Numbers 27:19
“Mee ka o guzo nʼihu Elieza onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha.”
Numbers 27:19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 19 of 23 in Numbers chapter 27 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Numbers 27 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Ụmụ ndị inyom nwa , nwa , nwa , nwa bụ ndị si nʼagbụrụ nwa . Aha ndị inyom ndị a bụ: Mahla, Noa, Hogla, Milka na Tịaza. Ha bịara, nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute, guzo nʼihu , na onye nchụaja, na ndị ndu niile na ọgbakọ niile kwuo sị, “Nna anyị nwụrụ nʼọzara ma ọ bụghị otu nʼime ndị sonyere , bụ ndị ahụ zukọtara megide anyị. Ọ nwụrụ ọnwụ nʼihi mmehie nke ya. Ma otu ọ dị, ọ mụtaghị nwoke. Gịnị ga-eme a ga-eji hichapụ aha nna anyị site nʼagbụrụ ya nʼihi na ọ mụtaghị nwoke? Ọ bụ uche anyị na e kwesiri ikenye anyị oke nʼoge a na-enye ụmụnne nna anyị oke.” Ya mere, Mosis butere mkpa ha nʼihu anyị. Ma anyị zaghachiri sị ya, “Ihe ụmụ na-ekwu ziri ezi. Ị ghaghị ikenye ha oke nʼetiti ụmụnne nna ha, ma nyefeekwa ha oke ruru nna ha. “Gwa ndị sị ha, ‘Ọ bụrụ na nwoke ọbụla anwụọ na-amụtaghị nwoke, oke niile ruru ya ga-alara nwa ya nwanyị. Ma ọ bụrụ na ọ mụtaghị nwa nwanyị, oke ruru ya ga-alara ụmụnne ya ndị nwoke. A sịkwa na o nweghị ụmụnne ndị nwoke, mgbe ahụ oke ya ga-alara ụmụnne nna ya ndị nwoke. Ọ bụrụkwa na o nweghị ndị nwoke bụ ụmụnne nna ya, mgbe ahụ ihe nketa ya ga-alara onye dịkarịrị ya nso nʼikwu ya, ka ọ bụrụ nke ya. Nke a bụ iwu dịrị ndị niile dịka anyị si nye ya nʼiwu.’ ” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara okwu sị ya: “Gaa rigoro nʼugwu site nʼebe ahụ lefee anya nʼofe mmiri Jọ leruo ala ahụ nke m nyere ụmụ anya. Mgbe i lechasịrị ya, ị ga-anwụ dịka nwanne gị Erọn nwụrụ. Nʼihi na unu nupuru isi nye okwu m nʼọzara , mgbe ọgbakọ ụmụ sesịrị m okwu. Unu abụọ nupuru isi nʼiwu m ido m nsọ nʼihu ha.” (Ndị a bụ mmiri , nke dị nʼọzara .) Mosis zara anyị sị ya, “Ka anyị, Chineke nwe mmụọ nke mmadụ niile, họpụta onyendu ga-elekọta ọgbakọ a. Onye ga na-apụ na-abatakwa nʼihu ha, onye ga na-edu ha pụọ, duru ha batakwa, ka ndị anyị ghara ịdị ka atụrụ na-enweghị onye ọzụzụ.” Ya mere, Onyenwe anyị sịrị , “Kpọrọ , nwa , onye nwere mmụọ nʼime ya, bikwasị ya aka gị. Mee ka o guzo nʼihu onye nchụaja, nakwa nʼihu ọgbakọ niile, nyefee ya ọrụ nke ịbụ onyendu nʼihu ha. Nyekwa ha ụfọdụ ikike gị, ka nzukọ niile nke ụmụ nwee ike rubere ya isi. Ma ya onwe ya ga-eguzo nʼihu onye nchụaja, onye ga-ajụrụ ya ase site na mkpebi nʼihu anyị. Ọ bụ site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-apụ, site nʼokwu ọnụ ya ka ha ga-ana abata. Ma ya onwe ya, ma ndị niile, tinyekwara nzukọ niile.” Ya mere, Mosis mere dịka anyị nyere ya iwu. O duuru mee ka o guzo nʼihu onye nchụaja na ọgbakọ niile. Mosis bikwasịrị aka ya abụọ nʼisi , rara ya nyefee maka ije ozi ahụ niile dịka anyị nyere nʼiwu.
Every verse in Numbers 27
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.