Matthew 26:40
“Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị Pita, “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa?”
Matthew 26:40 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 40 of 75 in Matthew chapter 26 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 thread runs through this chapter
Matthew 26 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ọs kwusiri okwu ndị a, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Dị ka unu maara nke ọma, Mmemme ga-amalite mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼoge ahụ, a ga-ararakwa nke ụ nye ka a kpọgide ya nʼobe.” Nʼoge ahụ, ndịisi nchụaja, na ndị okenye zukọtara nʼụlọeze otu onyeisi nchụaja a na-akpọ Kaịfas. Ha gbara izu ịchọpụta ụzọ ha ga-esi jide ọs na nzuzo gbuo ya. Ha kwekọrịta sị, “Ọ gaghị abụ nʼoge mmemme ka ọgbaaghara hapụ ịdị nʼetiti ndị mmadụ.” Mgbe ọs nọ na , nʼụlọ ọn onye ekpenta, otu nwanyị bu karama alabasta nke mmanụ otite isi ụtọ dị oke ọnụahịa dị nʼime ya, bịakwutere ya, nke ọ wụsara ya nʼisi dị ka ọ na-anọdụ ala nʼeri nri. Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ nke a, iwe were ha nke ukwuu. Ha sịrị, “Olee ụdị ịla nʼiyi dị nke a! A gaara erepụta mmanụ a ego dị ukwuu were ego e retara ya nyere ndị ogbenye aka.” Ebe ọs matara ihe ha na-atamu nʼobi ha, ọ sịrị ha, “Gịnị mere unu ji esogbu nwanyị a? O merela m ihe dị mma. Unu na ndị ogbenye ga-anọ oge niile, ma ọ bụghị mụ na unu ga-anọ mgbe niile. Nʼihi na site nʼịwụ m mmanụ otite a nʼahụ, o doziela m maka olili. Nʼezie, ana m agwa unu, nʼebe ọbụla ezisara oziọma a nʼụwa niile, a ga na-echeta nwanyị a nʼihi ihe ọma a o meere m.” Mgbe ahụ otu nʼime mmadụ iri na abụọ na-eso ụzọ ya, onye aha ya bụ ịọt, jekwuuru ndịisi nchụaja. Ọ jụrụ ha sị, “Gịnị ka unu ga-enye m ma m rara ya nye nʼaka unu?” Ha kwụrụ ya iri mkpụrụ ọlaọcha atọ. Site nʼoge ahụ na-aga, ọ chọrọ ohere ịrara ya nye nʼaka ha. Nʼụbọchị mbụ nke mmemme achịcha na-ekoghị eko, ndị na-eso ụzọ ọs bịakwutere ya jụọ ya sị, “Ebee ka ị chọrọ ka anyị gaa kwadoro gị ihe gị maka oriri ?” Ọ zara ha sị, “Jekwurunụ otu nwoke nʼime obodo sị ya, Onye ozizi sị, ‘Oge m abịala nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eri oriri nʼụlọ gị.’ ” Ndị na-eso ụzọ ya mere dị ka ọs gwara ha, doziekwa oriri ahụ nʼebe ahụ. Nʼuhuruchi ụbọchị ahụ, ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọdụrụ ala nʼoche nri ahụ. Mgbe ha na-eri nri, o kwuru sị, “Nʼezie ana m agwa unu, na otu onye nʼime unu ga-arara m nye.” Ha nwere oke mwute, ma malite ịjụ ya nʼotu nʼotu sị, “Onyenwe anyị, ọ bụ m?” Ma ọ zara ha sị, “Ọ bụ onye ahụ mụ na ya na-amanyekọta aka nʼotu efere ga-arara m nye. Lee nke ụ ga-ala dị ka e si buo ya nʼamụma. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ onye a ga-esite nʼaka ya rara nke ụ nye. Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.” Judas, onye ahụ raara ya nye jụrụ ya sị, “Onye ozizi ọ bụ m?” Ọ zara sị, “Gị onwe gị ekwuola ya.” Mgbe ha nọkwa na-eri nri, Jisọs were ogbe achịcha ahụ, mgbe o nyechara ekele, ọ nyawara ya nye ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Naranụ nke a rie, nʼihi na nke a bụ anụ ahụ m.” Mgbe ahụ kwa, o burukwara iko mmanya, ma mgbe o nyechara ekele, o bunyere ya ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Unu niile ṅụọnụ site nʼiko a. Nʼihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya maka ọtụtụ mgbaghara mmehie. Ana m agwa unu, na-agaghị m aṅụ mmanya sitere na mkpụrụ vaịnị ọzọ, tutu ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ ya nʼụzọ dị iche nʼalaeze m.” Mgbe ha bụsịrị abụ, ha pụrụ gaa nʼ . Mgbe ahụ ọs gwara ha sị, “Nʼabalị taa, unu niile ga-agbahapụ naanị m. Nʼihi na e dere ya, sị: “ ‘Aga m etigbu onye ọzụzụ atụrụ, atụrụ nke igwe atụrụ ahụ ga-agbasasịkwa.’ Ma mgbe e mere ka m si nʼọnwụ bilite, aga m ebu unu ụzọ gaa .” Pita sịrị, “Ọ bụrụ na mmadụ niile agbahapụ gị gbalaga, agaghị m ahapụ gị.” Jisọs sịrị, “Nʼezie agwa m gị, nʼabalị taa, tupu oke ọkụkụ akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugboro atọ.” Ma kwuru sị, “Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ka m soro gị nwụọ, agaghị m agọnarị gị.” Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ndị ahụ niile na-eso ụzọ ya kwuru. Mgbe ọs bịara nʼogige ahụ a na-akpọ , ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya sị ha, “Nọdụnụ nʼebe a ka m gaa nʼihu nke nta kpee ekpere.” Ọ kpọọrọ tinyere onwe ya, na ụmụ abụọ. Ọ malitere inwe obi mwute nʼime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri. Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụobi m nke ukwuu ruo nʼọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nʼebe a soro m na-eche nche.” Ọ gara nʼihu nke nta daa, kpuo ihu ya nʼala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị ka e mee uche m, kama ka e mee uche gị.” Ya mere, ọ bịakwutere ndị na-eso ụzọ ya, hụ ha ka ha na-arahụ ụra. Ọ sịrị , “Ọ bụ na unu enweghị ike i soro m chee nche, ọ bụladị otu awa? Na-echenụ nche, na-ekpekwa ekpere, ka unu ghara ịba nʼọnwụnwa. Nʼihi na mmụọ dị na njikere ma anụ ahụ adịghị ike.” Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya, ka e mee uche gị.” Ọ lọghachikwara ọzọ hụkwa ka ha na-arahụ ụra, nʼihi na anya ha dị arọ. Ọ hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ. Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ sịrị ha, “Unu ka nọ na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Lee, oge awa ahụ abịala, a rarala nke ụ nye nʼaka ndị mmehie. Bilienụ ka anyị gawa. Lee, onye ahụ na-arara m nye na-abịa!” Mgbe ọ nọ na-ekwu okwu a, Judas, otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ bịaruru, ya na ọtụtụ igwe mmadụ so. Ụfọdụ ji mma agha ha, ndị ọzọ ji osisi. Ọ bụ ndịisi nchụaja na ndị okenye ndị zitere ha. Ma onye ahụ na-arara ya nye, nyere ha ihe ịrịbama, sị, “Onye ahụ m ga-esutu ọnụ bụ nwoke ahụ, jidesienụ ya aka ike!” Ngwangwa o jekwuuru ọs sị ya, “Ekele, Onye ozizi!” ma sutukwa ya ọnụ. Jisọs gwara ya sị, “Enyi m, mee ihe ị bịara ime ngwangwa.” ahụ, ndị ikom ahụ bịara nso jide ọs, sekpụrụ ya nʼike. Otu onye nʼime ndị ha na ọs nọ, setịrị aka ya, mịpụta mma agha ya, gbuo ohu onyeisi nchụaja, gbupụ ntị ya. Ma ọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nʼọbọ ya, nʼihi na mmadụ ọbụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya ga-anwụ site na mma. I cheghị na m pụrụ ịrịọ m ka o zitere m ihe karịrị usuu ndị mmụọ ozi iri na abụọ nʼotu ntabi anya? Ma olee otu ihe e dere nʼakwụkwọ nsọ ga-esi mezuo, nke kwuru na ọ ghaghị ịdị otu a?” Nʼoge awa ahụ, Jisọs gwara igwe mmadụ ahụ sị, “Unu pụtara chịrị mma agha na mkpọ bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye ohi? Anọrọla m ziekwa ihe nʼụlọnsọ kwa ụbọchị, ma unu ejideghị m. Ma ihe ndị a na-eme ka ihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ mezuo.” Nʼoge ihe ndị a niile na-eme, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ ya gbalaga. Ndị jidere ọs duuru ya gaa nʼụlọ Kaịfas, onyeisi nchụaja. Ndị ozizi iwu na ndị okenye ndị zukọtara nʼebe ahụ. Pita sogidere ọs nʼazụ site nʼebe dị anya. O rutere nʼobi onyeisi nchụaja, baa nʼime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwe ike ịhụ otu ihe a ga-esi bie. Ndịisi nchụaja, na ndịisi ikpe nʼụlọikpe ahụ nọ na-achọ ama ụgha megide ọs, ka ha hụ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ma ọ dịghị nke ha chọtara, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara. Nʼikpeazụ, mmadụ abụọ pụtara kwuo sị, “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọnsọ ukwu nke , wughachikwa ya nʼụbọchị atọ. ’ ” Onyeisi nchụaja biliri ọtọ kwuo sị, “Ọ bụ na ị nweghị ihe ọbụla ị ga-aza? Gịnị bụ ama ndị a a na-agba megide gị?” Ma ọs ekwughị ihe ọbụla. Onyeisi nchụaja gwara ya sị, Eji m aha dị ndụ nye gị iwu, sị gị, “gwa anyị, ị bụ ịst, Ọkpara ?” Jisọs gwara ya sị, “Gị onwe gị kwuru ya. Ma ana m agwa unu, site ugbu a na-aga nʼihu, unu ga-ahụ nke ụ ka ọ na-anọdụ nʼaka nri nke dị ike, na-abịakwa nʼigwe ojii nke eluigwe.” Mgbe ahụ onyeisi nchụaja dọwara uwe ya, kwuo sị, “O kwuola arụ! Olee mkpa ọ dị ịchọkwa ndị akaebe? Unu nụkwara nkwulu ya? Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha zara sị ya, “O kwesiri ka ọ nwụọ!” Mgbe ahụ, ha gbụsara ya ọnụ mmiri asọ nʼihu, tiekwa ya aka. Ndị ọzọ maara ya ụra, sị ya, “Buoro anyị amụma, gị, Kraịst. Onye tiri gị ihe?” Mgbe ahụ nọdụrụ ala na mbara ezi nke obi ahụ. Otu nʼime ụmụ agbọghọ na-eje ozi bịakwutere ya, sị, “Ị bụkwanụ otu nʼime ndị na-eso ụzọ ọs onye .” Ma ọ gọrọ nʼihu ha niile sị, “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” Mgbe ọ pụrụ gaa nọdụ nʼọnụ ụzọ mbata, nwaagbọghọ ọzọ hụrụ ya, gwa ndị nọ nʼebe ahụ sị, “Nwoke a na ọs onye nọkọrọ.” Ọzọkwa, o weere ịṅụ iyi gọọ, “Amaghị m onye nwoke ahụ bụ.” Mgbe oge nta gasịrị, ndị guzo nʼebe ahụ bịakwutere sị ya, “Nʼezie, ịbụ otu nʼime ha, nʼihi na asụsụ gị agbaala gị ama.” Ọ malitere ịbụ onwe ya ọnụ, na ịṅụ iyi sị, “Amaghị m nwoke a.” ahụkwa oke ọkpa kwara akwa. Pita chetara okwu ahụ ọs kwuru sị, “Tupu oke ọkpa akwaa akwa, ị ga-agọnarị m ugbo atọ.” O si nʼebe ahụ pụọ, gaa kwaa akwa nke ukwuu.
Every verse in Matthew 26
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.