Leviticus 24:13
“Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị,”
Leviticus 24:13 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 13 of 23 in Leviticus chapter 24 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Leviticus 24 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Onyenwe anyị gwara sị, “Nye ndị niile iwu ka ha wetara gị mmanụ oliv asụrụ asụ, nke a na-agwaghị ihe, maka itinye nʼiheọkụ ime ka ọkụ oriọna na-enwu mgbe niile. Na mpụta nke akwa mgbochi nke kpuchiri igbe ahụ, nʼime ụlọ nzute, Erọn ga-amụnye oriọna ndị ahụ nʼihu anyị mgbe niile, site nʼuhuruchi ruo nʼụtụtụ. Nke a bụ ụkpụrụ ga-adịgide nye ọgbọ niile dị nʼihu. Ihe ọkụ ọlaedo a nụchara anụcha ndị ahụ dọọ nʼelu ihe ịdọkwasị oriọna, nʼihu anyị ga na-enwu ọkụ mgbe niile. “Were ọka a kwọrọ nke ọma mee ogbe achịcha iri na abụọ. Jiri ihe ruru iko ọka asatọ mee otu ogbe achịcha ọbụla. Doo achịcha ndị a nʼahịrị abụọ nʼelu tebul ahụ e ji ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ, nke dị nʼihu anyị. Ogbe achịcha isii ga-adị nʼotu ahịrị. Nʼogologo ahịrị ọbụla tinye insensi a na-agwaghị ihe, ka ọ bụrụ ihe nọchiri achịcha ndị a dịka onyinye nsure ọkụ nye anyị. A ga-edo achịcha ndị a nʼihu anyị oge niile, ụbọchị izuike niile, nʼọnọdụ ụmụ , dịka ọgbụgba ndụ ebighị ebi. Ọ dịrị Erọn na ụmụ ya ndị ikom, bụ ndị ga-eri ya nʼime nʼebe nsọ ahụ, nʼihi na ọ bụ oke dịkarịsịrị nsọ, site nʼoke ha mgbe niile, nke sitere nʼonyinye nsure ọkụ e chere nye anyị.” Otu nwokorobịa, nke nna ya bụ onye ma nne ya bụ onye , sitere nʼetiti ụmụ pụta. O ruo na nwoke a nne ya bụ onye na otu nʼime ndị ikom malitere ịlụ ọgụ. Mgbe ha na-alụ ọgụ ahụ nwoke ahụ nne ya bụ onye kwuluru ahụ kọchaa ya. Nʼihi ya, a kpọrọ ya ikpe nʼihu . (Aha nne ya bụ , nwa , onye ebo .) Ha tinyere nwoke ahụ nʼụlọ mkpọrọ na-eche ka ha nụ okwu anyị, ịmata ihe ha ga-eme ya. Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara sị, “Kpụrụ onye nkwulu ahụ gaa nʼazụ obodo. Ndị niile nụrụ okwu ahụ o kwuru ga-ebikwasị ya aka ha nʼisi. Mgbe ahụ, ọgbakọ niile ga-eji nkume tugbuo ya. Gwa ụmụ okwu sị ha, ‘Onye ọbụla kọchara ya ga-ebu mmehie ya nʼisi ya. Onye ọbụla kwuluru aha anyị ka a ga-egbu. Mmadụ niile ga-agbakọ jiri nkume tugbuo onye ahụ. Onye ọbụla kwuluru ahụ, maọbụ ọbịa, maọbụ nwa afọ ala, ka a ga-egbu. “ ‘Onye ọbụla gburu mmadụ ka a ga-egbu. Onye gburu anụ ụlọ na-abụghị nke ya, ga-akwụghachi ụgwọ ya. Ndụ ga-alara ndụ. Onye ọbụla merụrụ mmadụ ibe ya ahụ, a ga-emerụkwa onye ahụ ahụ nʼebe o merụrụ ibe ya ahụ. Onye tijiri mmadụ ọkpụkpụ, a ga-etiji ọkpụkpụ nke ya. Anya ga-alara anya, eze ga-alakwara eze. Otu e si merụọ mmadụ ahụ, ka a ga-esi merụọkwa onye merụrụ ya ahụ. Onye ọbụla gburu anụ ụlọ onye ọzọ, ga-akwụ ụgwọ ya. Ma a ga-egbu onye ọbụla gburu mmadụ. Unu ga-enwe otu iwu nke ga-adị nye ndị amụrụ nʼala, dịkwara ndị ọbịa niile. Abụ m anyị unu.’ ” Mgbe ahụ, Mosis gwara ndị okwu, nʼihi ya ha dọkpụụrụ onye nkwulu ahụ pụọ nʼazụ obodo, jiri nkume tugbuo ya nʼebe ahụ, dịka anyị nyere nʼiwu.
Every verse in Leviticus 24
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.