Judges 9:43
“Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha.”
Judges 9:43 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 43 of 57 in Judges chapter 9 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Judges 9 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Otu ụbọchị, Abimelek nwa - jekwuuru ụmụnne nne ya ndị ikom bi na , na ndị ikwu nne ya niile sị ha, “Jekwurunụ ndị jụọ ha, ‘Kedụ nke kara unu mma: ọ bụ ka ụmụ iri ndị ikom asaa - mụrụ chịa unu, ka ọ bụ ka otu onye chịa unu?’ ụ na mụ na unu bụ otu anụ ahụ na ọbara.” Mgbe ụmụnne nne ya ndị ikom gwara ndị ihe kwuru, ha kwekọrịtara iso ya nʼihi na ha kwuru sị, “Nwanne anyị ka ọ bụ.” Ha sitere nʼụlọ arụsị - nye ya iri ọlaedo asaa. Abimelek ji ego ndị a goo ndị efulefu jọgburu onwe ha, ndị na-akpọghị ndụ ha ihe ọbụla, ndị kwenyere ma gbasoro ya. Ọ gara nʼụlọ nna ya nʼobodo . Nʼebe ahụ, o gburu iri ndị ikom asaa ahụ bụ ụmụnna ya nʼelu otu nkume. Kama , bụ ọdụdụ nwa -, zoro onwe ya gbapụ. Mgbe ahụ, ndị na ndị kpọrọ nzukọ nʼokpuru osisi ukwu dị nʼobodo ahụ nʼakụkụ ogidi e guzobere ọtọ na . Nʼebe ahụ ka ha nọ mee eze . Mgbe nụrụ ya, o rigooro nʼugwu guzo nʼebe ahụ tikuo ndị niile mkpu si ha, “Geenụ m ntị ka nwe ike gee unu ntị. Otu mgbe, osisi niile pụrụ ije ịga tee otu onye mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị ha. Ha sịrị osisi oliv, ‘Bụrụ eze anyị.’ “Ma osisi oliv jụrụ ha ajụjụ sị, ‘O kwesiri ka m hapụ iwepụta mmanụ m a nke a na-esite na ya sọpụrụ na ụmụ mmadụ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi fiig ka ọ bụrụ eze ha. “Ma osisi fiig sịrị, ‘Ọ bụrụ na m ekwere na m ga-abụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi na-atọ ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ “Ọzọkwa, ha rịọrọ osisi vaịnị ma ọ ga-ekwenye ịbụ eze ha. “Ma osisi vaịnị ahụ zara sị ha, ‘Ọ bụrụ na m ekwere ịbụ eze unu, ọ pụtara na m ga-akwụsị ịmịpụta mkpụrụ osisi e ji eme mmanya nke na-enye na ụmụ mmadụ obi ụtọ, nọọ ọnọdụ ifegharị alaka m nʼelu osisi ndị ọzọ?’ “Nʼikpeazụ, osisi niile jekwuuru ogwu ọhịa, ‘Bịa ka ị bụrụ eze anyị.’ “Ogwu ọhịa sịrị osisi niile, ‘Ọ bụrụ nʼezie na unu chọrọ ite m mmanụ ka m bụrụ eze unu, bịanụ zere ndụ nʼokpuru ndo m kpọkwanụ isiala nye m. Ọ bụrụ na unu ajụ ime nke a, ka ọkụ si nʼogwu ọhịa pụta rechapụ sida niile dị na ọn!’ “Ugbu a, omume unu o ziri ezi ma sitekwa nʼezi obi na unu mere eze? Mmeso unu mesoro - na ezinaụlọ ya o ziri ezi? Unu omesoro ya dịka o kwesiri ya? Chetakwanụ na nna m lụrụ ọgụ maka unu, kpọọ ndụ ya ihe efu, nʼihi ịnapụta unu site nʼaka ndị . Ma taa, unu enupula isi megide nna m na ezinaụlọ ya, gbuo iri ụmụ ndị ikom asaa ya nʼelu otu nkume, meekwa nwa ya nwoke nke ohu nwanyị ya mụtara eze ga-achị ndị niile, nʼihi na ọ bụ onye nke unu. Nke a o gosiri na omume unu ziri ezi, sitekwa nʼobi ọcha nʼebe - na ezinaụlọ ya nọ taa? Ọ bụrụ na unu mere otu a, ka bụrụ onye ga-ewetara unu ọṅụ ka unu bụkwara ndị ga-ewetara ya ọṅụ. Ma ọ bụrụ na omume unu ezighị ezi, ka ọkụ si nʼ pụta repịa unu, ndị na , ka ọkụ sitekwa nʼebe unu bụ ndị na , pụta repịa .” Emesịa, Jotam gbapụrụ, gbaga Bịa, biri nʼebe ahụ nʼihi egwu bụ nwanna ya. Mgbe ọ gasịrị afọ atọ bidoro ịchị , Chineke kpaliri iro dị ukwuu nʼetiti na ndị nwe obodo , nke bụ na ha mere omume ihu abụọ megide . Chineke mere nke a nʼihi na ọ chọrọ ịbọta ọbọ ọbara iri ụmụ - asaa ahụ nʼisi , na ndị ahụ bụ ndị nyeere ya aka gbuo ụmụnne ya. Nʼọnọdụ imegide ya, ndị doro ndị ikom ụfọdụ nʼelu ugwu niile, ndị zoro nʼebe ahụ na-apụnara ndị ọbụla na-esite nʼebe ahụ agafe ihe ha nwere. E mere ka mata na ihe dị otu a na-eme. Nʼoge ahụ, Gaal, nwa , chịkọtara ụmụnne ya ndị ikom gaa biri na , ndị nwere ntụkwasị obi nʼebe ọ nọ. Mgbe ha pụrụ baa nʼubi, chịkọta mkpụrụ vaịnị, zọchaa ha, ha mere mmemme nʼụlọ chi ha. Mgbe ha nọ na-eri na-aṅụ, ha kọchara . Mgbe ahụ, Gaal nwa sịrị, “Onye bụ ? Gịnị mere na anyị bụ ndị ga-eji nọrọ nʼokpuru ya? Ọ bụghị nwa -? Ọ bụkwaghị bụ onye na-esote ya? Ọ bụ ka anyị fee ezinaụlọ ọ, nna ofufe. Ọ bụ maka gịnị ka anyị ga-eji fee ofufe? A sịkwarị na ndị a nọ nʼokpuru ọchịchị m, mgbe ahụ, m ga-ewezuga . Aga m asị ya, ‘Kpọpụta ndị agha gị niile.’ ” Mgbe onye na-achị obodo ahụ nụrụ ihe nwa kwuru, o were nnọọ oke iwe. O zigara ndị ozi na nzuzo ka ha sị ya, “Gaal nwa na ndị ikwu ya abịala obodo . Ha akpaliela obi ndị obodo a niile ka ha megide gị. Ugbu a, gị na ndị agha gị, bịanụ nʼabalị zoo onwe unu nʼọhịa. Nʼụtụtụ, mgbe anwụ wara, busonụ obodo a agha. Mgbe na ndị ya pụtara ịlụso gị agha, mee ha ihe dị gị mma.” Ya mere, Abimelek na ndị agha ya dị nʼotu anọ, jiri abalị bilie jeruo zoo onwe ha na nso obodo ahụ. Gaal nwa pụrụ guzo nʼọnụ ama obodo ahụ mgbe na ndị ya sitere nʼebe ha zoro onwe ha pụta. Mgbe hụrụ ha, ọ kpọrọ si ya, “Lee ndị mmadụ sị nʼelu ugwu ndị a na-arịdata.” zara si ya, “Ọ bụghị mmadụ ka ị na-ahụ, kama ọ bụ onyinyo ugwu ka ị na-akpọ mmadụ.” Gaal kwukwara okwu sị, “Lee ndị mmadụ si nʼetiti ala ahụ na-arịdata, ndị ọzọ sikwa nʼakụkụ ụzọ ebe osisi iju ase dị.” Mgbe ahụ, Zebul sịrị ya, “Olee uru ọ bara na ị turu ọnụ, gị onye na-asị, ‘Onye bụ na anyị ga-efe ya ofufe?’ Ọ bụ ndị a abụghị ndị ahụ ị kọchara? Pụkwuru ha gaa lụso ha ọgụ.” Ya mere, Gaal duuru ndị nwe pụọ ịlụso ọgụ. Ma chụụrụ ya ọsọ ruo mbata ọnụ ụzọ ama, ọtụtụ bụkwa ndị egburu ka ha na-agba ọsọ. Abimelek nọgidere nʼ nʼoge ahụ. Ma chụpụrụ na ndị ikwu ya site na . Nʼechi ya, ndị pụtara baa nʼọhịa. E mere ka mara nke a. Nʼihi ya, Abimelek kere ndị agha ya ụzọ atọ. Ha niile zokwara onwe ha nʼọhịa. Mgbe ọ hụrụ ka ndị mmadụ si nʼime obodo ahụ na-apụta, o biliri buso ha agha. Abimelek na usuu ndị agha so ya mapụtara, gbara ọsọ were ọnọdụ nʼọnụ ụzọ ama obodo ahụ. Emesịa, ụzọ abụọ nʼime ụzọ atọ nke ndị agha na-eso ya chere ihu nʼọhịa gbuo ndị ahụ niile nọ nʼebe ahụ. Ụbọchị ahụ niile, Abimelek busoro obodo ahụ agha tutu ruo mgbe o meriri ya, gbuo ndị niile bi nʼime ya. Emesịa, ọ lara obodo ahụ niile nʼiyi, fesaa nnu nʼala ya niile. Mgbe ndị nwe ala nọ nʼụlọ elu nụrụ ihe mere, ha gbabanyere nʼebe e wusiri ike nke ụlọ arụsị El . Mgbe nụrụ na ha ezukọtala nʼebe ahụ, ya na ndị agha ya rigoro ugwu . O ji anyụike gbutuo ụfọdụ ngalaba osisi nke ọ tụkwasịrị nʼubu ya. O nyere ndị agha ya iwu si, “Ngwa, meenụ ihe unu hụrụ na m mere.” Ya mere, ndị agha ya niile gbuturu alaka osisi buru ha soro . Ha tụkọtara alaka osisi ndị a niile nʼakụkụ ebe ahụ e wusiri ike mụnye ha ọkụ ka o regbuo ndị mmadụ nọ nʼime ya. Ya mere, ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ elu , nwoke na nwanyị, ndị ọnụọgụgụ ha ruru otu puku nwụrụ. Ọzọ, Abimelek gara obodo lụso ya agha, merie ya. Ma e nwere nʼime obodo ahụ, otu ụlọ elu e wusiri ike, ebe ndị obodo ahụ niile, nwoke na nwanyị, gbabanyere. Ha kpọchidoro onwe ha ụzọ, rigoro nʼelu ụlọ ahụ. Abimelek gara nʼụlọ elu ahụ ibuso ya agha. Ma mgbe ọ na-abịaru ọnụ ụzọ ama ụlọ elu ahụ isunye ya ọkụ, otu nwanyị tụdara nkume igwe nri nʼisi ya, nke tiwara okpokoro isi ya. Ngwangwa, Abimelek kpọrọ onye na-ebu ihe agha ya sị ya, “Sepụta mma agha gị jiri ya gbuo m, ka ndị mmadụ ghara ị sị banyere m, ‘Ọ bụ nwanyị gburu ya.’ ” Ya mere nwokorobịa ahụ were mma agha ya dụgbuo ya, ọ nwụkwara. Mgbe ndị hụrụ na anwụọla, ha niile lara nʼụlọ ha. Otu a ka si kwụghachi ihe ọjọọ o mere megide nna ya site nʼigbu iri ụmụnna ya asaa. Chineke mekwara ka ndị nata ụgwọ ọrụ ihe ọjọọ ha. Ọbụbụ ọnụ nwa - mezukwara nʼisi ha.
Every verse in Judges 9
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.