m ga-anọ laa nzube niile nke na nʼiyi. Aga m eme ka ha daa site na mma agha nʼihu ndị iro ha, nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike. Aga m enye ụmụ anụ ufe na anụ ọhịa ozu ha dịka nri. Aga m ebibi obodo a mee ka ọ ghọọ ihe iju anya na ihe ịma ọsụ. Ndị niile na-esi nʼakụkụ ya agafe ga-anọ nʼọnọdụ iju anya, ha ga-eledakwa ya anya nʼihi ọnya ya niile. Aga m emekwa ka ha rie anụ ahụ nke ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom. Ha ga-erikwa anụ ahụ ibe ha, nʼihi na ndị iro ha ga-agba ha gburugburu nọchibido ha nʼime oke mkpagbu ka ha bibie ndụ ha.’ “Kụwaa ite ahụ mgbe ndị gị na ha so nọ na-ele gị anya. Gwa ha sị, ‘Otu a ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile sịrị: Aga m etipịa mba a na obodo a, dịka ite aja nke ọkpụ ite a si daa tipịasịa nʼụzọ a na-apụghị imezikwa ya ọzọ. Ha ga- ndị nwụrụ anwụ na tutu ruo mgbe ohere na-agaghị adịkwa ili ozu ọzọ. Ihe dị otu a ka m ga-eme nʼebe a, meekwa ndị bi na ya. Otu a ka anyị kwubiri. Aga m eme obodo a ka ọ dịrị ka . Ụlọ niile dị na na ụlọ niile nke ndị eze ka a ga-emerụ dịka ebe a, bụ , otu a ka a ga-esi merụọkwa ụlọ niile a suree ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼelu ha nye usuu niile nke eluigwe, wụsakwara chi ndị ọzọ ihe ọṅụṅụ dịka onyinye.’ ” Mgbe si na , ebe ahụ anyị zigara ya ibu amụma lọta, o guzoro nʼogige ụlọnsọ ukwu ahụ, gwa ndị mmadụ niile okwu sị ha, “Otu a ka anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ nke sịrị, ‘Geenụ ntị! Ana m aga ime ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru okwu ya bịakwasị obodo a, na obodo nta niile gbara ya gburugburu, nʼihi na ha bụ ndị isiike, ndị jụrụ ige ntị nʼokwu m.’ ”
Every verse in Jeremiah 19
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.