Matthew 4:8
“Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha.”
Matthew 4:8 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 8 of 25 in Matthew chapter 4 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
1 thread runs through this chapter
Matthew 4 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru ọs baa nʼọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Mgbe o busiri ọnụ iri ụbọchị anọ ehihie na abalị, agụụ gụrụ ya nke ukwuu. Mgbe ahụ onye ọnwụnwa ahụ bịakwutere ya sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara , gwa nkume ndị a ka ha ghọọ achịcha.” Ma ọs zara, “E dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ọ bụghị naanị site na achịcha ka mmadụ si adị ndụ, kama site nʼokwu niile si nʼọnụ pụta.’” Mgbe ahụ, ekwensu duuru ya baa nʼobodo nsọ ahụ, mee ka o guzo nʼebe dịkarịsịrị elu nke ụlọnsọ ukwu, sị ya, “Ọ bụrụ na ị bụ Ọkpara , site nʼebe a tụda onwe gị nʼala. Nʼihi na e dere ya nʼakwụkwọ nsọ sị, “ ‘Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ha ga-ebuli gị elu nʼaka ha ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.’” Ma ọs zara sị ya, “E deela ya nʼakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa gị na gị ọnwụnwa.’” Ọzọkwa, ekwensu kpọọrọ ya gaa nʼelu ugwu dị elu, gosi ya alaeze niile nke ụwa na ebube ha. Ọ sịrị ya, “Aga m enye gị ha niile ma ọ bụrụ na ị daa nʼala kpọọ isiala nye m.” Ma ọs sịrị ya, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu. Nʼihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘Ọ bụ naanị anyị gị ka ị ga-akpọ isiala nye, naanị ya ka ị ga-efekwa.’” Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere ya, nọnyere ya, na-ejere ya ozi. Mgbe ọs nụrụ na e tinyela Jọn nʼụlọ mkpọrọ, ọ pụrụ gaa . Emesịa, ọ hapụrụ gaa biri na ọm, bụ obodo dị nʼakụkụ osimiri . Ọ dị nso nʼoke ala ụlọn na ị. Nʼụzọ dị otu a, amụma ahụ Aịzaya buru mezuru. Amụma nke sịrị, “Ala ụlọn na ala ị, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọ, Galili nke ndị mba ọzọ, ndị nọ nʼọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị bi nʼala onyinyo ọnwụ ka ìhè nwukwasịrị.” Site nʼoge ahụ gaa nʼihu ọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, nʼihi na alaeze eluigwe dị nso.” Ma mgbe ọs na-agafe nʼakụkụ osimiri , ọ hụrụ ụmụnne abụọ, Saimọn onye a na-akpọ , na nwanne ya, ndị ọrụ ha bụ ịkụ azụ, ebe ha nọ nʼụgbọ mmiri na-akụ azụ. Ọ sịrị ha, “Bịanụ soro m. Aga m eme unu ndị ọkụ na-akụta mmadụ.” Ha hapụrụ ụgbụ azụ ha otu mgbe ahụ soro ya. Mgbe ọ gara nʼihu nke nta, ọ hụrụ ụmụnne abụọ ọzọ, Jemis nwa na Jọn nwanne ya, ebe ha na nna ha nọ nʼime ụgbọ mmiri na-ekezi ụgbụ azụ ha. Ọ kpọkwara ha, ngwangwa ha hapụrụ ụgbọ ha na nna ha soro ya. Jisọs jegharịrị nʼobodo niile nke , na-akụzi ihe nʼụlọ nzukọ niile ha, na-ekwusakwa oziọma nke alaeze ahụ. Ọ na-agwọkwa ọrịa na nrịa nrịa niile dị iche iche nʼetiti ndị ahụ. Akụkọ banyere ya gbasara jezuo akụkụ niile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị niile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha niile. Ọtụtụ mmadụ sitere na , Dekapọlịs, , Judịa na nʼofe osimiri Jọ, soro ya.
Every verse in Matthew 4
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.