Job 17:16
“Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?””
Job 17:16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 16 of 16 in Job chapter 17 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Job 17 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m. Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha. “Debere m ihe ebe nʼebe gị nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe? I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri. Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba. “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu. Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ. Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume. Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike. “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu. Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso. Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘ m’ maọbụ ‘ m nwanyị,’ ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya? Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?”
Every verse in Job 17
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.