Judges 21:8

“Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo Izrel na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu Onyenwe anyị na Mizpa?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na Jebesh Gilead bịa.”

Judges 21:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 8 of 25 in Judges chapter 21 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Judges 21 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Mgbe ndị ikom niile zukọtara na , ha ṅụrụ iyi sị, “O nweghị onye ọbụla nʼime anyị ga-ekwe ka nwoke ọbụla si nʼebo lụọ ụmụ anyị ndị inyom.” Ndị niile gara , nọdụ ebe ahụ ruo mgbede nʼihu . Ha welitere olu bee akwa dara ụda. “Ha sịrị, Onyenwe anyị, Chineke , gịnị mere ihe dị otu a ji dakwasị ? Gịnị mere a ga-eji na-achọ otu ebo achọ taa?” Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri ngwangwa rụọ ebe ịchụ aja. Ha chụrụ aja nsure ọkụ, na aja udo nʼebe ahụ. Emesịa, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “O nwere ebo na-enweghị onye nọchiri anya ha nʼihu anyị anyị mgbe anyị zukọrọ na ?” Nʼihi na ha ṅụrụ iyi kwuo na onye ọbụla jụrụ ịbịa nʼihu anyị na aghaghị ịnwụ. Ma oke iru ụjụ dị nʼala dum nʼihi ihe dakwasịrị ụmụnna ha, bụ ndị . Ha niile kwuru sị, “Taa, otu ebo alaala nʼiyi, e kpochapụla ya. Olee otu anyị ga-esi nwetara ndị fọdụrụ nwunye ha ga-alụ ebe anyị ṅụrụ iyi site nʼaha anyị na anyị agaghị enye ha ụmụ anyị ndị inyom?” Mgbe ahụ, ha jụrụ ajụjụ sị, “O nwere ebo na-esoghị anyị zukọta mgbe anyị zukọtara nʼihu anyị na ?” Ha chọpụtara na o nweghị onye ọbụla si na bịa. Nʼihi na mgbe ha gụrụ ndị zukọrọ ọnụ, ha chọpụtara na o nweghị ndị si bịa. Ya mere, nzukọ ahụ zipụrụ puku ndị agha iri na abụọ, ndị dị ike nʼetiti ha, ka ha gaa jiri mma agha gbuchapụ mmadụ niile bi na , ndị nwoke, na ndị nwanyị, na ụmụntakịrị. Nke a bụkwa ihe unu ga-eme, “Gbuonụ ndị ikom niile na ụmụ nwanyị niile matarala nwoke.” Ọnụọgụgụ ụmụ agbọghọ na-amabeghị nwoke ha chọtara na dị narị anọ. Ndị agha ahụ kpọtara ha na ịlo, nʼime , ebe ndị mara ụlọ ikwu ha. Emesịa, ha zigara ụfọdụ mmadụ ka ha jekwuru ndị agha na nkume ọn maka ime udo. Mgbe ndị lọghachiri, e dunyere ha narị ndị inyom anọ, ndị , bụ ndị e mere ka ha dị ndụ. Ma ụmụ agbọghọ ndị a ezughị ọnụọgụgụ ha niile. Oge ahụ bụ nnọọ oge iru ụjụ dị ukwuu nʼala maka ọnọdụ ndị , nʼihi na anyị emeela ka ebo ndị hapụ izu ezu. Ndị okenye jụrịtara onwe ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme ịlụtara ụmụnna anyị nwunye ebe ọ bụ na ụmụ agbọghọ ndị anwụchaala? Ndị fọdụrụ ndụ aghaghị inweta ndị ga-anọchi anya ha,” bụ ihe ha kwuru, “ka otu nʼime ebo ghara ịbụ ndị e kpochapụrụ ekpochapụ. Ma anyị enweghị ike inye ha ndị nwunye site nʼụmụ anyị ndị inyom, nʼihi na ụmụ ṅụrụ iyi sị, ‘Onye abụrụ ọnụ ka ọ bụ, bụ onye ọbụla nke nyere onye nwunye.’ Ma lee, e nwere mmemme anyị a na-eme afọ niile na ịlo, nʼakụkụ ugwu , na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke ụzọ ahụ sitere gaa , na nʼakụkụ ndịda .” Ya mere, ha gwara ndị ikom , bụ ndị chọrọ nwunye okwu sị ha, “Gaanụ zoo onwe unu nʼubi vaịnị dị nʼagbata ụzọ ahụ, ma na-elepụ anya. Mgbe ụmụ agbọghọ ịlo ga-apụta ite egwu ha, sitenụ nʼubi vaịnị gbapụtanụ jide ha, ka onye ọbụla nʼime unu jide otu nwaagbọghọ kpụrụ ya laa nʼala , ka ha bụrụ nwunye unu. Ọ bụrụ na nna ha maọbụ ụmụnne ha abịakwute anyị ịjụ ajụjụ banyere ha, anyị ga-agwa ha okwu sị, ‘Biko, gosinụ anyị amara, site nʼịhapụ ha ka ha lụọ ụmụ agbọghọ ahụ, nʼihi na anyị achọtaghị ụmụ agbọghọ ga-ezuru ha niile mgbe anyị gburu ndị niile bi na . O nwekwaghị ụzọ ọzọ unu gaara esi nye ha ụmụ unu ndị nwanyị ghara ịbụ ndị ikpe mara.’ ” Ya mere, ndị mere dịka ndụmọdụ e nyere ha si dị. Onye ọbụla nʼime ha jidere otu nwaagbọghọ nʼike mgbe ha na-ete egwu nʼoge mmemme ahụ ka ọ bụrụ nwunye ya. Ha lara nʼihe nketa ha, wughachi obodo ha, biri nʼime ya. Mgbe ihe ndị a gasịrị, ụmụ laghachiri nʼobodo ha, nʼotu nʼotu, onye ọbụla kwa laghachiri nʼebo ya, nʼikwu ya, nʼihe nketa nke aka ya. Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.

Every verse in Judges 21

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00