Jeremiah 4:22
““Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.””
Jeremiah 4:22 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 22 of 31 in Jeremiah chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Jeremiah 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
“Ọ bụrụ na unu bụ , ga-alọta, ka anyị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo, ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume ṅụọ iyi sị, ‘Dịka anyị na-adị ndụ,’ mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya nyakwaa isi nʼime ya.” Ihe ndị a ka anyị na-agwa ndị na sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu. Bienụ onwe unu ugwu nye anyị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị na ndị bi na ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya. “Kwupụta ya na , kwusaa ya na sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ ụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị na ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike. Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga ọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.” Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke , ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha. Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma anyị esitebeghị nʼebe nọ wezuga onwe ya. “Nʼụbọchị ahụ,” ka anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.” Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.” Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na , “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha, ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.” Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi! , sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi? Otu olu na-akpọsa site na , ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke . “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere : ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke . Ha ga-agbakwa gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’ ” a ka anyị kwubiri ya. “Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.” Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha. Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile. Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike? “Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.” Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya. Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị. Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala. Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu anyị, nʼihu oke iwe ya. Ihe a ka anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam. Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.” Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu. Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa. Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada ọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Every verse in Jeremiah 4
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.