Leviticus 3:12

““ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu Onyenwe anyị,”

Leviticus 3:12 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 12 of 17 in Leviticus chapter 3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Leviticus 3 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

“ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ inye onyinye aja udo, o nwere ike jiri anụ ụlọ si nʼigwe ehi, oke ehi maọbụ nwunye ehi. Ma anụ ahụ ọ ga-ewebata nʼihu anyị aghaghị ịbụ ehi na-enweghị nkwarụ. Onye ahụ wetara ya, ga-ebikwasị aka ya nʼisi anụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Mgbe ahụ ụmụ Erọn ndị ikom, bụ ndị nchụaja, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja. Site nʼonyinye aja udo, ị ga-eweta onyinye nsure ọkụ nye anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya, na abụba niile nke metụtara ha, akụrụ ya abụọ na abụba nke dị nʼelu ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya na abụba kpuchiri umeju ya, nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya. Mgbe ahụ, ụmụ Erọn ga-esunye ha ọkụ nʼelu aja nsure ọkụ a tụkwasịrị nʼosisi e sunyere ọkụ, ọ bụ onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ nye anyị. “ ‘Ọ bụrụ na onyinye aja udo a na-achụrụ anyị bụ site nʼigwe ewu maọbụ atụrụ, ọ ghaghị ịbụ mkpi maọbụ nne ewu na-enweghị ntụpọ. Ọ bụrụ onyinye atụrụ, onye ahụ ga-ewebata ya nʼihu anyị. Ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi atụrụ ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ndị nchụaja, ụmụ Erọn, ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja ahụ. Ị ga-esite nʼonyinye aja udo a, weta onyinye nsure ọkụ nye anyị: abụba ya, na abụba niile dị nʼọdụdụ ya nke a ga-esite nʼakụkụ ọkpụkpụ azụ ya bepụta, na abụba kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya; na abụba niile nke metụtara ha, na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na umeju ya, na abụba kpuchiri ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ nye anyị. “ ‘Ọ bụrụ na onye ọbụla eweta ewu dịka onyinye ọ na-eche nʼihu anyị, ọ ga-ebikwasị aka ya nʼisi ewu ahụ, gbuo ya nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute. Ụmụ Erọn ndị ikom ga-efesa ọbara ya nʼakụkụ niile nke ebe ịchụ aja. Ọ bụ site nʼonyinye nke i wetara ka ị ga-esi chee onyinye nsure ọkụ nye anyị: abụba niile kpuchiri ihe dị nʼime afọ ya na abụba niile metụtara ha, na akụrụ ya abụọ, na abụba kpuchiri ha ruo nʼakụkụ ukwu ya, na ihe kpuchiri umeju ya; nke ọ ga-ewepụ ya na akụrụ ya. Onye nchụaja ga-akpọ ha ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja dịka ihe oriri, onyinye nsure ọkụ, nke na-esi isi ụtọ. Abụba niile bụ nke anyị. “ ‘Iwu ndị a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Unu ga-edebezu ya nʼebe ọbụla unu bi. Unu agaghị eri abụba maọbụ ọbara ọbụla.’ ”

Every verse in Leviticus 3

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00