Luke 4:23

“Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ Sikwa m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na Kapanọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ””

Luke 4:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 23 of 44 in Luke chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Luke 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Jisọs, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, sitere na Jọ lọta. Mmụọ nsọ duuru ya baa nʼọzara. Ebe ahụ ka ekwensu nwara ya ọnwụnwa iri ụbọchị anọ. Nʼụbọchị ndị ahụ niile o righị nri ọbụla. Nʼikpeazụ agụụ gụrụ ya. Ekwensu sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara , gwa nkume a ka ọ ghọọ achịcha.” Jisọs zara ya sị, “E dere ya, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ.’” Ekwensu duuru ya rigoo nʼebe dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa, nʼotu ntabi anya. Ọ gwara ya sị, “M ga-enye gị ikike niile ndị a na ebube ha. Ọ bụ m ka e nyere ha, e nwere m ike inye ha onye ọbụla m chọrọ inye ha. Ya mere, ọ bụrụ na ị kpọọ isiala nye m, ha ga-abụ nke gị.” Jisọs zara ya sị, “E deela ya: ‘Ị ga-akpọ isiala nye anyị gị, naanị ya ka ị ga-efekwa.’” Ekwensu duuru ya gaa , mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu ahụ. Ọ sịrị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara , si nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ichekwa gị nke ọma; ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” Jisọs zara ya sị, “E kwuola ya, Anwala anyị gị ọnwụnwa.” Mgbe ekwensu nwasịrị ya ọnwụnwa ndị a niile, ọ hapụrụ ya ruo mgbe ohere ọzọ dapụtara. Jisọs lọghachiri na nʼike nke Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ obodo niile. O ziri ihe nʼọtụtụ ụlọ ekpere ha, mmadụ niile na-etokwa ya. Mgbe o rutere ebe ọ nọrọ too, nʼụbọchị izuike, ọ gara nʼụlọ ekpere dị ka ọ dị mbụ eme. O guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ. E nyere ya akwụkwọ nke onye amụma Aịzaya dere. O meghere ya chọta ebe e dere sị, “Mmụọ nke anyị dị nʼahụ m, nʼihi na o teela m mmanụ ka m kwusaa oziọma nye ndị ogbenye. O zitela m ikwupụta inwere onwe nye ndị mkpọrọ, ya na ịhụ ụzọ nye ndị kpuru ìsì, ime ka ndị a na-emegbu emegbu nwere onwe ha. Ikwupụta afọ anyị ga-eme amara.” O mechiri akwụkwọ ahụ nyeghachi ya onye ahụ na-eje ozi, nọdụ ala. Ndị mmadụ niile nọ nʼụlọ nzukọ ahụ legidere ya nnọọ anya. Ma o bidoro ịgwa ha sị, “Taa ka ihe ndị a e dere nʼakwụkwọ nsọ a mezuru na ntị unu.” Mmadụ niile kwuru okwu ọma banyere ya nʼihi okwu amara niile si ya nʼọnụ pụta nke mere na ha jụrịtara onwe ha sị, “Onye a, ọ bụghị nwa nwoke ?” Ọ sịrị ha, “Nʼezie, amaara m na unu ga-atụrụ m ilu a: ‘Dibịa, gwọọ onwe gị!’ m, ‘Ihe ndị ahụ niile anyị nụrụ ị na-eme na ọm mee ha nʼebe a bụ obodo gị.’ ” Ọ gara nʼihu sị, “Ma ị gwa unu eziokwu, o nweghị onye amụma ọbụla a na-anabata nke ọma nʼobodo a mụrụ ya. Nʼezie, chetakwanụ na e nwere ọtụtụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ nʼoge Ịlaịja onye amụma. Nʼoge oke ụnwụ dara nʼala ahụ dum, mgbe e mechiri eluigwe na mmiri ezoghị nʼala afọ atọ na ọnwa isii. Ma e zigaghị Ịlaịja ka o jekwuru onye ọbụla nʼime ha karịakwa nwanyị di ya nwụrụ anwụ nʼobodo nʼakụkụ Saịdọn. Nʼoge Ịlaisha onye amụma, e nwere ọtụtụ ndị ekpenta nʼala , ma o nweghị onye e mere ka ọ dị ọcha nʼetiti ha karịakwa onye .” Mgbe ndị nọ nʼụlọ ekpere ahụ nụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha biliri, kwapụ ya site nʼobodo ahụ, dọkpụrụ ya gaa nʼelu ugwu nke e wukwasịrị obodo ahụ ka ha nwee ike tụpụ ya site nʼugwu ahụ. Ma o sitere nʼetiti igwe mmadụ ahụ pụọ, gawara onwe ya. O sitere nʼebe ahụ gaa ọm, obodo dịkwa na . Nʼụbọchị izuike, o bidoro izi ha ihe. Ozizi ya juru ha anya, nʼihi na okwu ya nwere ikike. Otu nwoke nọ nʼime ụlọ ekpere ahụ, onye mmụọ na-adịghị ọcha bi nʼime ya. O tiri mkpu nʼoke olu, “Hapụ anyị! Gịnị ka ị na-achọ nʼebe anyị nọ, gị, Jisọs onye ? Ị bịara ka ị laa anyị nʼiyi? Ama m onye ị bụ, Onye Nsọ nke !” Jisọs baara ya mba sị, “Nọrọ jii! Si nʼime ya pụta.” ahụ mmụọ ọjọọ ahụ tụdara ya nʼala nʼihu ha niile, o sikwa nʼime ya pụọ ma o merụghị ya ahụ. Ihe ndị a juru ha niile anya, ha jụrịtara ibe ha sị, “Gịnị bụ ozizi nke a? O ji ịchị isi na ike na-enye mmụọ na-adịghị ọcha ndị a iwu, ha na-apụtakwa!” Akụkọ banyere ya gbasara jeruo obodo niile dị ebe ahụ gburugburu. Mgbe ọ hapụrụ ụlọ ekpere ahụ gaa nʼụlọ ọn. Nne nwunye ọn nwere ahụ ọkụ, ha rịọrọ ya ka o nyere ya aka. O guzoro nʼihu ya, ma baara ahụ ọkụ ahụ mba, ọ hapụrụ ya nʼotu ntabi anya ahụ. O bilikwara lee ha ọbịa. Mgbe anyanwụ na-ada, ọtụtụ ndị nwere ndị na-arịa ọrịa dị iche iche kpọọrọ ha bịakwute ọs. O bikwasịrị ha niile aka nʼotu nʼotu, gwọọ ha. Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nʼime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara .” Ma ọ baara ha mba, o kweghị ka ha kwuo okwu, nʼihi na ha matara na ọ bụ ịst. Mgbe chi bọrọ, ọ pụrụ gaa ebe naanị ya nọ. Ndị mmadụ nọ na-achọgharị ya; mgbe ha bịaruru ebe ọ nọ, ha gbalịsịrị ike ime ka ọ ghara ịhapụ ha. Ma ọ sịrị ha, “Aghaghị m ikwusa oziọma alaeze nʼobodo ndị ọzọ, nʼihi na ọ bụ nʼihi ya ka e zitere m.” Ọ gara nʼihu na-ekwusa oziọma nʼụlọ ekpere niile dị na ịa.

Every verse in Luke 4

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00