Numbers 20:23

“Nʼugwu Hor, nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị ha,”

Numbers 20:23 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible

Verse 23 of 29 in Numbers chapter 20 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.

Numbers 20 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)

Ụmụ , bụ nzukọ ahụ niile rutere nʼọzara nʼọnwa nke mbụ. Ha manyere ụlọ ha na . Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka nwụrụ. E lie ya. Ma mmiri ọṅụṅụ adịghị nye ndị nzukọ ahụ. Ya mere na ha gbakọtara imegide na Erọn. Ha sesịrị okwu sị, “Ọ gaara akara anyị mma ma a sị na anyị nwụrụ mgbe ụmụnna anyị nwụrụ nʼihu anyị. Gịnị mere i ji kpọbata ọgbakọ nke anyị nʼime ọzara a, ime ka anyị na anụ ụlọ anyị niile nwụọ nʼebe a? Gịnị mere i ji si nʼala kpọpụta anyị, kpọbata anyị nʼebe ọjọọ a? O nweghị mkpụrụ ọghịgha maọbụ fiig, enweghị mkpụrụ vaịnị maọbụ mkpụrụ pomegranet. Ọ dịghị mmiri dị nke ha ga-aṅụ.” Mosis na Erọn si nʼebe ọgbakọ ahụ nọ tụgharịa gaa nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, daa kpụọ ihu ha nʼala. E mee ka ha hụ ebube anyị anya. Onyenwe anyị gwara sị, “Were mkpara ahụ, gị na nwanne gị Erọn kpọkọta nzukọ niile. Gwa nkume ahụ okwu nʼihu ha, ọ ga-asọpụta mmiri ya. Unu ga-eme ka mmiri si na nkume ahụ sọpụta nye ọgbakọ ahụ, ka ha na igwe anụ ụlọ ha, ṅụọ mmiri.” Ya mere sitere nʼihu anyị weere mkpara ahụ dịka iwu anyị nyere ya si dị. Emesịa, Mosis na Erọn kpọkọtara ụmụ niile nʼihu nkume ahụ. Mgbe ha bịaruru nso, Mosis gwara ha okwu sị ha, “Geenụ ntị unu ndị nnupu isi! Ọ bụ site na nkume a ka anyị ga-enye unu mmiri?” Mgbe ahụ weliri aka ya elu jiri mkpara ahụ tie nkume ahụ ugboro abụọ. Mmiri sitere na ya sọpụta. Ọgbakọ niile na igwe anụ ụlọ ha ṅụkwara mmiri. Ma anyị gwara na Erọn okwu sị, “Ebe ọ bụ na unu jụrụ ikwenye nʼokwu m, jụkwa ido m nsọ nʼihu ndị niile, unu agaghị edubata ọgbakọ ndị a nʼala ahụ m na-aga inye ha.” A kpọrọ ebe ahụ mmiri , nʼihi na ọ bụ nʼebe ahụ ka wesoro anyị iwe. O gosikwara ha ịdị nsọ ya. Mosis sitere nʼọzara , zipụ ndị ozi ka ha gakwuru eze Edọm, sị ya, “Otu a ka nwanne gị bụ na-ekwu: Ị nụla akụkọ ihe nhụju anya niile dakwasịrị anyị. Nna anyị gara biri nʼala . Anyị biri nʼebe ahụ ọtụtụ afọ. Ndị mekpara anyị na nna nna anyị ha ahụ. Ma mgbe anyị tikuru anyị mkpu akwa, ọ nụrụ akwa anyị, zitere anyị mmụọ ozi ya, onye dupụtara anyị site nʼala . “Ugbu a, anyị nọ na obodo dị nso nʼoke ala gị. Biko kwere ka anyị si nʼala gị gafee. Anyị ga-akpachara anya hụ na anyị esiteghị nʼubi ihe ọkụkụ gị maọbụ nʼubi vaịnị gị gafee. Anyị agaghị aṅụ mmiri ọbụla site nʼolulu mmiri gị. Anyị ga-anọgide naanị nʼokporoụzọ eze. Anyị agaghị ahapụ ya, chee ihu akụkụ aka nri maọbụ aka ekpe, tutu ruo mgbe anyị gafechara oke ala gị.” Ma eze Edọm zara sị, “Unu amanyela ụkwụ; ọ bụrụ na unu anwaa anwa bata nʼala m, aga m eji ndị agha m zute unu.” Ma ndị zara ozi o ziri sị ya, “Ọ bụ naanị nʼokporoụzọ ka anyị ga-esi gafee. Ọ bụrụ na anyị maọbụ anụ ụlọ anyị a ṅụọ mmiri dị nʼala gị, anyị ga-akwụ ọnụahịa ya. Naanị mkpa anyị bụ ịgafe. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị chọrọ.” Ma eze Edọm aṅaghị ntị, ọ gwaghere ha ọnụ sị, “Unu agaghị esite nʼala gabiga.” Edọm chịkọtara ọtụtụ ndị agha dị ike duru ha pụọ ịga izute ha. Ebe ọ bụ na ndị Edọm ekweghị ka ndị si nʼoke ala ha gafee, ndị tụgharịrị azụ hapụ isi ụzọ ahụ. Ọgbakọ niile sitere na bulie ije gagide rute nʼugwu . Nʼugwu , nʼoke ala Edọm, Onyenwe anyị gwara na Erọn okwu sị ha, “Oge eruola mgbe Erọn ga-anwụ. Ọ gaghị abanye nʼala ahụ m nyere ụmụ , nʼihi na unu abụọ nupuru isi nʼiwu m na mmiri . Ugbu a, kpọrọ Erọn na nwa ya nwoke , duru ha gaa nʼugwu . Nʼebe ahụ ka ị ga-eyipụ Erọn uwe onye nchụaja o yi, yikwasị ha nwa ya nwoke. Ọ bụkwa nʼebe ahụ ka Erọn ga-anọ nwụọ.” Ya mere mere dịka anyị nyere ya iwu. Ha atọ rigoro nʼugwu mgbe nzukọ niile nọ na-ele ha anya. Mgbe ha ruru nʼelu ugwu ahụ, Mosis yipụrụ Erọn uwe onye nchụaja ya yikwasị ha nwa ya nwoke . Erọn nọkwa nʼebe ahụ, nʼelu ugwu ahụ nwụọ. Emesịa, Mosis na tụgharịrị site nʼugwu ahụ lọghachi. Mgbe ọgbakọ nụrụ ihe banyere ọnwụ Erọn ha ruru ụjụ nʼihi ya iri ụbọchị atọ.

Every verse in Numbers 20

Chapter navigation

Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.

0:000:00