Joel 3:4
““Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị Filistia? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere.”
Joel 3:4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 4 of 21 in Joel chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Joel 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
“Nʼihi na, lee, nʼụbọchị ahụ, nʼoge ahụ, mgbe m ga-eweghachi akụnụba nke na , na m ga-achịkọta mba niile nke ụwa, mee ka ha zukọọ na . Nʼebe ahụ, ka mụ onwe m ga-ama ha ikpe, nʼihi ihe ha mere ihe nketa m, na ndị nke m . Nʼihi na ha chụsasịrị ndị m nʼetiti mba niile, kee ala m nʼetiti onwe ha. Ha fere nza nʼihi ndị m, were ụmụ m ndị nwoke gbanwere ụmụ akwụna. Ha rere ụmụ m ndị nwanyị nʼihi mmanya, nʼihi inweta mmanya ha ga-aṅụ. “Ọ bụ gịnị ka unu nwere megide m, unu Taịa na Saịdọn, na unu obodo ahụ niile dị gburugburu ala ndị ? O nwere ihe m mere nke unu na-akwụghachi m ụgwọ ya? Ọ bụrụ nʼezie na unu na-akwụghachi m ụgwọ, mụ onwe m ga-eji ọsọ kwụghachi unu ihe ọjọọ niile unu mere. Nʼihi na unu weere ọlaọcha m na ọlaedo m, burukwa ihe dị oke ọnụahịa niile m nwere, bulaa ha nʼụlọnsọ chi unu. Unu refuru ndị na ndị , resi ha ndị , si otu a wega ha nʼebe dị anya site nʼala ha. “Lee, aga m esi nʼebe ahụ unu refuru ha kpọlite ha. Aga m emekwa ka ihe ndị ahụ niile unu mere bịaghachi unu nʼisi. Aga m ewere ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị resi ha ndị , ndị ga-eresi ha ndị , bụ mba tere anya.” anyị ekwuola ya. Kwupụtanụ nke a nʼetiti mba niile: Jikerenụ agha! Kpọteenụ ndị dike nʼagha. Ka ndị agha niile a zụziri azụzi bịaruo nso ibu agha. Kpụgharịanụ mma oge unu ka ha bụrụkwa mma agha, kpụgharịakwanụ mma ịkwa osisi unu ka ha ghọọ ùbe. Ka onye na-adịghị ike kwuo sị, “Adị m ike!” Chịkọta onwe unu ọsịịsọ, bịa, unu mba niile, nọ nʼebe niile. Zukọtaanụ nʼebe ahụ. Kpọdata ndị agha gị dị ike anyị! “Ka akpọlitekwa mba niile, mee ka ha niile bịaruo na , nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka m ga-anọ kpee mba nọ nʼakụkụ niile ikpe. Tinye mma iwe ihe ubi, nʼihi na mkpụrụ ubi achaala. Bịa zọchaa mkpụrụ vaịnị, nʼihi nʼebe ịzọcha mmanya ejula, ebe ịnara mmanya gị niile ejubigakwala oke, nʼihi na ajọ omume ha dị ukwuu.” Ọtụtụ igwe mmadụ, ọtụtụ igwe mmadụ! Ha jupụtara na ndagwurugwu mkpebi ikpe ahụ! Nʼihi na ụbọchị anyị dị nso, na ndagwurugwu mkpebi nhọrọ ahụ. Anyanwụ na ọnwa ga-agbaji oji, kpakpando agakwaghị enye ìhè. Onyenwe anyị ga-ebigbọ na ọn, olu ya ga-ada nʼime . Elu ụwa na mbara eluigwe ga-amakwa jijiji. Onyenwe anyị ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba. Ọ ga-abụrụ ndị ebe e wusiri ike. “Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe m bụ anyị unu bi na ọn, nʼugwu m dị nsọ. ga-abụ ebe dị nsọ. Ndị mba ọzọ agakwaghị esite nʼime ya gabiga ọzọ. “Nʼụbọchị ahụ, mmanya ọhụrụ ga-esi nʼugwu ukwu niile na-atapụtasị, mmiri ara ehi ga na-erupụtakwa site nʼugwu nta niile; mmiri ga na-asọkwa na ndagwurugwu niile nke ebe mmiri si eru. Isi iyi ga-esitekwa nʼụlọnsọ ukwu anyị sọpụta dee . Ma ga-atọgbọrọ nʼefu, Edọm ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nʼihi ihe ike ha mere ndị , bụ ndị ha kwafuru ọbara ndị aka ha dị ọcha nʼala ha. Ma ga-abụ ebe mmadụ ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. A ga-ebikwa na nʼọgbọ niile. Aga m ahapụ ịbọ ọbọ ọbara ha? Mba, agaghị m agụnye onye ikpe maara dịka onye ikpe na-amaghị. Nʼihi na anyị bi na ọn.”
Every verse in Joel 3
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.