Job 27:6
“Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.”
Job 27:6 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 6 of 23 in Job chapter 27 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Job 27 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ma gakwara nʼihu nʼokwu ya sị: “Nʼezie, dịka na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi. Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume dịkwa nʼimi m, egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ. Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m. Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m. “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu. Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe wepụrụ ndụ ya? Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya? Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku mgbe niile? “Aga m akụziri unu maka ike nke ; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ pụrụ ime ihe niile. Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi? “Nke a bụ oke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka pụrụ ime ihe niile. Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha. Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha. Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ, ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya. Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru. Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola. Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị. Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya. Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya. Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”
Every verse in Job 27
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.