Jeremiah 46:11

““Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.”

Jeremiah 46:11 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 11 of 28 in Jeremiah chapter 46 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Jeremiah 46 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ndị a bụ okwu anyị, nke ruru onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche. Nke dịrị : Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha , bụ eze , ndị eze ọn meriri nʼagha na , nʼakụkụ osimiri , nʼafọ nke anọ nke ọchịchị nwa , bụ eze . “Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha. Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu. Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka anyị kwupụtara. “Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri . “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị? Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl, dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị. Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile. Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’ Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom na , ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom ndị na-agba ụta. Ma ụbọchị ahụ dịrị anyị, bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na anyị bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri . “Rigoro ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị. Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.” Okwu ndị a ka anyị gwara onye amụma, banyere ọbịbịa nke , bụ eze ọn, onye na-abịa ibuso agha. “Kwupụtanụ ihe ndị a nʼ. Kwusaa ya na . Kwusaakwa ya na , na nʼobodo . Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu. Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na anyị ga-akwada ha. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’ Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’ “Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka si dịrị nʼakụkụ osimiri. Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼ, nʼihi na a ga-eme ka ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya. “Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya. Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ. Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi. Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị. A ga-eme ka ihere mee , mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.” Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ , sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị , na , na ala na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị obi. Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ eze ọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” a ka anyị kwubiri ya. “Atụla egwu, gị ọb, ohu m. Adakwala mba, gị . Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ. Atụla egwu, gị ọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”

Every verse in Jeremiah 46

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00