Judges 20:34
“Iri puku ndị ikom Izrel ahụ zuruoke gara na ncherita ihu Gibea busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị Benjamin amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha.”
Judges 20:34 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 34 of 48 in Judges chapter 20 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Judges 20 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ahụ, ndị niile ndị si nʼala ruo Bịasheba, tinyere ndị si nʼala , pụtara dịka otu mmadụ, bịa zukọọ nʼihu anyị na . Ndị ndu ebo niile weere ọnọdụ na nzukọ nke ndị , ọnụọgụgụ ha bụ narị puku ndị agha anọ, ndị na-ebu mma agha. Mgbe na-adịghị anya, nzukọ ụmụ niile na ruru ụmụ ntị. Mgbe ahụ, ndịisi niile kpọrọ nwoke ahụ e gburu iko ya nwanyị sị ya, “Kọọrọ anyị otu ihe ọjọọ a si mee.” Ya mere, onye ị ahụ, di nwanyị ahụ e gburu kwuru sị, “Mụ na iko m nwanyị bịaruru obodo , obodo nta ndị , kwụsị nʼebe ahụ ịnọ ọnọdụ abalị. Nʼoge abalị, ndị ikom bịara gba ụlọ anyị nọ nʼime ya gburugburu. Nzube ha bụ igbu m. Ma ha jidere iko m nwanyị, dinakwuru ya nʼike, tutu ruo mgbe ọ nwụrụ. Nʼihi ya, abọwasịrị m ahụ iko m nwanyị ụzọ iri na abụọ, zisa ya nʼakụkụ niile nke ihe nketa ndị niile nʼihi na ndị ikom ndị ahụ emeela ihe ọjọọ na ihe ihere nʼala . Ugbu a, unu ụmụ niile, unu onwe unu tụleenụ okwu a, nyekwanụ ndụmọdụ ihe a ga-eme ebe a.” Ndị mmadụ niile kulitere dịka otu onye, sị, “O nweghị onye ọbụla ga-ala na be ya. O nweghị onye ọbụla ga-esi nʼebe a laa nʼụlọ ya. Ma ugbu a, nke a bụ ihe anyị ga-eme ndị . Anyị ga-efe nza chọpụta ndị ga-aga lụso ndị agha. Anyị ga-esite nʼebo niile nke họpụta mmadụ iri site na narị mmadụ, họpụta narị mmadụ site na puku mmadụ, họpụtakwa puku mmadụ site nʼiri puku mmadụ, ka ha hụ maka iwetara ndị agha ihe oriri. Mgbe ndị agha a rutere dị na , anyị pụrụ ịkwụghachi ha ụgwọ ruru ha dịka ihe ihere niile ha mere nʼala si dị.” Ya mere, ndị niile jikọtara onwe ha ọnụ ibu agha ahụ dịka otu onye, megide obodo ahụ. Ndị ebo zipụrụ ndị ozi ka ha gazuo ebo niile, sị ha, “Gịnị bụ ihe ọjọọ nke a jọgburu onwe ya emere nʼetiti unu? Ugbu a, kpọpụtara anyị ndị ikom ọjọọ dị a si nʼobodo ka anyị gbuo ha. Anyị ga-esikwa otu a hichapụ ihe ọjọọ a site nʼ.” Ma ụmụ egeghị ndị ibe ha ntị. Ha sitere nʼobodo ha dị iche iche zukọtaa na maka ibuso ndị agha. Nʼụbọchị ahụ, ndị sitere nʼobodo ha dị iche iche kpọkọta iri puku ndị ikom abụọ na puku isii bụ ndị na-amịpụta mma agha, tinyere narị ndị ikom asaa ahụ zuruoke site na ndị bi na . Nʼime ndị agha ndị a, e nwere narị ndị agha asaa, ndị a maara nke ọma dịka ndị na-agbata ụta nke ọma. Ha bụ ndị na-eme aka ekpe, onye ọbụla nʼime ha nwere ike iji okwute mata otu agịrị isi, ghara ịmahie ya. Ma ọnụọgụgụ ndị agha ụmụ , ma ọ bụrụ na e wezuga ụmụ , dị narị puku anọ. Ma tupu agha ahụ ebido, ndị agha buru ụzọ gaa ịjụta ase. Ha jụrụ ya sị, “Olee ebo ga-edu anyị ibuso ndị agha agha?” anyị zara sị ha na ọ bụ ga-ebu ụzọ. Nʼihi nke a, nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị agha ụmụ niile buliri ihe agha ha pụọ, maa ụlọ ikwu ha nso nso . Emesịa, ndị pụrụ izute ndị , doo onwe ha nʼusoro ibu agha na . Ma nʼụbọchị ahụ, ndị si nupụta nʼigwe gbuo ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ na puku abụọ. Ndị agha gbarịtara onwe ha ume, ma werekwa ọnọdụ ibu agha dịka ha mere nʼụbọchị mbụ. Ndị agha kwara akwa nke ukwuu nʼụbọchị ahụ nʼihu anyị site nʼụtụtụ ruo anyasị. Ha jụrụ anyị ase ọzọ sị ya, “Anyị ga-aga nʼihu ịlụso ụmụnna anyị ndị ọgụ?” anyị zara sị ha, “Gaanụ ga lụso ha agha.” Nʼihi nke a, ndị jeghachikwara ọzọ ibuso ụmụ agha nʼụbọchị nke abụọ ya. Nʼoge a kwa, ndị agha si nʼobodo pụta ibuso ha agha. Ha gburu ndị agha ọnụọgụgụ ha dị puku iri na asatọ. Ndị a niile bụkwa ndị ji mma agha ebu agha. Mgbe ahụ, ndị niile gara , nọdụ nʼebe ahụ, kwaa akwa nʼihu anyị Ha erighị nri ọbụla nʼụbọchị ahụ site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị. Ha chere nʼihu anyị onyinye aja udo, ma chụọkwa aja nsure ọkụ. Ndị jụrụ ase site nʼaka anyị. (Nʼoge ndị ahụ, igbe ọgbụgba ndụ dị nʼebe ahụ. Finehaz nwa , nwa nwa Erọn na-eje ozi nchụaja nʼebe ahụ.) Ụmụ jụrụ anyị ase sị ya, “Ọ bụ anyị gaakwa ọzọ ibuso ụmụnna anyị ndị agha, ka ị sị anyị agala?” anyị zara sị ha, “Gaanụ, nʼihi na aga m ahụ na unu meriri ndị agha echi.” Nʼihi nke a, ụmụ kewapụtara ndị zoro onwe ha nʼọhịa, gburugburu obodo . Nʼụbọchị nke atọ ya, ha pụrụ gaakwa izute ndị , ha were ọnọdụ ha imegide ndị dịka ha mere nʼoge gara aga. Ndị pụtara izute ha, e mere ka ha site nʼobodo pụọ. Ha malitere igbu ndị dịka ha mere na mbụ, nke mere na ndị ikom iri atọ dara nwụọ nʼọhịa ma na ụzọ, otu nke gawara obodo , na nke ọzọ gawara obodo . Ya mere, mgbe ndị agha malitere na-asị, “Lee, anyị emeriela ha dịka anyị mere na mbụ,” ndị nọ na-ekwu sị, “Ka anyị gbara ọsọ na-aga ruo mgbe ha ga-anọ ebe dị anya site nʼobodo ha.” Ndị ikom niile nke sitere nʼọnọdụ ha bilie, doo onwe ha nʼusoro na -, ndị ndị zoro onwe ha wapụtara site nʼọnọdụ ha nʼọdịda anyanwụ nke , si nʼọhịa mapụta. Iri puku ndị ikom ahụ zuruoke gara na ncherita ihu busoo ya agha. Agha ahụ dị ike nke ukwuu nke mere na ndị amataghị na oke mbibi na-abịakwasị ha. Onyenwe anyị meriri ndị nʼihu , nʼụbọchị ahụ; ndị gburu ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku abụọ, na puku ise, na otu narị. Ha niile bụkwa ndị na-eji mma agha aga agha. Mgbe ahụ, ndị nʼonwe ha, hụrụ na e emeriela ha. Ugbu a, ndị ikom nyere ndị ohere ịga nʼihu, nʼihi na ha dabere na ndị ha zoro nʼọhịa nʼakụkụ . Ndị ahụ zoro nʼọhịa gbapụtara ọsịịsọ gbaba nʼobodo , kesaa onwe ha, were mma agha gbuchapụ ndị niile nọ nʼobodo ahụ. Ndị na ndị zoro nʼọhịa kwekọtara na ha ga-eme ka anwụrụ ọkụ dị ukwuu na-ala elu elu site nʼobodo ahụ, ma mgbe ahụ, ndị ga-ebido ịbọ ọbọ ogbugbu egburu ha. Ndị egbuolarị iri ndị atọ, nʼihi ya ha sịrị, “Anyị na-emeri ha dịka anyị mere nʼagha mbụ.” Ma mgbe anwụrụ ọkụ malitere ịla elu site nʼobodo ahụ, ndị lere anya nʼazụ hụ ka anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼakụkụ niile nke obodo ahụ. Mgbe ahụ, ndị bidoro igbu ha, oke egwu jidere ndị nʼihi na ha ghọtara na ịla nʼiyi adakwasịla ha. Ha si nʼihu ndị gbaa ọsọ, gbaga nʼụzọ gawara nʼọzara, ma ha enweghị ike ịgbanarị agha ahụ. Ndị si nʼobodo gbapụta gburu ha nʼebe ahụ. Ha gbara ndị gburugburu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ , gbuo ọtụtụ nʼime ha nʼebe ahụ. Ndị agha e gburu nʼagha ụbọchị ahụ dị puku iri na asatọ. Mgbe ha chigharịrị na-agbala nʼụzọ ọzara na-aga nʼebe oke nkume ọn dị, ndị gburu puku ndị agha ise nʼime ha nʼụzọ ahụ. Ha chụgidere ndị ọsọ ruo , gbukwaa puku ndị agha ha abụọ. Ya mere, ndị e gburu nʼagha nʼụbọchị ahụ dị iri puku abụọ, na ise. Ndị a bụ ndị agha mma agha, dike na dimkpa nʼagha. Naanị narị ndị agha isii nʼime ha tụgharịrị gbapụ ọsọ gbalaga nʼọzara, nʼebe nkume ọn dị. Ha nọgidere nʼebe ahụ ọnwa anọ. Mgbe ahụ, ndị agha hapụrụ ha, laghachi azụ, gaa nʼobodo ndị niile gbuo ndị niile nọ nʼime ha, igwe anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ niile dị nʼime ha. Obodo niile ha ruru, ha kpọrọ ha ọkụ.
Every verse in Judges 20
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.