Numbers 32:19
“Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọdan nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan.””
Numbers 32:19 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible
Verse 19 of 42 in Numbers chapter 32 — Biblica® Open Igbo Contemporary Bible. Read it in context below, with maps, timelines and thematic connections beside the text.
Numbers 32 — full chapter (Biblica® Open Igbo Contemporary Bible)
Mgbe ndị rutere ala na , ndị ebo na ndị nwere ọtụtụ igwe ehi, na igwe ewu na atụrụ chọpụtara na ala ahụ dị mma nke ukwuu maka ịzụ anụ ụlọ. Ya mere, ha bịakwutere na onye nchụaja, na ndị ndu nzukọ , sị ha, “Ala ndị a: Atarọt, Dibọn, Jeza, Nimra, Heshbọn, Eleale, Sebam, Nebo, na , bụ ala nke anyị meriri nʼagha nʼihu nzukọ , dị mma maka ịzụ anụ ụlọ. Anyị onwe anyị kwa nwere igwe ewu na atụrụ. Ọ bụrụ na anyị achọtala amara nʼihu unu, biko, kwerenụ ka akụkụ ala a bụrụ ihe nketa nke anyị bụ ohu unu. Unu emekwala ka anyị soro ndị gafee nʼakụkụ nke ọzọ nke osimiri Jọ.” Mosis jụrụ ndị na ajụjụ sị, “Unu na-ekwu na unu chọrọ ịnọ nʼebe a mgbe ụmụnna unu ndị ikom niile ga-agafe osimiri Jọ ịlụ agha niile ahụ dị na-eche ha? Ọ bụ nʼihi gịnị ka unu ji eme ka ndị daa mba ghara ịgafe banye nʼala ahụ anyị nyerela ha? Otu a ka nna unu ha mere mgbe m si zipụ ha inyocha ala ahụ. Mgbe ha letasịrị ala ahụ si na ọl lọghachi, ha mere ka obi ndị niile daa mba ịbanye nʼala ahụ anyị nyere ha. Nʼihi nke a anyị were iwe dị ọkụ megide ha nʼụbọchị ahụ. Ọ ṅụrụ iyi kwuo sị, ‘Nʼihi na unu jụrụ iji obi unu niile gbasoo m, o nweghị onye ọbụla nʼime ndị ahụ o si nʼala kpọpụta, ndị gbara iri afọ abụọ rigoo, ga-ahụ ala ahụ m kwere na Aịzik na ọb nkwa inye ha.’ Naanị ndị ọṅụṅụ iyi a na-emegideghị bụ , nwa onye , na nwa , nʼihi na ha jiri obi ha niile sogide anyị. Iwe anyị dịịrị ọkụ megide , o mere ka ha wagharịa nʼọzara iri afọ anọ, tutu ruo mgbe ọgbọ ahụ niile nke mere ihe ọjọọ nʼanya ya nwụchara. “Ma lee unu ugbu a, agbụrụ ndị mmehie, ọ bụkwa otu ihe ahụ ka unu na-eme! Unu na-achọ ime ka iwe dị ukwuu wee anyị megide ndị . Ọ bụrụ na unu ajụ iso anyị ugbu a, Onyenwe anyị ga-emekwa ka ndị nọgide nʼọzara. Mbibi na ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha ga-abụkwa nke unu ji aka unu kpatara ha.” Ma ha zara sị ya, “Ọ gaghị adị otu a! Anyị ga-ewuru anụ ụlọ anyị ụlọ, tinye igwe ewu na atụrụ anyị nʼime ha. Anyị ga-ewukwara ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị obodo ebe ha ga-anọ. Ma anyị onwe anyị ga-eburu ngwa agha anyị, buru ndị niile ọzọ ụzọ gaa nʼihu ịlụ ọgụ, tutu anyị edubata ha nʼala nke ha ga-eketa. Ma ndị nwunye anyị na ụmụntakịrị anyị ga-anọ nʼobodo e wusiri ike, ikpuchite ezinaụlọ anyị niile site nʼaka ndị iro bi anyị gburugburu. Anyị agaghị alọta nʼụlọ anyị tutu onye ọbụla enweta ihe nketa nke ya. Anyị achọghị ihe nketa, nʼofe Jọ nke ọzọ, nʼihi na anyị ewerela oke nke anyị nʼebe a, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọ.” Mgbe ahụ, Mosis zara sị ha, “Ọ dị mma, ọ bụrụ na unu ga-eme dịka unu kwuru, jikere onwe unu, nʼihu anyị, ibu agha. Ọ bụrụ na ndị agha unu ga-eso gafee nʼofe ọzọ nke osimiri Jọ, soro ndị ọzọ buo agha tutu ruo mgbe anyị chụpụchara ndị iro ya niile, mgbe ahụ, e merichaa mba ndị ahụ niile nʼihu anyị, unu nwere ike ịlọghachi nʼebe a, bụrụ ndị ikpe na-amaghị nʼebe anyị na ndị nọ. Ala a dị nʼọwụwa anyanwụ, ga-abụ ihe nketa unu nwere site nʼaka anyị. “Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ime dịka unu kwuru, mgbe ahụ, ọ bụ anyị ka unu na-emehie megide. Matakwanụ na unu ga-emesịa nata ụgwọ ọrụ mmehie unu. Wuonụ obodo ebe ndị inyom na ụmụ unu ga-ebi, wuokwanụ ụlọ anụ maka igwe ewu na atụrụ unu, ma mezuokwanụ ihe niile unu kweere na nkwa.” Ndị ebo na sịrị , “Anyị bụ ndị ohu gị ga-eme dịka onyenwe anyị nyere nʼiwu. Ụmụ anyị niile, na ndị inyom anyị niile, na igwe ewu na atụrụ anyị, na ehi anyị niile, ga-anọ nʼebe a, nʼobodo ndị a anyị wuru nʼala . Ma anyị, ndị ohu gị, ndị niile tozuru ije agha, ga-agafe osimiri Jọ ibu agha nʼihu anyị, dịka onyenwe anyị si kwuo.” Mgbe ahụ, Mosis nyere , bụ onye nchụaja, na nwa , na ndịisi ezinaụlọ nke ebo niile iwu banyere ha, Ọ sịrị ha, “Ọ bụrụ na ndị ebo na , onye ọbụla nke jikere ịga agha, ga-eso unu gafee Jọ nʼihu anyị, mgbe ahụ, oge unu lụgburu ndị ala ahụ niile, unu aghaghị inye ha ala dịka ihe nketa ha. Ma ọ bụrụ na ha ajụ iso unu, ha ga-eso ndị ọzọ keta oke nʼala .” Ndị ebo na zara sị, “Ihe ọbụla anyị nyere nʼiwu ka anyị ga-eme. Anyị ga-ejikere soro anyị jee agha nʼala . Ma ihe nketa anyị ga-adị nʼebe a, nʼakụkụ Jọ.” Mosis nyere ndị ebo , na , na ọkara nwa , alaeze niile Saịhọn eze Amọrị nakwa alaeze niile nke Ọg, eze ndị na-achị. O nyere ha ala ahụ niile, na obodo niile dị nʼala ahụ gburugburu. Ndị ebo wugharịrị ma wusiekwa obodo ndị a, Dibọn, Atarọt, Aroea Atrọt-, Jeza, Jogbeha, Bet- na - bụ obodo e wusiri ike, wukwaara igwe ewu na atụrụ ha ụlọ anụ nʼime ya. Ma ndị ebo wugharịrị obodo ndị a: obodo ọn, Eleale, Kiriatem, Nebo na - (ma a gbanwere aha ha) na . Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ. Ndị agbụrụ , nwa gara nʼobodo lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. Ya mere, Mosis were obodo nye , ụmụ ka ha biri nʼebe ahụ. Jia, onye sikwa nʼebo gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha ọt Jaịa. Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo , na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
Every verse in Numbers 32
Chapter navigation
Biblica® Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a nke dịrị onye ọbụla ịgụ / Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Used with permission. All rights reserved worldwide. Licensed under CC BY-SA 4.0.