John 16:14

“Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu.”

John 16:14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 14 of 33 in John chapter 16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

John 16 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

“Ihe ndị a niile ka m gwara unu ka unu ghara ịda. Ha ga-esite nʼụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nʼezie, oge na-abịa mgbe onye ọbụla ga-egbu unu ga-echekwa na ọ na-efe mgbe ha na-eme nke a. Ha ga-eme ihe ndị a nʼihi na ha amaghị maọbụ m. Ana m agwa unu ihe ndị a ka ọ ga-abụ na mgbe oge ga-eru, unu echeta na m gwara unu. Agwaghị m unu ihe ndị a na mbụ nʼihi na mụ na unu nọ mgbe ahụ. Ma ugbu a, ana m alaghachikwuru onye ahụ zitere m. Ma ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti unu jụrụ m, ‘Olee ebe ị na-aga?’ Ma nʼihi na m gwara unu ihe ndị a, obi unu ejupụtala na mwute. Nʼagbanyeghị nke a, aga m agwa unu eziokwu, ọ bụ maka ọdịmma unu ka m ji ala. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye Ndụmọdụ ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eme ka ụwa mata ezughị oke nke nghọta ya banyere mmehie, na ezi omume na ikpe, maka mmehie nʼihi na ha ekwenyeghị na m; ma gbasara ezi omume, nʼihi na ana m alakwuru , ebe unu na-apụghị ịhụ m ọzọ, maka ikpe, nʼihi na e kpeela onyeisi ụwa a ikpe. “Enwere m ọtụtụ ihe ọzọ m ga-agwa unu. Ma ugbu a, unu agaghị anabatalị ha. Ma mgbe Mmụọ eziokwu ahụ bịara, ọ ga-eduba unu nʼeziokwu niile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya, kama ọ bụ ihe niile ọ nụrụ ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe niile gaje ịbịa. Ọ ga-enye m otuto, nʼihi na ọ ga-esite nʼaka m nata ihe ọ ga-akọrọ unu. Ihe niile nwere bụ nke m. Ọ bụ ya mere m ji sị, na ọ ga-ewere site nʼihe bụ nkem, kọwara ya unu. “Ọ fọdụrụ nwantakịrị oge unu agaghị ahụkwa m. Ma mgbe nwantịntị oge gasịkwara, unu ga-ahụkwa m anya ọzọ.” Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya sịrịtara onwe ha, “Gịnị ka o bu nʼuche mgbe ọ na-asị, ‘Nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma mgbe nwa oge gasịkwara unu ga-ahụkwa m,’ na ‘Nʼihi na ana m alakwuru ’?” Ha na-asị, “Gịnị ka okwu a pụtara bụ ‘nwa oge nta’? Anyị aghọtaghị ihe ọ na-ekwu.” Jisọs matara na ha chọrọ ịjụ ya ihe banyere nke a, nʼihi ya ọ sịrị ha, “Unu na-ajụrịta onwe unu ihe okwu m pụtara mgbe m sịrị, ‘Na nwa oge nta unu agaghị ahụkwa m ọzọ, ma nwa mgbe nta unu ga-ahụkwa m’? Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, unu ga-akwa akwa ma nwekwa obi mwute, ma ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma iru ụjụ unu ga-aghọrọ unu ọṅụ. Mgbe ime na-eme nwanyị, ọ na-anọ nʼọnọdụ ihe mgbu. Mgbe ọ mụsịrị nwa ya, ọ dịghị echetakwa ihe mgbu ya ọzọ. Nʼihi ọṅụ na a mụpụtala nwa nʼelu ụwa. Unu nọ nʼọnọdụ iru ụjụ ugbu a, ma aga m ahụ unu anya ọzọ, obi unu ga-ejupụta nʼọṅụ. Mmadụ ọbụla apụghịkwa ịnapụ unu ọṅụ unu. Ma nʼụbọchị ahụ, unu agakwaghị arịọ m ihe ọbụla. Nʼezie, nʼezie, agwa m unu, ihe ọbụla unu ga-arịọ m nʼaha m, ọ ga-enye unu. Ruo ugbu a, ọ dịbeghị ihe unu rịọrọ nʼaha m. Rịọọnụ, unu ga-arịọta, ka ọṅụ unu zukwaa oke. “Eji m ilu na-agwa unu okwu ugbu a, ma oge na-abịa mgbe m na-agaghị ejikwa ilu gwa unu okwu. Mgbe ahụ ka m ga-akọwara unu niile ihe banyere m nʼụzọ unu ga-aghọta ya. Nʼụbọchị ahụ, unu ga-arịọ ihe nʼaha m. Asịghị m unu na m ga-arịọ ihe nʼihi unu. Nʼihi na m nʼonwe ya hụrụ unu nʼanya, nʼihi na unu hụrụ m nʼanya kwerekwa na m si nʼebe nọ bịa. Esi m nʼebe nọ pụta, bịa nʼime ụwa. Ana m ahapụkwa ụwa ịlaghachikwuru .” Ndị na-eso ụzọ ya sịrị, “Lee, ugbu a ka okwu gị doro anya. Ọ bụkwaghị ilu ka i na-atụ. Ugbu a ka o doro anyị anya na ị maara ihe niile. Ọ bakwaghị uru ka onye ọbụla jụọ gị ihe ọbụla. Nʼihi nke a, anyị kwere na i si nʼebe nọ bịa.” Jisọs zara ha, “Unu ekwerela ugbu a? Lee! Oge na-abịa, oge ahụ eruola, mgbe unu ga-agbasacha. Onye ọbụla nʼụlọ nke ya. Mgbe ahụ, unu ga-ahapụ naanị m, ma ọ bụghị naanị m nọ nʼihi na mụ na m nọ. “Agwala m unu ihe ndị a niile ka unu nwee udo nʼime m. Nʼime ụwa, unu ga-enwe nsogbu. Ma ka obi sie unu ike, nʼihi na emeriela m ụwa.”

Every verse in John 16

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00