Job 23:1

“Mgbe ahụ, Job zara sị:”

Job 23:1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 1 of 17 in Job chapter 23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Job 23 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, zara sị: “Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m. A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya! Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m. Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m. Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo. Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi. “Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya. Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya. Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo, ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe. Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị. “Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya. Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m. Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya. Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji. Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.

Every verse in Job 23

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00