John 20:5

“O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime.”

John 20:5 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 5 of 31 in John chapter 20 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

1 thread runs through this chapter

John 20 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. O ji ọsọ bịakwute ọn na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye ọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” Ya mere na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. Ya mere ọn , onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. (Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha. Ma guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ ọs. Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?” Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla m, amaghị m ebe ha bujere ya.” Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka ọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ ọs. Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?” o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” Jisọs sịrị ya, “Meri.” Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “ nkuzi.)” Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru m na unu. Chineke m na unu.’ ” Meri gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile. Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị . Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla anyị. Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” Ma Tọmọs (onye a na-akpọ ọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe ọs bịara. Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla anyị!” Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na m!” Ma ọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ ọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na ọs bụ ịst, Ọkpara . Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

Every verse in John 20

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00