Jeremiah 34:11

“Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ.”

Jeremiah 34:11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 11 of 22 in Jeremiah chapter 34 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Jeremiah 34 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe eze ọn na ndị agha ya niile, na mba niile dị nʼalaeze nke ọ na-achị na-ebuso na obodo niile gbara ya gburugburu agha, okwu anyị ruru ntị sị, “Ihe ndị a ka anyị, Chineke kwuru, Jekwuru bụ eze , gwa ya sị, ‘Ihe ndị a ka anyị kwuru, ejikerela m ugbu a inyefe eze ọn obodo a nʼaka. Ọ ga-esurekwa ya ọkụ. Ị gaghị agbanarị ya, nʼihi na ọ ga-ejide gị. A ga-arara gị nyefekwa ya nʼaka. Anya gị abụọ ka ị ga-eji hụ eze ọn. Gị na ya ga-ekwurịtakwa okwu. Ị ga-agakwa ọn. “ ‘Ma nụrụkwa nkwa anyị na-ekwe gị, gị eze . Ihe ndị a ka anyị kwuru banyere gị, Ị gaghị anwụ site na mma agha; ị ga-anwụ nʼudo. Dịka ndị mmadụ si mụnye ọkụ kwaa ozu nna gị ha, bụ ndị buru gị ụzọ chịa ka eze, otu a ka ha ga-esi mụnye ọkụ kwaa gị. Ha ga-eti aka nʼobi kwa akwa sị, “Ewoo, onyenwe anyị!” Ọ bụ mụ onwe m na-ekwe nkwa a, otu a ka anyị kwubiri ya.’ ” Mgbe ahụ, Jeremaya onye amụma gara gwa eze ihe ndị a niile na . Nʼoge a, ndị agha eze ọn na-ebuso agha. Ha na-ebusokwa obodo ndị ọzọ nke nọgidere na-ebuso ha agha, nke bụ obodo na . Obodo ndị a bụ naanị obodo fọdụrụ nʼala nke ndị agha ọn na-emeribeghị. Okwu anyị ruru ntị mgbe bụ eze, na ndị niile gbachara ndụ na ịkpọsara ndị ohu niile nwere onwe ha. Onye ọbụla ga-ahapụ ohu ya bụ onye ka o nwere onwe ya, ma ohu ahụ ọ bụ nwoke maọbụ nwanyị. A gaghị agụkwa onye ọbụla dịka ohu ọzọ. Ya mere, ndịisi ọchịchị niile, na ndị niile bụ ndị kwekọrịtara gbaa ndụ a, na ha ga-ahapụ ohu ha ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha nwere onwe ha. Ha mekwara dịka ha si kwuo. Ma mgbe oge nta gasịrị, ndị a niile gbanwere obi ha. Ha gara jide ohu ndị ahụ ha hapụrụ, mee ka ha ghọọkwa ndị ohu ha ọzọ. Mgbe ahụ, okwu anyị ruru ntị sị ya, “Ihe ndị a ka anyị, Chineke , kwuru, Mụ na nna nna unu ha gbara ndụ mgbe m si nʼala , bụ ala ebe ha bụ ohu kpọpụta ha. Mgbe ahụ agwara m ha sị, ‘Nʼọgwụgwụ afọ asaa ọbụla, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhapụ onye ibe unu resiri unu onwe ya dịka ohu, ka o nwerekwa onwe ya. Mgbe onye ahụ jeere unu ozi afọ isii, unu kwesiri ịhapụ ya ka o nwere onwe ya.’ Ma nna nna unu ha egeghị m ntị, ha etinyeghịkwa uche ha nʼiwu m nyere ha. Na nwa oge nta gara aga unu chegharịrị mee ihe ziri ezi nʼanya m. Onye ọbụla nʼime unu kpọsara inwere onwe nye ndị unu. Unu gara nʼihu gbaa ndụ nʼihu m nʼime ụlọnsọ ahụ a kpọkwasịrị aha m. Ma ugbu a, unu echigharịala, merụọ aha m; onye ọbụla nʼime unu akpọghachikwala nye onwe ya ndị ohu ndị ikom na ndị inyom ahụ unu hapụrụ ka ha nwere onwe ha, gaa dịka o si masị mkpụrụobi ha. Unu akwagidekwala ha ka ha bụrụkwa ndị ohu unu ọzọ. “Nʼihi nke a, ihe ndị a ka anyị kwuru, Unu erubeghị isi nye m, unu ekwusaghị nwere onwe nye ndị unu. Ya mere, ugbu a mụ onwe m na-akpọsa ‘ onwe’ nye unu, ka anyị kwubiri, ‘inwere onwe’ nke ịda nʼihi mma agha, na ajọ ọrịa na-efe efe, na oke ụnwụ. Aga m emekwa unu ka unu ghọọ ihe ịsọ oyi nye alaeze niile nke ụwa. Ma ndị ikom ahụ niile merụrụ ọgbụgba ndụ m, ndị ahụ na-edebezughị ọgbụgba ndụ ha gbara nʼihu m, ka m ga-eme ka ha dịrị ka nwa ehi ọgbụgba ndụ ahụ ha kpọwara abụọ, nke ha si nʼetiti ọkara abụọ ya gafee, maka imesi ọgbụgba ndụ ha ike. Ndị ndu na na ndị ozi eze na ndị nchụaja na ndị niile bi nʼala a ndị si nʼetiti ọkara nwa ehi ahụ gabiga ka m ga-enyefe nʼaka ndị iro ha ndị na-achọ iwepụ ndụ ha. Ozu ha ga-abụ ihe oriri nye anụ ufe nke eluigwe na anụ ọhịa nke ụwa. “Aga m enyefe eze na ndịisi ọchịchị ya nʼaka ndị iro ha, ndị na-achọ ndụ ha. Aga m enyefe ha nʼaka ndị agha eze ọn, ndị siterela nʼibuso unu agha wezuga onwe ha. Aga m enye iwu, ka anyị kwubiri, mee ka a kpọghachi ha azụ nʼobodo a. Ha ga-ebuso ya agha, merie ya, surekwaa ya ọkụ. Aga m emekwa ka obodo niile tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ya.”

Every verse in Jeremiah 34

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00