Jeremiah 22:26

“Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ.”

Jeremiah 22:26 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 26 of 30 in Jeremiah chapter 22 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Jeremiah 22 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ihe ndị a ka anyị kwuru, “Jee nʼụlọeze nọdụ nʼebe ahụ kwusaa ozi ndị a. ‘Nụrụ okwu anyị, nye gị, gị eze , gị onye na-anọkwasị nʼocheeze . Nụrụ ya, gị na ndịisi ọchịchị gị, na unu ndị niile na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụ na-abatakwa. Ihe ndị a ka anyị kwuru, Meenụ ihe dị mma na ihe ziri ezi. Napụtanụ onye eji aka ike napụ ihe o nwere site nʼaka onye ahụ na-emegbu ya. Unu emejọkwala onye ọbịa, maọbụ mee ya ihe ike. Unu emekwala ndị na-enweghị nna, maọbụ ndị inyom di ha nwụrụ ihe ọjọọ. Unu awụsịkwala ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼebe a. Nʼihi na ọ bụrụ na unu elezie anya mee iwu ndị a niile, mgbe ahụ, ndị eze na-anọkwasị nʼelu ocheeze ga-anọgide na-esite nʼọnụ ụzọ ama ndị a na-apụta, na-abata nʼelu ụgbọ agha ha, ma nʼelu ịnyịnya ha, ha na ndịisi ọchịchị ha, na ndị ha na-achị. Ma ọ bụrụ na unu ajụ irube isi nye iwu ndị a, otu a ka anyị kwubiri, eji m onwe m na-aṅụ iyi na ụlọeze a ga-aghọ mkpọmkpọ ebe.’ ” Nʼihi na ihe ndị a ka anyị kwuru banyere ụlọeze , “Ọ bụ ezie na ịdị dịka nye m, dịka elu ugwu ukwu ọn, aghaghị m ime gị ka ị dịrị ka ebe ikpofu ahịhịa, dịka obodo ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya. Aga m ezite ndị mbibi ndị ga-abịa megide gị. Onye ọbụla nʼime ha ga-eji ngwa agha ya. Ha ga-egbutusịkwa osisi sida ọma gị niile, tụnye ha niile nʼime ọkụ. “Ọtụtụ ndị si mba ọzọ bịa ga-agafe obodo a. Ha ga-ajụrịta ibe ha ajụjụ sị, ‘Gịnị mere anyị ji mee obodo ukwuu a ihe ọjọọ dị otu a?’ Ọsịsa ha ga-enweta ga-abụ, ‘Ọ bụ nʼihi na ha gbakụtara ọgbụgba ndụ anyị ha azụ, malite ịkpọ isiala na ife chi ndị ọzọ.’ ” Unu akwala akwa nʼihi eze ahụ nwụrụ anwụ, maọbụ ruo ụjụ nʼihi na ọ gaghị abụkwa eze unu, kama kwaanụ akwa nʼihi onye ahụ a dọtara nʼagha buru gaa mba ọzọ. Nʼihi na ọ gaghị alọghachi ọzọ; ọ gaghị ahụkwa ala ebe a mụrụ ya anya ọzọ. Nʼihi na ihe ndị a ka anyị kwuru banyere nwa , onye nọchiri anya nna ya dịka eze , bụ onye ahụ e si nʼebe a buru gaa mba ọzọ, “Ọ gaghị alọtakwa ọzọ. Ebe ahụ e buuru ya gaa ka ọ ga-anọ nwụọ. Ọ gaghị ahụkwa ala nke aka ya anya ọzọ.” “Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọeze ya site nʼụzọ ajọ omume, nke jikwa ikpe na-ezighị ezi na-ewu ime ụlọ elu ya niile, onye ahụ nke na-eme ndị mmadụ rụọ ọrụ nʼefu, nke na-adịghị akwụ ha ụgwọ ọbụla nʼihi ọrụ ha. Onye na-asị, ‘Aga m ewuru onwe m ụlọeze buru ibu, nke ọnụụlọ dị nʼụlọ elu ya sara ezi mbara.’ Ya mere, ọ tinyere oghereikuku sara mbara nʼụlọ ahụ, jirikwa osisi sida machie elu ya, werekwa penti na-acha uhie uhie chọọ ya mma. “Ị ga-abụ eze nʼihi na i nwere ọtụtụ osisi sida karịa ndị ọzọ? Nna gị o nweghị ihe oriri na ihe ọṅụṅụ? O mere ihe dị mma na ihe ziri ezi nʼihi ya ihe niile gaara ya nke ọma. O kwuchitere ọnụ ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, nke a mere na ihe niile gara nke ọma. Ọ bụghị nke a bụ ihe ọ pụtara bụ ịmara m? Ka anyị kwupụtara Ma anya unu na obi unu adịghị nʼihe ọzọ ma ọ bụghị naanị nʼuru nʼezighị ezi nʼiwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, na imegbu ndị mmadụ, na iji aka ike pụnara ha ihe ha nwere.” Ya mere, ihe ndị a ka anyị kwuru banyere nwa eze : “Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nwanne m nwoke! Ewoo nwanne m nwanyị!’ Ha agaghị eruru ya uju sị, ‘Ewoo nna anyị ukwu! Ewoo ịma mma ya!’ A ga- ya dịka e si ịnyịnya ibu. A ga-adọkpụrụ ozu ya nʼala tufuo ya nʼazụ ọnụ ụzọ ama .” “Gbagoruo na ọn tie mkpu akwa, meenụ ka a nụ olu unu na , sitekwanụ na tie mkpu akwa nʼihi na e gweriela ndị niile unu na ha dị na mma. Adọrọ m gị aka na ntị nʼoge ahụ ị nọ na-eche na i guzo chịm, ma ị jụrụ ige ntị. Nke a bụkwa omume gị site na mgbe ị bụ nwantakịrị. Ị jụkwara irubere m isi. Oke ifufe ga-ebufu ndị ọzụzụ atụrụ gị niile, a ga-emekwa ka ndị gị na ha dị na mma gaa biri na mba ọzọ. Mgbe ahụ, ihere ga-eme gị, ị ga-aghọkwa onye e wedara nʼala nʼihi ajọ omume gị niile. Gị onye na-ebi na ọn, onye ebe obibi ya dị nʼụlọ e ji osisi sida wuo, lee ka i si na-asụ ude mgbe ihe mgbu bịakwasịrị gị, ihe mgbu yiri nke nwanyị ime na-eme. “Ma dịka m na-adị ndụ,” otu a ka anyị kwubiri ya, “a sịkwarị na gị, bụ , nwa eze , bụ mgbaaka akara m gbanyere na mkpịsịaka dị nʼaka nri m, aga m agbapụkwa gị, were gị nyefee nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ gị ike, bụ ndị ahụ ị na-atụ ụjọ ha. Aga m enyefe gị nʼaka eze ọn na ndị ịa. Aga m atụfu gị na nne mụrụ gị, tụga unu na mba ọzọ dị iche site nʼobodo a nọ mụọ unu. Ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ. Unu agaghị alọghachikwa nʼala ahụ na-agụ unu agụụ ịlọghachi nʼime ya.” Nwoke a bụ , ọ bụ ite tiwara etiwa, nke e lelịrị elelị, ihe onye ọbụla na-achọghị? Nʼihi gịnị ka a ga-eji tufuo ya na ụmụ ya, tụga ha na mba ha na-amaghị? Ala, ala, ala, nụrụ okwu anyị. Ihe ndị a ka anyị kwuru: “Detuo ya nʼakwụkwọ na nwoke a bụ onye gba aka nwa, nwoke nke ihe na-agaghị agara nke ọma nʼoge ndụ ya niile, nʼihi na o nweghị onye nʼime ụmụ ọ mụrụ nke ihe ga-agara nke ọma, o nwekwaghị onye nʼime ha ga-anọkwasị nʼocheeze , maọbụ chịakwa ọzọ na .”

Every verse in Jeremiah 22

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00