Nehemiah 1:3
“Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi Jerusalem; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.””
Nehemiah 1:3 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 3 of 11 in Nehemiah chapter 1 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Nehemiah 1 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nke a bụ okwu nwa : Nʼọnwa , nke afọ ahụ mere ya iri afọ abụọ nke ọchịchị mgbe m nọ nʼụlọeze dị na , otu nwanne m nwoke aha ya bụ , na ụfọdụ ndị ọzọ sitere bịara ileta m. Ajụrụ m ha ajụjụ otu ihe si agara ndị ahụ fọdụrụ, ndị si ebe dị iche iche lọta, jụọkwa ha maka . Ha zara si: “Ndị ahụ niile lọtara nọ nʼoke nsogbu na ihere. A kụdara mgbidi ; e sukwara ọnụ ụzọ ama ya niile ọkụ.” Mgbe m nụrụ okwu ndị a, anọdụrụ m ala kwaa nnọọ akwa. Nʼezie, ajụrụ m iri ihe ọbụla ọtụtụ ụbọchị, nʼihi na eji m oge m niile kpee ekpere rịọ nke eluigwe arịrịọ, si ya: “Gị, Onyenwe anyị nke eluigwe, onye dị ukwu na onye dịkwa egwu; gị onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya nke ndị ahụ hụrụ ya nʼanya na-edebekwa iwu ya niile. Biko nụrụ arịrịọ m. Leda anya ebere gị ka ị nụrụ arịrịọ mụ bụ ohu gị na-arịọ gị ehihie na nʼabalị. Ana m ekwupụta mmehie anyị bụ ụmụ , ma nke m na ezinaụlọ nna m mere megide gị. Anyị emela ihe jọrọ njọ megide gị. Anyị edebeghị iwu gị na ụkpụrụ gị nke i nyere ohu gị . “Chetakwa ntụziaka inyere bụ ohu gị, na-asị, ‘Ọ bụrụ na unu emehie, mụ onwe m ga-achụsa unu nʼetiti mba dị iche iche. Ma ọ bụrụ na unu alaghachikwute m, debe ihe niile m nyere unu nʼiwu, a sikwa na a chụsara unu mee ka unu gbasaa ga nʼakụkụ niile nke ụwa, aga m achịkọta unu mee ka unu laghachi na bụ obodo m họpụtara nye m.’ “Anyị bụ ndị ohu gị, bụrụkwa ndị i ji aka gị dị ike zọpụta. Biko, Onyenwe anyị, nụrụ ekpere mụ bụ ohu gị, nụrụkwa ekpere ndị ohu gị niile ọ na-atọ ụtọ ịtụ egwu aha gị. Mee ka ihe gara ohu gị nke ọma taa site nʼimere ya ebere nʼihu nwoke a.” Nʼoge ahụ abụ m onye na-ebu ihe ọṅụṅụ eze.
Every verse in Nehemiah 1
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.