Leviticus 16:3

““Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ,”

Leviticus 16:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 3 of 34 in Leviticus chapter 16 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

2 threads run through this chapter

Leviticus 16 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Onyenwe anyị gwara okwu mgbe ụmụ ndị ikom Erọn abụọ ndị ahụ bịara nʼihu anyị nwụsịrị. Onyenwe anyị sịrị , “Gwa nwanne gị nwoke Erọn si ya ka ọ ghara ịbata mgbe ọbụla ọ chọrọ, nʼime ahụ ị Nsọ nke dị nʼazụ akwa mgbochi, nke dị nʼihu ebe mkpuchi mmehie dị nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ma ọ bụghị ya ọ ga-anwụ. Nʼihi na aga m apụta ìhè nʼime igwe ojii dị nʼelu ebe mkpuchi ahụ. “Otu a ka Erọn ga-esi na-abata nʼ ahụ ị Nsọ. Ọ ga-eweta nwa oke ehi nʼihi aja mmehie, na ebule ọ ga-eji chụọ aja nsure ọkụ, Ọ ga-eyikwasị onwe ya uwe mwụda ọcha, ya na uwe ime ahụ dị ọcha. Ọ ga-eke gburugburu ukwu ya ihe ike nʼukwu akwa ọcha, keekwa akwa ọcha nʼisi ya. Ndị a bụ uwe dị nsọ, nʼihi ya, ọ ga-ebu ụzọ saa ahụ tupu ọ na-eyi ha. Ọ ga-esi nʼaka ọgbakọ ụmụ nata mkpi abụọ nʼihi aja mmehie, na otu ebule nʼihi aja nsure ọkụ. “Erọn ga-eweta oke ehi nke ya, maka aja mmehie iji kpuchie mmehie nke ya na nke ezinaụlọ ya. Emesịa, ọ ga-ewere mkpi abụọ ndị ahụ chee ha nʼihu anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. Ọ ga-efe nza nʼisi mkpi abụọ ahụ, ịchọpụta nke dịrị anyị nke ọzọ abụrụ nke ọ ga-ahapụ. Mkpi ahụ nza mara ga-abụ nke anyị, ya ka Erọn ga-egbu dịka aja mmehie. Ma mkpi ahụ nke nza mara dịka ewu na-ewere ọnọdụ iburu mmehie ka a ga-eche na ndụ nʼihu anyị, nʼihi iji ya mee mmemme mkpuchi mmehie, a ga-ahapụ ya ka o buru mmehie niile kpafuo nʼọzara. “Erọn ga-eweta oke ehi maka aja mmehie nke ya onwe ya, iji kpuchie mmehie ya na nke ezinaụlọ ya. Ọ ga-egbu oke ehi ahụ maka aja mmehie nke ya onwe ya. Ọ ga-esite nʼebe ịchụ aja dị nʼihu anyị were ihe ịgụ ọkụ jupụtara nʼicheku ọkụ. Ọ ga-ewerekwa ụda na-esi isi ụtọ ruru mkpoju aka abụọ, were ha bata nʼime akụkụ nke ọzọ nke akwa mgbochi ahụ. Nʼebe ahụ ọ ga-awụnye ụda ndị ahụ na-esi isi ụtọ nʼelu icheku ọkụ ahụ nʼihu anyị, ka anwụrụ ọkụ nke ụda ndị a kpuchie ebe mkpuchi mmehie ahụ dị nʼelu ahụ ka ọ ghara ịnwụ. Ọ ga-ewebatakwa ụfọdụ ọbara oke ehi ahụ, jiri mkpịsịaka ya fesa ya nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ, fesakwa ya ugboro asaa nʼihu ebe mkpuchi mmehie ahụ. “Emesịa, ọ ga-esi nʼebe ahụ pụọ gaa gbuo mkpi aja mmehie ụmụ , werekwa ọbara ya bata nʼazụ akwa mgbochi fesa ya nʼelu ebe mkpuchi mmehie ahụ, na nʼihu ya, dịka o jiri ọbara nwa oke ehi ahụ mee. Nʼụzọ dị otu a, ọ ga-ekpuchiri ahụ ị Nsọ mmehie ya, nʼihi mmehie na nnupu isi ụmụ , ihe ọbụla mmehie ndị ahụ bụ. Ọ ga-achụkwa ụdị aja a nʼihi ụlọ nzute ahụ, nʼihi na ọ dị nʼetiti ebe obibi rụrụ arụ nke ụmụ . O nweghị onye ọbụla ọzọ ga-anọ nʼime ụlọ nzute ahụ, site nʼoge Erọn banyere nʼ ahụ ị Nsọ ịchụ aja mkpuchi mmehie tutu ruo mgbe ọ pụtara, mgbe ọ chụchara aja mkpuchi mmehie maka onwe ya na ezinaụlọ ya, na maka ụmụ niile. “Mgbe o si nʼebe ahụ pụta, gaa nʼebe ịchụ aja dị nʼihu anyị kpuchiere ya mmehie ya. Ọ ga-ewere ụfọdụ ọbara nwa oke ehi ahụ na nke mkpi ahụ tee ya na mpi niile dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Ọ ga-eji mkpịsịaka ya fesa ụfọdụ ọbara ahụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ ugboro asaa iji hichapụ adịghị ọcha ya nʼihi ịrụ arụ ụmụ , na ido ya nsọ. “Mgbe Erọn chụchara aja mkpuchi mmehie maka ahụ ị Nsọ, ụlọ nzute, nakwa ebe ịchụ aja, ọ ga-akpụbata mkpi ahụ e debere ndụ. Ọ ga-ebikwasị aka ya abụọ nʼisi ya, kwupụta ajọ omume na nnupu isi ụmụ niile, mmehie ha niile, bokwasị ha mkpi ahụ nʼisi. Ọ ga-ezipụ mkpi ahụ pụọ nʼime ọzara site nʼaka onye ahụ a họpụtara ime nke a. Nʼụzọ dị otu a, mkpi ahụ ga-eburu mmehie ndị ahụ niile baa nʼebe mmadụ ọbụla na-ebighị. Nwoke ahụ ga-ahapụkwa ya nʼọzara. “Mgbe ahụ, Erọn ga-aba nʼime ụlọ nzute ahụ, yipụ uwe akwa ọcha ndị nchụaja ahụ niile o yi nʼahụ ya tupu ọ banye nʼ ahụ ị Nsọ. Ọ ga-awụsa ha nʼebe ahụ. Ọ ga-eji mmiri saa ahụ ya nʼakụkụ ebe nsọ ahụ, yirikwa uwe efu ya. Mgbe ahụ, ọ ga-apụta bịa chụọ aja nsure ọkụ nke onwe ya, na aja nsure ọkụ nke ndị ahụ, maka ikpuchiri onwe ya, na ikpuchikwara ndị ahụ mmehie ha. Ọ ga-akpọkwa abụba anụ e ji chụọ aja mmehie ahụ ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja. “Mgbe nwoke ahụ kpụgara mkpi ahụ nʼọzara hapụ ya, lọtara, ọ ga- ahụ ya na uwe ya tupu ọ laghachi nʼime obodo. Oke ehi nakwa mkpi maka ịchụ aja mmehie ahụ, bụ nke ewebatara ọbara ha nʼime ahụ ị Nsọ, maka ikpuchi mmehie, ka aghaghị ibupụ nʼazụ ọmụma ụlọ ikwu; a ga-akpọ akpụkpọ ha, anụ ahụ ha na mgbịrị afọ ha niile ọkụ. Onye ga-akpọ ha ọkụ ga- uwe ya, saakwa ahụ ya tupu ọ laghachi nʼime obodo. “Nke a ga-abụrụ unu ụkpụrụ ebighị ebi. Nʼafọ ọbụla, unu ga-ebu ọnụ, hapụ ịrụ ọrụ ọbụla, nʼụbọchị iri nke ọnwa asaa. Iwu a dịrị nwa afọ ala maọbụ onye ọbịa bi nʼetiti unu. Nʼihi na nʼụbọchị a ka a na-ekpuchiri unu mmehie unu, ime ka unu dịrị ọcha. Mgbe ahụ, unu ga-abụ ndị dị ọcha site na mmehie unu niile nʼihu anyị. Ọ bụ ụbọchị izuike nye unu, bụrụkwa ụbọchị unu ga-ebu ọnụ. Iwu a enweghị mgbanwe! Onye nchụaja e tere mmanụ, nke e doro nsọ dịka onye nchụaja ịnọchi nna ya, ga-achụ aja mkpuchi mmehie ndị a, yirikwa akwa ọcha ahụ, bụ uwe nsọ ahụ. Ọ ga-ekpuchiri ahụ ị Nsọ na ụlọ nzute, ebe ịchụ aja na ndị nchụaja, na mkpokọta ndị obodo niile mmehie ha. “Nke a ga-abụ iwu ebighị ebi nye unu. Otu ugboro nʼotu afọ ka a ga-ekpuchi mmehie maka mmehie ndị niile.” E mezuru ihe ndị a niile dịka anyị si nye ya nʼiwu.

Every verse in Leviticus 16

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00