Numbers 14:37
“Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu Onyenwe anyị.”
Numbers 14:37 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 37 of 45 in Numbers chapter 14 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Numbers 14 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Nʼabalị ahụ, ọgbakọ niile weliri olu ha bido iti mkpu akwa. Ha kwagidere akwa a abalị niile. Ndị niile tamuru ntamu megide na Erọn. Ọgbakọ ahụ niile sị ha, “Ọ gaara aka mma ma a sị na anyị nwụrụ nʼala maọbụ nʼọzara a. Gịnị mere anyị ji akpọbata anyị nʼala a ime ka anyị daa nʼihu mma agha. Ndị nwunye anyị na ụmụ anyị ga-aghọ ndị a dọtara nʼagha. Ọ garaghị akara anyị mma ịlaghachi azụ nʼ?” Ya mere ha kwekọrịtara nʼetiti onwe ha sị, “Ka anyị họpụtaranụ onwe anyị onyendu ga-edughachi anyị azụ nʼ.” Mgbe ahụ, Mosis na Erọn dara kpuo ihu nʼala nʼihu ọgbakọ ndị niile zukọtara nʼebe ahụ. Mmadụ abụọ nʼime ndị nledo ahụ, nwa na nwa , dọwara uwe ha. Ha gwara nzukọ sị, “Ala ahụ anyị gara ledoo anya bụ ala mara mma. Ọ bụrụ na ihe banyere anyị na-atọ anyị ụtọ, ọ ga-edu anyị bata nʼala ahụ, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Unu enupukwala isi megide anyị. Unu atụkwala egwu ndị bi nʼime ala ahụ, nʼihi na anyị ga-emeri ha. Onyenwe anyị nọnyeere anyị. O wepụkwala aka nchebe ya nʼahụ ha. Unu atụla egwu ha.” Ma naanị nzaghachi ọgbakọ ndị nyere nʼihi okwu nkasiobi ndị a bụ iche uche otu ha ga-esi jiri nkume tugbuo na . Nʼoge a, ebube anyị pụtara ihe nʼụlọ nzute ahụ nye ndị niile. Onyenwe anyị gwara okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ndị a ga-anọgide na-eleda m anya? Ruo ole mgbe ka ha ga-anọ ju ikwenye na m, nʼagbanyeghị ọtụtụ ihe ịrịbama nke m mere nʼetiti ha. Aga m eji nrịa nrịa nke na-efe efe tigbuo ha. Napụ ha ihe ha nwere. Ma aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ukwuu, nke ga-adị ukwuu, dịkwa ike karịa ha.” Ma rịọrọ anyị sị ya, “Gịnị ka ndị ga-eche banyere nke a, mgbe ha ga-anụ ya? Ha maara nke ọma otu ị sịrị jiri ike gị napụta ndị a site nʼetiti ha. Ha agwakwala ndị bi nʼobodo ndị a ihe banyere ya. Ndị obodo ndị a anụla ihe banyere gị anyị, matakwa na ị nọnyeere , na gị bụ anyị na ndị na-ekwurịta okwu ihu na ihu. Ha anụkwala na ogidi igwe ojii gị anyị na-eguzo nʼelu, nʼisi anyị. Ha matakwara na ị na-edu anyị nʼime ogidi igwe ojii nʼehihie, na nʼime ogidi na-enwu ọkụ nʼabalị. Ma ugbu a, ọ bụrụ na i gbusie ndị gị a dum, mba niile nụrụla akụkọ ndị a banyere gị ga-asị, ‘Onyenwe anyị enweghị ike ịkpọbata ndị a nʼala ahụ o kwere nkwa inye ha. Ọ bụ ya mere o ji gbuo ha nʼọzara.’ “Ugbu a ka anyị gosi ike ya dị ukwuu, dịka i si kwuo. Onyenwe anyị bụ onye na-adịghị ewe iwe ọsịịsọ, onye jupụtara nʼịhụnanya, onye na-agbaghara mmehie na nnupu isi. Ma ọ dịghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-anataghị ahụhụ, ọ na-ata ụmụ ahụhụ nʼihi mmehie nna nna ha ruo nʼọgbọ nke atọ na nke anọ. Dịka ịdị ukwuu nke ịhụnanya gị si dị; gbaghara mmehie nke ndị a mere, dịka i si agbaghara ha kemgbe ha hapụrụ ruo ugbu a.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agbagharala m ha dịka ị rịọrọ. Ma dịka m na-adị ndụ na dịka ọ bụ eziokwu na ụwa niile ga-ejupụta nʼebube anyị. Ọ dịghị otu onye nʼetiti ndị ikom niile hụrụla ebube m, na ọrụ ịrịbama niile m rụrụ nʼime , na nʼime ọzara a, ma bụrụ onye nupuru isi nye m na onye nwaara m ugboro iri ndị a, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-ahụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee nkwa inye nna nna ha. O nweghị onye ọbụla nʼime ndị a lelịrị m ga-ahụ ala ahụ anya. Ma ohu m nwoke bụ nwoke nwere mmụọ dị iche. O rubeere m isi nʼihe niile. Aga m akpọbata ya nʼala ahụ ọ banyere dịka onye nledo. Ụmụ ụmụ ya niile ga-eketa ya. Ma ugbu a, ebe ndị na-atụ ndị na ndị bi nʼime ndagwurugwu ahụ egwu, echi, unu ga-atụgharịa laghachi azụ nʼọzara ahụ; chee ụzọ gaje ahụ ihu.” Onyenwe anyị gwara na Erọn okwu sị, “Ruo ole mgbe ka ọgbakọ ọjọọ a ga-anọgide na-atamu ntamu megide m? Nʼihi na anụla m ntamu niile nke ndị a. Gwa ha si, ‘Dị ka m na-adị ndụ, ka anyị kwubiri, aga m emeso unu mmeso dịka unu kwunyere ya na ntị m. Unu niile ga-anwụpịa nʼime ọzara a! Onye ọbụla nʼime unu niile gbarala iri afọ abụọ maọbụ karịa, nke tamuru ntamu megide m. O nweghị onye ọbụla nʼime unu ga-abanye nʼala ahụ, m sitere nʼaka m welie elu ṅụọ iyi ime ka ọ bụrụ ebe obibi unu, karịa nwa na nwa . Ma ebe unu tụrụ egwu sị na ụmụ unu na-aga ibu ndị ohu nye ndị bi nʼala ahụ. Lee na aga m edubata ha nʼime ala ahụ. Ha ga-eketakwa ala ahụ unu jụrụ, nke unu ledara anya. Ma unu onwe unu, ozu unu ga-ada aghara aghara nʼọzara a. Ụmụ unu ga-abụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nʼime ọzara a iri afọ anọ, na-ata ahụhụ nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi, ruo mgbe ozu onye ikpeazụ nʼime unu ga-atọgbọrọ nʼime ọzara. Iri afọ anọ ka unu ga-ata ahụhụ nʼihi mmehie unu, matakwa ihe ọ pụtara bụ mụ iguzo megide unu, ya bụ otu afọ ga-anọchi otu ụbọchị nʼime iri ụbọchị anọ ahụ unu ji ledoo ala ahụ anya. Mụ onwe m, bụ anyị, ekwuola ya. Nke a ka m na-aghaghị ime ka ọ dakwasị ajọ nzukọ ndị a, bụ ndị gbakọrọ megide m. Ha ga-ezute ọgwụgwụ ha nʼọzara, nʼebe a ka ha ga-anwụ.’ ” Ya mere ndị ahụ zipụrụ iledo ala ahụ, ndị ahụ lọtara mee ka ọgbakọ ụmụ tamuo ntamu nʼihi akụkọ ọjọọ ha gbasara. Ndị ikom ndị ahụ e si nʼọnụ ha gbasaa akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ka e ji nrịa nrịa na-efe efe tigbuo nʼihu anyị. Nʼime ndị ikom gara ledoo ala ahụ anya, ọ bụ naanị nwa na nwa fọdụrụ ndụ. Mgbe gwara ụmụ okwu niile si nʼọnụ anyị, ha ruru ụjụ dị ilu. Nʼisi ụtụtụ echi ya, ha biliri nʼoge bulie ije ịga nʼala ugwu ugwu ahụ. Ha sịrị, “Anyị emehiela. Ugbu a anyị ejikerela ije nʼala ahụ anyị kwere anyị nkwa.” Ma zara sị ha, “Gịnị mere unu ji enupu isi nʼiwu anyị nyere? Nke a agaghị aga nke ọma. Unu arịgokwala, nʼihi na anyị anọghị nʼetiti unu. Ndị iro unu ga-emerikwa unu. Nʼihi na ndị na ndị nọ na-eche unu nʼebe ahụ! Ebe ọ bụ na unu esitela nʼebe anyị nọ wezuga onwe unu, ọ gaghị anọnyere unu, unu ga-adakwa nʼihu mma agha.” Nʼagbanyeghịkwa nke a, na ha enweghị nkwado. Ha rigooro ruo ebe kachasị elu nʼobodo ahụ dị nʼugwu, ọ bụ ezie na maọbụ igbe ọgbụgba ndụ anyị esighị nʼọmụma ụlọ ikwu ahụ pụọ. Mgbe ahụ, ndị na ndị bụ ndị bi nʼobodo ugwu ahụ, rịdatara lụso ha ọgụ. Tidaa ha nʼala ruo .
Every verse in Numbers 14
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.