Leviticus 19:36
“Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m Onyenwe anyị Chineke unu, onye si nʼala Ijipt kpọpụta unu.”
Leviticus 19:36 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 36 of 37 in Leviticus chapter 19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Leviticus 19 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Onyenwe anyị gwara okwu sị ya, “Gwa ọgbakọ ụmụ niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ anyị bụ unu, dị nsọ. “ ‘Onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịsọpụrụ nne na nna ya, debekwa iwu m nyere maka ụbọchị izuike, nʼihi na mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Unu akpọla isiala nye arụsị, unu emekwarala onwe unu chi ndị e ji ọla kpụọ. Mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Mgbe unu ga-achụrụ anyị aja udo, soronụ ụkpụrụ m nyere unu chụọ ya, ka m nabata ya. Unu ga-eri ya nʼụbọchị ahụ unu chụrụ ya, maọbụ nʼụbọchị nke na-eso ụbọchị ahụ. Nke ọbụla fọdụrụ ruo ụbọchị nke atọ ka unu ga-esure ọkụ. Ọ bụrụ na unu erie ya nʼụbọchị nke atọ ihe arụ ka ọ bụ. A gaghị anabata aja ọbụla unu ga-eri nʼụbọchị nke atọ. Ikpe ga-ama onye ga-eri ya nʼụbọchị nke atọ nʼihi na o meela ka ihe nsọ anyị bụrụ ihe arụ. A ga-ekewapụ onye ahụ site nʼetiti ndị ya. “ ‘Mgbe unu na-ewe ihe ubi, unu ewechala ihe niile dị nʼakụkụ ubi niile, maọbụ chịkọtachaa irighiri ihe ubi niile fọdụrụ nʼala. A ghọrọchakwala mkpụrụ vaịnị niile mịrị nʼelu vaịnị gị, maọbụ chịkọrọ mkpụrụ ndị dara nʼala. Hapụrụ ha ụmụ ogbenye na ndị ọbịa, nʼihi na mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Unu ezula ohi. “ ‘Unu aghala ụgha. “ ‘Unu aghọgbula ibe unu. “ ‘Unu aṅụla iyi ụgha, si otu a weta nkọcha nye aha anyị unu. Abụ m anyị. “ ‘Unu ejila ike pụnara onye agbataobi unu ihe ya, maọbụ zuru ihe o nwere nʼohi. “ ‘Kwụọnụ onye ọbụla unu goro ọrụ ụgwọ ọrụ ya ọsịịsọ. Unu echela ka chi bọọ tupu unu akwụọ ya ụgwọ ya. “ ‘Akọchala onye ntị chiri, edochikwarala onye ìsì ihe nʼụzọ. Tụọ egwu . Abụ m anyị. “ ‘Unu ekpela ikpe na-ezighị ezi, unu elela mmadụ anya nʼihu mgbe unu na-ekpe ikpe, ma onye unu na-ekpe ikpe ọ bụ ọgaranya maọbụ ogbenye. Kama kpeenụ ikpe kwụ ọtọ. “ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m anyị. “ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya. “ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Unu ga-edebe iwu m niile. “ ‘Unu ejila otu ụdị anụ ụlọ unu na-agba ụdị anụ ụlọ ọzọ dị iche. “ ‘Akụla ụdị mkpụrụ abụọ nʼubi. “ ‘Eyila uwe e ji ụzọ ihe abụọ, dịka ajị anụ na ogho dụọ. “ ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla akpọrọ nwaagbọghọ bụ ohu nwanyị nke a na-agbapụtabeghị, maọbụ nke na-enwerebeghị onwe ya, nke nwoke ọzọ chọrọ ịlụ, mee ka ha abụọ dinakọọ, a ga-ekpe ha abụọ ikpe nʼụlọikpe, ma a gaghị egbu ha, nʼihi na nwanyị ahụ abụghị onye nwe onwe ya. Ma nwoke ahụ ga-eweta aja ikpe ọmụma nye anyị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ọ ga-abụkwa ebule ka ọ ga-eji chụọ aja ahụ. Onye nchụaja ga-eji ebule aja ikpe ọmụma ahụ chụọrọ nwoke ahụ aja mkpuchi mmehie ya nʼihu anyị, nʼihi mmehie o mere. A ga-agbaghakwara ya mmehie ya. “ ‘Mgbe unu batara nʼala ahụ kụọ mkpụrụ osisi dị iche iche, unu erila mkpụrụ osisi ahụ mịrị nʼafọ nke mbụ, ọ bụ ihe rụrụ arụ. Ruo nʼafọ nke atọ, ha bụ ihe rụrụ arụ. Unu agaghị eri ha. Nʼafọ nke anọ, mkpụrụ nke osisi ndị ahụ niile ga-amị dị nsọ. Unu ga-eji ya nye anyị onyinye otuto. Site nʼafọ nke ise, mkpụrụ ọbụla ga-abụ nke unu. Nʼụzọ dị otu a ihe ha ga-amịpụta ga-adị ukwuu. Mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Unu erila anụ ọbụla ọbara dị nʼime ya. “ ‘Unu agbala afa maọbụ jụta mmụọ ase. “ ‘Unu akpụchala agịrị isi dị gburugburu akụkụ isi unu, maọbụ chabie ọnụ ọnụ afụọnụ unu. “ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m anyị. “ ‘Emerụla nwa gị nwanyị site nʼịkwagide ya ka ọ bụrụ akwụna, ka ala unu ghara ijupụta nʼịgba akwụna na ihe ọjọọ dị iche iche. “ ‘Debenụ iwu niile m nyere maka ụbọchị izuike m. Sọpụkwaranụ ebe nsọ m. Abụ m anyị. “ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ anyị unu. “ ‘Bilienụ ọtọ nʼihu okenye, sọpụrụnụ ndị okenye, ma tụọnụ egwu unu. Abụ m anyị. “ ‘Mgbe onye ọbịa soro unu biri nʼala unu, unu emejọla ya. Mesonụ onye ọbịa bi nʼetiti unu mmeso dịka ọ bụ otu nʼime ndị amụrụ nʼala. Hụnụ ha nʼanya dịka unu si hụ onwe unu, nʼihi na o nwere oge unu bụ ọbịa nʼala . Abụ m anyị unu. “ ‘Unu ejila ihe ọtụtụ aghụghọ mgbe unu na-atụ ihe dị ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu, Jirinụ ezi ihe ọtụtụ tụọ ogologo, maọbụ ihe dị arọ, maọbụ ihe dị ukwuu. Abụ m anyị unu, onye si nʼala kpọpụta unu. “ ‘Debenụ ụkpụrụ m niile, na iwu m niile, gbasoonụ ha. Abụ m anyị.’ ”
Every verse in Leviticus 19
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.