Job 32:21

“Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.”

Job 32:21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 21 of 22 in Job chapter 32 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Job 32 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. Ma oke iwe were nwa onye obodo , si nʼikwu megide nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa . Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe. Ma nwa onye obodo zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara. Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma. Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu. Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya. Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’ Ma edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya. “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha. M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa? Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu, nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m. Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa. Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi. Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi. Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.

Every verse in Job 32

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00