Joshua 23:2
“Ya mere, Joshua kpọrọ ndị Izrel niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ.”
Joshua 23:2 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 2 of 16 in Joshua chapter 23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Joshua 23 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ma mgbe ọtụtụ oge gasịrị, site nʼoge anyị mere ka nwee ezumike nʼebe ndị iro gbara ha okirikiri nọ, aghọọla agadi, gbaa ọtụtụ afọ. Ya mere, kpọrọ ndị niile, ndị okenye ha, ndị ndu ha, ndị odozi okwu ha na ndịisi ha, sị ha, “Emeela m agadi gbaakwa ọtụtụ afọ. Unu onwe unu ejirila anya unu hụ ihe niile anyị unu mere mba ndị a niile, nʼihi unu. Ọ lụụrụ unu ọgụ, nyere unu aka imeri ndị iro unu. Unu hụrụ na ekekwarala m unu ala mba ahụ niile nke fọdụrụnụ ka ha bụrụ ihe nketa ebo unu, site na Jọ, tinyekwara mba niile ndị ahụ m kpochapụrụ nʼakụkụ osimiri ịa dị na mpaghara ọdịda anyanwụ. Onyenwe anyị bụ unu ga-akwapụ ndị bi nʼime ha nʼihi unu. Ọ ga-achụpụ ha nʼihu unu, mee ka unu nweta ala ha, dịka anyị unu kwere unu nkwa. “Ya mere, dịnụ ike, lezienụ anya idebezu na irube isi nʼihe niile e dere nʼụkwọ . Unu esila nʼime ya wezuga onwe unu nʼụzọ ọbụla. Lezienụ anya ka unu na mba ndị a fọdụrụ nʼala a ghara inwe mmekọ ọbụla. Unu akpọtụkwala chi ha niile aha. Unu aṅụkwala iyi nʼaha ha, maọbụ fee ha ofufe, maọbụ kpọọ isiala nye ha. Kama raparanụ nʼahụ anyị unu dịka unu mere ruo taa. “Onyenwe anyị achụpụla mba dị ukwuu na mba siri ike site nʼebe unu nọ. O nwekwaghị otu mba nʼime ha o kwere ka ha merie unu. Otu nwoke nʼime unu achụọla puku ndị ikom ndị iro unu ọsọ. Nʼihi na anyị unu alụọlara unu ọgụ, dịka ya onwe ya kwere nkwa. Nʼihi ya, lezienụ onwe unu anya nke ọma ka unu hụ anyị unu nʼanya. “Ma ọ bụrụ na unu alaghachi azụ, ma kwere ka e jikọọ unu na mba ndị a fọdụrụ nʼetiti unu. Ọ bụrụ na unu na ha ebido ịlụrịta di na nwunye, na-emekọrịta ihe ọnụ, maranụ nke ọma, na anyị unu agaghị achụpụrụ unu mba ndị a site nʼala unu. Kama ha ga-abụrụ unu igbudu na ọnya. Ha ga-abụkwara unu apịpịa nʼakụkụ unu, na ogwu nʼanya unu, ruo mgbe unu ga-ala nʼiyi nʼezi ala a, nke anyị unu nyere unu. “Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m ga-agbaso ụzọ ahụ ndị niile bi nʼụwa na-aghaghị ịgbaso. Unu niile maara nʼime obi unu na nʼime mkpụrụobi unu na o nweghị otu nʼime nkwa ọma anyị unu kwere nye unu nke na-emezughị. E mezuola nkwa ndị a niile; o nweghị nke ọbụla a na-emezughị. Ma dịka ezi nkwa niile anyị unu kwere si bụrụ ihe e mezuru emezu, otu a kwa ka anyị ga-esi mee ka ihe ọjọọ niile ọ bara mba ya mezuo nʼisi unu, tutu ruo mgbe o mere ka unu laa nʼiyi nʼezi ala ahụ ọ na-enye unu. Ọ bụrụ na unu emebie ọgbụgba ndụ anyị unu, nke o nyere unu iwu idebe, tụgharịa malite ịgbaso na ife chi ndị ọzọ na ịkpọ isiala nye ha, iwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, unu ga-alakwa nʼiyi ngwangwa nʼala ọma ahụ o nyere unu.”
Every verse in Joshua 23
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.